Election Tribunal: E higharịala ikpe Peter Obi na Labour Party maka Ntuliaka 2023

E higharịala ikpe Peter Obi na Labour Party maka ntuliaka 2023 gaa Wenezde izu na-abịa dịka amalitere ịnụ ya bụ ikpe n'elekere abụọ nke ehihe Wenezde a.
Peter Obi zọọrọ Labour Party ọkwa a wụchiri n'ụlọikpe mkpegharị dịka a malitere e hibere ịmalite ikpe a n'elekere abụọ nke ehihie Wenezde a bụ abalị 10 nke ọnwa Mee, 2023.

Labour Party rịọrọ ka e yigharịa ikpe a gaa ụbọchị Wenezde izu na-abịa bụ ụbọchị 17 nke ọnwa Mee, 2022.
Nke a bụ n’ihi na enwere ike ndị nọ n’ime akwụkwọ mkpesa ha nke ha chọrọ ihazi. Ha na-arịọkwa ka ha jiri ụbọchị Mọnde na Tuzde nyefee ndị niile akwụkwọ a metụtara ozi dịịr ha.
Ndị ọkaiwu na-anọchịte ndị gbara ikpe nakwa ndị agbara ikpe gbakọtara nụ mkpesa ndị a.
Wole Olanipekun bụ onye ọkaiwu na-anọchịte Bola Tinubu nọ dịka Lateef Fagbemi na-anọchite APC n'ọkwa.
Ọkaiwu Levi Ozoukwu na-anọchite Peter Obi na LP wụchiri n'oge n'ime ụlọikpe ahụ.
Cheta na ka e mechere ntuliaka 2023, pati ole m ole gbara akwụkwọ maka usoro ya bụ ntuliaka ebe ụfọdụ gbara akwụkwọ megide ụlọọrụ nhazị ntuliaka Naịjirịa bụ Independent National Electoral Commission (Inec) nakwa onye ha kpụpụtara dịka onye nwetere mmeri bụ Bola Ahmed Tinubu.
Obi chọrọ ka ụlọikpe kagbuo ntuliaka ahụ e mere n'ọnwa Febrụwarị 2023 kpamkpam ka Inec hazigharịa ntuliaka ọzọ, bụ nke Rinubu na ndị APC agaghị eso zọọ.
Obi kwukwara na Tinubu enwetazughị vootu zuru oke n'isi obodo Naịjirịa bụ Abuja dịka iwu Naịjirịa si kwuo.

Ikpe mkpesa maka ntuliaka 2023 nke eyigharịrị n'ụbọchị Mọnde ga-amalite ọzọ taa bụ ụbọchị 10 nke ọnwa Mee. A ga-anụ ikpe otu Action People's Party (APP) n'ụtụtụ Wenezde a ebe nke otu Labour party (LP) ga-amalite n'elekere abụọ nke ehihe.
Ndị ọrụ nchekwa wụjuru ebe niile n'ime nakwa n'ogige ụlọikpe mkpegharị nke Abuju bụ ebe a nọ ekpe ya bụ ikpe.

Ugbua, i nwereike inweta akụkọ BBC Igbo niile n'ekwenti gị.
Pịa aka ebe a ka i soro anyị
Ebe Ọkwa azụmahịa WhatsApp kwụsịrị
Cheta na ụlọikpe mkpegharị nke Naịjirịa yighariri ikpe maka ntuliaka ọkwa onyeisiala Naịjirịa gaa ụbọchị Tuzde na Wenezde, bụ ụbọchị itoolu na iri nke ọnwa Mee 2023.
Nke a na-abịa dịka ụlọikpe ahụ kụchapụrụ mkpesa nke pati Action Alliance (AA) n'ihi na ha kwuru na ha achọghịzi ịga n'ihu na mkpesa ahụ.
Ka e mechara ntuliaka 2023 otu ndọrọndọrọ ọchịchị ise wetara mkpesa gbasara ya bụ ntuliaka: AA, Allied Peoples Movement (APM), Action Peoples Party ( APP), Labour Party (LP) na Peoples Democratic Party (PDP). Mana ha fọrọ anọ ugbua dịka AA wepụrụ nke ha.
Ụlọikpe malitere taa ịnụ mkpesa nke ndị APP. kaiwu ha bụ Obed Agu kwuru na kama ịbanye n'ikpe a kpọmkwem, ọ ka mma ka Tinubu, APC na INec kwete na mkpesa nke e wetara megide ha n'ihi na ihe akaebe karịrị akarị.
Ka nke a mechara, ụlọikpe ahụ tinyere ụbọchị Wenezde, May 10, dịka ụbọchị a ga-anụtọpụ mkpesa ndị APP.
Ha tinyekwara otu ụbọchị ahụ maka ịnụ mkpesa nke ndị Labour Party.
Mana ha kwuru na mkpesa nke ndị PDP na APM ka a ga-anụ echi bụ Tuzde.


Ndị ọkaiwu nọchitere ndị dị icheiche ikpe a gbasara bụ:
- Obed Agu - nọchitere APP
- Wole Olanipekun - nọchitere Tinubu
- Lateef Fagbemi - nọchitere APC
- Abubakar Mahmoud - nọchitere Inec
- Levi Ozoukwu - nọchitere Peter Obi na LP
- Chris Uche - nọchitere anya Atiku na PDP
Ikpe gbasara ntuliaka ọkwa onyeisiala amalitela

Ikpe gbasara ntuliaka ọkwa onyeisiala Naịjirịa ebidola n'Abuja.
Naanị Peter Obi nke Labour Pati bụ onye so zọọ ọkwa onyeisiala bịara n'ụlọikpe ahụ n'onwe ya, ndị ọzọ bụ ndị ọkaiwu ha na-anọchite anya ha.
Ihe na-aga n'ihu ugbua bụ nke a na-akpọ 'pre-hearing' na bekee.
Ndị ọkaikpe nọ n'isi ikpe a bụ:
- Haruna Simon Tsamani (onyeisi ọkaikpe),
- Stephen Adah,
- Monsurat Bolaji-Yusuf,
- Moses Ugo, na
- Abba Mohammed
A kụchapụla mkpesa nke pati AA

Ụlọikpe ahụ malitere na mkpesa nke pati Action Alliance (AA), nke onye zọrọ ọkwa onyeisiala na pati ahụ bụ Solomon Okangbuan.
Dịka ikpe malitere, ọkaiwu nọchitere anya Okangbuan kwuru na ha achọghịzi ịga n'ihu na mkpesa ahụ, ha rịọrọ ụlọikpe ka a kụchapụ mkpesa ha.
Ebe ọ bụ na-enweghị onye ọbụla gbaghara ihe ha kwuru, ndị ọkaikpe kụchapụrụ mkpesa nke ndị otu AA.
Nke a pụtara na ọbụ naanị pati anọ na-agbagha mpụtara ntuliaka ahụ: PDP, LP, APM, na APP.

N'okwu nke onyeisioche pati AA bụ Adekunle Rufai Omo-Aje gwara ndị ntaakụkọ n'ụlọikpe, o kwuru na mkpesa ha abụghị megide Tinubu maọbụ APC, kama ọ bụ megide Inec.
Omo-Aje gara n'ihu kwuo na ha atulee ihe niile na-eme na Naịjirịa ugbua ma kwenye na ọchịchị Bola Tinubu nke APC ga-eme ka Naịjirịa kawanye mma, nke mere ha ji kpebie iwepụ mkpesa ha.

Ebe foto si, Tinubu/Obi/Atiku
Taa ka a ga-amalite ikpe gbasara ntuliaka ọkwa onyeisiala Naịjirịa nke e mere n'ụbọchị 25 nke Febrụwarị afọ a, bụkwa nke a kpọpụtara Bola Ahmed Tinubu, nke pati All Progressives Congress (APC) dịka onye meriri ya.
Dịka ndị APC si kwuo, ikpe nke taa bụ nke bekee na-akpọ 'pre-hearing'; nke a pụtara na ọ bụ ebe a ka a ga-anọ kpebie ụfọdụ ihe tupu a malite ya bụ ikpe kpọmkwem.
Ngalaba haziri ntuliaka a bụ 'Independent National Electoral Commission' (Inec) kwuru na Tinubu nwetara vootu dị 8,794,726 iji turu ugo ma bụrụ onyeisiala ọhụrụ Naịjirịa, ebe Atiku nwetara vootu 6,984,520; Peter Obi nwetara vootu 6,101,533.
Kedu ndị mere mkpesa a n'ụlọikpe?
Dịka Inec kpọpụtara Tinubu dịka onyeisiala ọhụrụ Naịjirịa ma nyekwa ya asambodo mmeri, Atiku, Obi, nakwa mmadụ abụọ ọzọ - Solomon Okangbuan nke pati Action Alliance (AA), Nnadi Charles Osita nke 'Action Peoples Party (APP), na Chichi Ojei nke pati Allied Peoples Movement (APM) - kwuru na ha ekwenyeghị na mkpọpụta ahụ Inec mere.
Ha ise wegara akwụkwọ mkpesa n'ụlọikpe iji gbaghaa mpụtara ntuliaka ahụ Ine kpọrọ.
Atiku kwuru na Inec agbasoghi usoro iwu ntuliaka na nhazi ntuliaka ahụ, ya mere ha chọrọ ka ụlọikpe nye iwu ka a napụ Tinubu asambodo mmeri Inec nyere ya.
O bokwara ebubo na Tinubu etozughị iso zọọ ọkwa onyeisiala Naịjirịa n'ihi ebubo ibu ọgwụike bụ nke e boro ya na mba US ọtụt afọ gara aga.
Atiku chọrọ ka ụlọikpe kpọpụta aha ya dịka onye meriri ntuliaka ahụ, ebe ọ bụ na ọ bụ ya gbara onye nke abụọ.
N'aka nke ọzọ, Peter chọrọ ka ụlọikpe kagbuo ntuliaka ahụ kpamkpam ka Inec hazigharịa ntuliaka ọzọ, bụ nke Rinubu na ndị APC agaghị eso zọọ.
Obi kwukwara na Tinubu enwetazughị vootu zuru oke n'isi obodo Naịjirịa bụ Abuja dịka iwu Naịjirịa si kwuo.
Solomon Okangbuan nke pati AA na-arịọ ụlọikpe ka ha kagbuo ntuliaka ahụ n'ihi na Inec nupuru isi na mkpebi ụlọikpe ma wepụ aha ya na ndị ga-eso zọọ ya bụ ọkwa.
Na mkpesa nke ya, Nnadi Osita nka APP boro ebubo na Tinubu nyere ndịọrụ Inec ego akazụ ka ha wee mee nrụrụaka na ngụkọ mpụtara ntuliaka na steeti nakwa okpuru ọchịchị dị icheiche.
Osita bokwara ebubo na Tinubu na APC nyere ọtụtụ ndị bịara ịtụ vootu ego iji zụrụ vootu ha, ma kwukwaa na ndị na-ekweghị ịnara ego ahụ, e gbochiri ha ịtụ vootu.
Chichi Ojei, bụ naanị nwaanyị so zọọ ọkwa ahụ chọrọ ka ụlọikpe napụta Tinubu asambodo mmeri nke Inec nyere ya maka na o tozughi ịzọ ọkwa onyeisiala na Naịjirịa dịka iwu Naịjirịa nakwa iwu ntuliaka si nye ntuziaka.
Ole mgbe a ga-ekpebi ikpe a?
Dịka iwu si dị, a na-atụ anya na mpụtara ụlọikpe a ga-apụta ma ọ gachaa ụbọchị 180 e ji wetara ha mkpesa.
Mana ebe ọ bụ na ọ bụghị n'otu ụbọchị ka mmadụ anọ a wegara mkpesa ha n'ụlọikpe, mkpebi ụlọikpe gbasara mkpesa anọ a nwereike ịpụta icheiche.
Mana ọị bụghị n'ụlọikpe mkpegharị ka ya bụ ikpe ga-ebi. Ohere dị maka iwega ya n'ụlọikpe kachasị, bụ ebe e kwesịrị ileba ya anya ma nye mkpebi n'ime ụbọchị 60.
Nke a pụtara na njem ụlọikpe a nwereike ịkụrụ ọnụ n'ime ọnwa asatọ.









