Patoranking: Ọ bụ mmasị m ịchụta ụmụnwaanyị n'ụlọakwụkwọ sekọndịrị mere m ji bido ịgụ egwu

Aha onyonyo, Patoranking: Ọ bụ mmasị m ịchụta ụmụnwannyị n'ụlọakwụkwọ sekọndịrị mere m ji bido ịgụ egwu

Na mkparịtaụka Patoranking na BBC nwere n'afọ 2018 kọwara etu o si too na etu o si bido ịgụ egwu.

Ọ kọwara na ihe niile ọ mụtarala n'ụwa bụ n'ogbe Legọs ka o si mụta ya.

N'okwu ya, ọ sị na o bu ụzọ bido ịgba egwu garala n'ogbe mana mgbe ọ gara ụlọakwụkwọ, ọ chọpụtara na naanị etu mmadụ ga-esi achụta nwaanyị n'ụlọakwụkwọ bụ ma ọ bụrụ na onye mara etu e si agụ egwu.

Ọ sị na ọ bụrụ na ị naghị agụ egwu mgbe ahụ, mara na i soghi n'egwu. Ọ bụ etu a ka o si bido ịgụ egwu.

Patoranking

Ebe foto si, Patoranking

Patoranking tinyekwara ọnụ na ndọrọndọrọ na-adị n'etiti ndị nsonso otiegwu dị icheiche. N'uche ya, ọ sị na ụdị ndọrọndọrọ a socha n'ime ọrụ iti egwu.

Ihe kachasị mkpa bụ ma ị na-enwekwa aṅụrị? N'otu aka ahụ, ọ gwakwara BBC n'otu ihe kachasị dị ya mkpa ime n'ụwa ya bụ ịkwalite ọnọdụ ndụ mmadụ 100,000 ma ọ pekatampe.

N'uche ya, obi ga-eju ya anụrị ịhụ na ọ mere ka ndị mmadụ nwee ihe ha ga na-eri iji dị ndụ.

Onye bụ Patoranking Ezigbo aha Patoranking bụ Patrick Nnaemeka Okorie.

Ọ bụ nwafọ Onicha n'Ebonyi steeti.

Ọ gbara afọ 32.

Amụrụ Nnaemeka na Legọs, ebe ahụ ka ọ nọ too. Patoranking na-ede egwu ma na-agụkwa agụ.

Ọ gụọla ọtụtụ egwu wuru ewu n'ụwa niile ma nwetekwa ntụrụugo pụrụiche n'ịgụ egwu.

Ntụrụugo dịka Headies, MTV Africa Music Awards, AFRIMA na ndị ọzọ.

Gere ihe o kwuru n'uju n'onyonyo a dị n'akụkọ a.