"Ihe mere ntuliaka afọ 2023 ji dị anyị bụ ndị ntoroọbịa Naịjirịa oke mkpa"

Aha onyonyo, Nigeria Election 2023: Ihe mere ntuliaka a ji dị mkpa nye ndị ntoroọbịa
"Ihe mere ntuliaka afọ 2023 ji dị anyị bụ ndị ntoroọbịa Naịjirịa oke mkpa"

Ụfọdụ ndị ntoroọbịa Naịjirịa akọwaala agbaala ama ihe mere ntuliaka afọ 2023 ji anụ ha ọkụ n'obi.

Na ajụjụọnụ BBC Igbo gbara ụfọdụ n'ime ha, ha kọwara na ọ bụrụ na esoghi binye aka na ntuliaka a na ọdịnihu ha ga-abụ ihe a ga-eji akọ akụkọ.

Ha kwuru na ha chọrọ isonye n'ịhọpụta onye ga-eme ka Naịjirịa dị mma, maka ndụ ha ugbua nakwa ọdịnihu.

Ndị ntoroọbia uche ha dị na ntuliaka afọ 2023

Ụfọdụ n'ime kwuru na kamgbe ha gụchara akwụkwọ ruo ogogo mahadum, na ha ahụbeghi ọrụ ọbụla rụọ ma ọ bụkwanụ azụmaahịa dị mma.

Ha ji ohere ahụ kpọkuo ndị ntoroọbịa ibe ha ka ha pụta n'ụbọchị ntuliaka ma binye aka iji họpụta onye ga-emezi obodo.

Kirie ihe ha kwuru n'uju;