You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.
Naịjirịa na Serbia: Lee nke ga-eme n'asọmpị nke taa
Naịjirịa na Serbia ga-aso mpi enyi na enyi taa n'ama egwuregwu Hyde Park na London.
Nke a bụ mbụ ndị otu egwuregwu bọọlụ Naịjirịa bụ Super Eagles na ndị Serbia ga-ezuko n'ama egwuregwu, mana Naịjirịa na Mba Yugoslavia gbara bọọlụ na nkwado iko mbaụwa nke 1998.
Ọbu n'ime Australia ka-esi kewapụta Serbia.
Ndị Yugoslavia nyere Eagles ọkpụ goolu atọ na-asataghị otu mgbe ahụ, mana onye onụ na-eru n'okwu banyere egwuregwu bụ Emeka Offor gwara BBC Igbo na Eagles nke taa abụghị nke mgbe ahụ.
Maazi Offor sị na ndị otu Super Eagles nke taa zuru ka-eme ka ha na-ejikere nkwado iko mbaụwa.
Akụkọ ga-amasị gị:
"Moroko ka gbara Serbia otu ọkpụ goolu ha na-asataghị n'izuụka gara aga. Mana, Moroko nọ n'egwu ugbua," Offor kwuru.
Ọ gakwara n'ihu sị na ya na-ele anya na ike otu (team) abụọ a ga-abu nhatanha n'egwuregwu a.
"Naịjirịa agbaghị ọfụma n'egwuregwu ha na Poland, mana ha ji penariti merie. Serbia akwụsịghị ike n'ọgbọ ugbua, ya mere m ga-eji kwuo na Naịjirịa ga-enwe mmeri n'asọmpi a.
"Serbia agbasịghị ike ka ndị Naịjirịa," Offor kwuru.
Ndị aga-ele anya
Nemanja Matic bụ onye egwu Manchester United, bụ onye egwu Serbia ama ama.
Victor Moses bụkwa onye aha ya na-ada ụda na Naịjirịa.
Asọmpi a ga-ebido n'elekere asatọ nke taa.
Ihe ọzo ị na-amaghị
Aha otu egwuregwu bọolụ Serbia bụ 'Orlovi' nke pụtara 'Eagles' na Bekee nakwa ugo n'Igbo. Ya bụ na otu egwuregwu abụọ a na-aza otu aha.