Africa Eye: Etu ụbịam si akpata enweghị nchekwa na mpụ iri elu n'Afrịka
Africa Eye: Etu ụbịam si akpata enweghị nchekwa na mpụ iri elu n'Afrịka
Zinder bụ otu mpaghara dị n'ọdịda Anyanwụ mba Niger Repọblik.
Ihe e ji mara mpaghara a bụ ụbịam, ndị ntorobịa na-enweghị ọrụ, na otu nzuzo.
Na 2012, otu Unicef kwuru na otu nzuzo dị na Zinder karịrị 300 n'ọnụ ọgụgụ.
BBC African Eye banyere n'ime mpaghara a na-akpọ Kara Kara na Zinder iji hụ etu ụfọdụ ụmụ okorobịa nọbụ n'otu nzuzo si enye aka ugbua iji hụ na nsogbu otu nzuzo bịara n'isi njedebe.
Site n'enyemaka otu dị icheiche na-abụghị nke gọọmentị, ụfọdụ ndị isi otu nzuzo na-aga n'ụlọ mkpọrọ dị icheiche na-akọwara ndị nọ ebe ahụ mkpa ọ dị ịhapụ ndụ ike ma ha pụta na mkpọrọ.
Kirie akụkọ a n'uju n'onyonyo dị n'elu.










