You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.
Asọmpi Uefa Champịọns atabirila ọkụ
Otu egwuregwu ndị gbapụtara ihe na mba Yurope na-ejikere maka asọmpi agba kwọta faịnalụ nke Uefa Champịọns.
Ndị otu ga-amalite asọmpị nke taa bụ Juventus ga-ele Real Madrid ọbịa ma ọfọdụ nkeji iri na ise ka ọ kụọ elekere asatọ nke abalị a.
N'otu aka ahụ Sevilla na Bayern Munich ga-ezute ibe ha na mba Spenị.
Oge gara aga mgbe ndị Juventus zutere Real Madrid bụ n'agba nke ikpeazụ n'afọ 2017.
Madrid jiri ọkpụ anọ asatara otu merie Juventus, iji mabute iko Uefa Champịọns.
A na-atụ anya na Juventus ga-akwụ ndị Real Madrid ụgwọ ihe emere ha n'oge gara aga.
Ndị a na-atụ anya ga-eme nkeọma n'asọmpị taa gunyere Cristiano Ronaldo, Karim Benzema.
Ndị ọzọ gunyere Gonzalo Higuain, Paulo Dybala, Robert Lewandoski n'akwa Wissam Ben yedder.