Tribunal Judgement: Akụkọ ụgha megidere ndị ọkaikpe ji ikpe ntuliaka a

Tinubu/Atiku/Obi

Ebe foto si, Facebook

    • Onye dere ya, Chiagozie Nwonwu, Fauziyya Tukur, Olaronke Alo
    • Ndị mere akụkọ a, BBC Global Disinformation Team

Ụlọikpe na-ahụ maka ntuliaka ga-ekebi ikpe banyere mmeri Onyeisiala Bola Ahmed Tinubu n’ụbọchi 6 Sepụtemba, 2023.

Ndị na-ama mmeri ahụ aka bụ Labour Party (LP), Peoples Democratic Party (PDP) na Allied Peoples Movement (APM)

Ikpe a na-abịa dịka e nwere ọtụtụ akụkọ ụgha na-efegharị na soshal midia nke na-arụ ndị ọkaikpe ji ikpe ntuliaka ahụ aka.

Ngalaba BBC Disinformation lebara anya n’ụfọdụ akụkọ ụgha ndị a.

Akụkọ ụgha na ọkaikpe ji ikpe ntuliaka gbara arụkwaghịm

N’ọnwa Julaị, ọtu ọgbakọ ozi n’ịntaneti a kpọrọ Igbo Times wepụtara akụkọ kwuru na otu n’ime ndị ọkaikpe ise ji ikpe ahụ bụ ọkaikpe Boloukuoromo M. Ugo gbara arụkwaghịm maka “atụmatụ ịgbagbu ọchịchị onye kwuo uche ya”. Ọbaozi a kwuru na ọ bụ ihe si n’ọnụ ọkaikpe Ugo.

Ọbaozi a dere na ọkaikpe Ugo kwuru “Ịkwụrụ n’akụkụ gọọmentị banyere nke a bụ igbo ọchịchị onye kwuo uche ya na Naịjirịa” ma sị na obi agaghi ekwe ya ime nke ahụ. Ha kwuru na gọọmenti Naịjirịa gwara ọkaikpe Ugo ka ọ kpebie ikpe kpegara gọọmentị.

Ọkaipe Ugo agbabeghi arụkwaghịm, enweghi ihe akaebe gosiri na akụkọ ndị Igbo Times dere bụ eziokwu.

E kesara akụkọ n’akara soshal midia ha ebe ọtụtụ ndị a ma ama na soshal midia gụnyere Charles Oputa e ji Charly Boy maara kesakwara ya.

Na-agbanyeghi ụlọntaakụkọ na Naịjirịa kụchapụrụ akụkọ ahụ mana ọ ka-adị n’ọbaozi soshal midia X bụ ebe e kesara ya.

Akụkọ na Ọkaikpe ukwu Naịjirịa zutere Tinubu na Lọndọn

N’ọnwa Maachị, ụlọakwụkwọ ntaakụkọ Peoples Gazette wepụtara akụkọ na Ọkaikpe ukwu Naịjirịa mere onwe ya ka onye ngwọrọ ma zute Tinubu a họpụtara ka onyeisiala na Lọndọn iji “kpata nkata maka ikpe na-eso ntuliaka na etu ọ ga-esi emeri n’ụlọikpe”.

Akụkọ na-enyochaghị ka ọtụtụ ụlọọrụ mgbasaozi na Naịjirịa buuru ma kesaa na soshal midia. Ha ji foto ebe akwa Ọkaikpe ukwu Naịjirịa n’igwe ndị ngwọrọ ji aga ije n’ọdọụgbọelu.

Ụlọikpe Kachasị na Naịjirịa kwuru n’ezie na ọkaikpe ukwu mere njem na Lọndọn maka ahụike ya na ọ bụghị izute Tinubu. O nweghi ihe akaebe gosiri na Ariwoola zutere Tinubu na Lọndọn.

Skip X post, 1
Hapụ X ihe dị na ya?

Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

Warning: BBC amaghị maka ihe ndị si n'ọbaozi ndị ọzọ.

End of X post, 1

Akụkọ ụgha maka ụbọchị e hiwere ikpebi ikpe a

N’ọnwa Sepụtemba. ọtụtụ ndị a ma ama na soshal midia na-akwado Labour Party malitere ikesa ozi na ọ bụ n’ụbọchị 16 Sepụtemba ka a ga-ekpebi ikpe banyere ntuliaka.

Akụkọ ụgha a wuru na soshal midia ọtụtụ ụbọchi tupu ụlọikpe ewepụta ozi na ọ bụ ụbọchị 6 Sepụtemba 2023.

Ụlọikpe na-ahụ maka ntuliaka kwuru na akụkọ ahụ bụ asị ọcha ma wepụta ozi na ọ bụ n’ụbọchị 6 Sepụtemba ka a ga-ekpe ikpe ahụ.

Mgbe Chimamanda gara n'ụlọikpe

Ebe foto si, Screen shot

Ebubo na Tinubu kwụsịrị ụlọikpe niile ịrụ ọrụ na Naịjirịa

N’ọnwa Julaị, ọbaozi Igbo Times wepụtara akụkọ ụgha na Onyeisiala Tinubu “akwụsịla ụlọikpe niile na Naịjirịa ịrụ ọrụ” maka ụjọ na e nwereike “ịchụtu ya n’ọkwa”.

Igbo Times egosighi ihe akaebe banyere akụkọ a bụ nke akụchapụrụla. Akụkọ a ka nọ n’ọbaozi ha.

Akụkọ ụgha maka ikpe ntuliaka

Ebe foto si, Screen

Akụkọ nduhie ndị ọzo

Mgbe ụlọikpe na-ahụ maka ntuliaka wepụtara ozi banyere ụbọchị a ga-ekpebi ikpe ahụ, ụfọdụ ndị a ma ma malitere ikesa akụkọ nduhie na soshal midia.

Otu onye na twitter a kpọrọ @MissPearls kwuru na “Tinubu chọrọ ime njem apụ Naịjirịa” na “atụmatụ bụ ka ọ gaa otu ọgbakọ”.

Mana njem Onyeisiala Tibubu kwesịrị ime gaa mba India dị mbụ pụta ihe n’ọnwa Eprelụ mgbe akụkọ kwuru na Praịm minista mba India bụ Shri Narendi Modi kpọrọ ya oku maka ọgbakọ G20, nke a ga-eme na 9 na 10 Sepụtemba.

Skip X post, 2
Hapụ X ihe dị na ya?

Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

Warning: BBC amaghị maka ihe ndị si n'ọbaozi ndị ọzọ.

End of X post, 2

Ịkatọ ndị ezinaụlọ ndị ọkaikpe

Ihe ozọ ndị mmadụ mere bụ ịkpọku ezinaụlọ ndị ọkaikpe ji ikpe a ma yie ha egwu site n’izigaara ozi n’ụdị ka ha majaa ndị a maka ikpe ha ji n’aka.

ọtụtụ ndị nkwado pati kwadoro ka okwu a a kpọro #AllEyesOntheJudiciary malite iwu na soshal midia.

Mkpebi ikpe banyere ntuliaka a, na-aga n’ihu ugbua n’ụlọikpe mkpegharị dị n’Abuja.