Dani Carvajal: Onweghi ọgwụ ga egbochi Neymar

Neymar siri otu bọọlụ Barcelona gawa PSG

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto, Neymar siri otu bọọlụ Barcelona gawa PSG

Dịka a na-akwado igba asọmpi Eufa Champions nke agba iri na isii n'ime izuka a, ebe ndị Real Madrid ga-ezute ndị Paris Saint-Germain.

Onye na-agbara Madrid bọọlụ bụ Dani Carvajal kwuru na onweghi "ọgwụ" nwereike igbochi Neymar, dịka ọ na-atụ anya ka Neymar laa ezụmike n'otu ụbọchị.

Neymar dịka ihe iyi egwu nye ndị Madrid dịka ha na-aga izuta ndị PSG n'asọmpi ụkwụ nke mbụ.

Carvajal, onye na-agaghị agba bọọlụ nke mbụ a si; "Mgbe gị na Neymar na-amaka bọọlụ, o nweghi ụdị ọgwụ ọbụla pụrụ igbochi ya emela nke ọma."

Ọ sikwa ka ndị Madrid "Nwe olileanya ka ọ [Neymar] ghara ị nọ n'ụbọchị ọma ya"

O kwuru na amabeghi onye ga-eme nke ọma n'asọmpi ahụ ga-adị n'etiti ndị otu abụọ ndị a.