Zookeeper's death: 'Ọ bụ ka ọ gara ịzọ ogbo ya nwaanyị ka agụ dọgburu ya'

Agụ na Olabode Olawuyi

Ebe foto si, Getty Images/OAU

Ozi si mahadum 'Obafemi Awolowo University', Olabode Olawuyi, na-ekwu na ọ bụ ndụ ka nwoke na-elekọta anụmanụ lara mmụọ gara ịzọ oge agụ dọgburu ya.

Ọnụ na-ekwuru mahadu m ahụ gwara onye ntaakụkọ BBC Yoruba bụ Abiodun Olarewaju kọwara na ọ bụ ka Olabode Olawuyi bụ onye bụ ihe Bekee kpọrọ 'veternary technologist' gara ịzọpụta ogbo ya nwaanyị agụ ahụ wakporo ka o zutere ọnwụ ya.

O kwuru n'ezie na nke ahụ abụghị mbụ mmadụ abụọ ahụ na-enye agụ nri mana na a kpọchichaghị ụzọ ebe agụ ahụ nọ ọfụma tupu ha enyewa ya nri.

Olanrewaju kwuru na Olawuyi nwụrụ anwụ anọọla n'ọrụ ahụ afọ 10 bụ oge ọ nọkwa elekọta ụmụ anụmanụ nogige ahụ.

Ọ gbakwụnyere na ha na-eche ezinaụlọ Olabode Olawuyi maka ụbọchị ha tinyere maka akwamozu nwamadi ahụ.

Etu agụ si dọgbuo onye na-elekọta ya n'ụlọanụmanụ

Agụ adọgbuola onye nlekọta ụlọanụmanụ na mahadụm 'Obafemi Awolowo (OAU) ka ọ gara inye ya nri.

Olabode Olawuyi bu onye ịsị na ngalaba na ahu maka ụlọ ụmụanụmanụ na mahadum ahu.

Agụ na Olabode Olawuyi

Ebe foto si, OAU

Mahadum ahụ kwuru na ndị nọ ọge mkpamkpa ahụ kpara enweghị ike ịzọpụta ya maka na agụ emerụela ma kwuo na egbuola ọdụm ahụ.

N' ọkwụ ha, Olawuyi bu, “onye nlekọtya ụlọ anụmanụ, bụrụkwa onye mara maka nka n' ihe gbasara anụmanụ na-elekọta agụ nile dị na mahadum OAU kemgbe afọ itoolu.”

OAU kwuru, “Mana agụ nke nwoke gburu nwoke ahụ na-enye ha nri.”

Ọnụ na-ekwuchitara mahadum ahu bụ Abiodum Olarewaju kwuru na “anyi amaghị ịhe mere agụ ahụ jiri gbụọ ya. Ọ bụ ihe mgbawa obi na ọ nwụrụ mgbe ọ na-arụ ọrụ ya.”

Ka ndị mmadu na-ekegharị onyonyoo nwoke ahu agụ gburu na sọsal midịa, mahadum ahụ ezịgala ndị ga-ahu ezinaụlọ o metutala ozi itiaka n'obi.

Onyeiisi mahadum ahụ bụ,Abbas Akinremi kọwara ihe mere dịka ihe mgbawa obi.