New Year 2023: Lee mba ndị nabatarala afọ ọhụrụ

Ebe foto si, Getty Images
Dịka ụfọdụ ndị nọ n’ụwa ka na-eche ịnabata afọ ọhụrụ 2023, ụfọdụ mba ndị ọzọ ewerela ọsọ na ije mabanye n’afọ ọhụrụ a.
Afọ ndị a gụnyere;
Kiribati (Osimmiri nke Pacific)

Ebe foto si, Getty Images
Mba a kpọrọ Kiribati dị n’ala osimmiri Pacific gbara gburu bụ ndị mbụ bu ụzọ nabata afọ 2023 n’ụwa gbaa gburu gburu.
Kiribati kelere ekele afọ ọhụrụ n’ihe dịka n’elekere iri nke Greenwich Meridian Time (10 GMT).
Mba New Zealand

Ebe foto si, Getty Images
Mba New Zealand bụ mba nke abụọ nabatara afọ ọhụrụ 2023.
N’obodo Auckland, ha ji egbe na-enwu ọkụ kịrịkịrị a kpọrọ ‘fire works’ sị afọ 2023 nnọọ n’elu ụlọ a kpọrọ city sky tower.
Australia

Ebe foto si, Getty Images
Mba Australia egbugbi oge n’ịnabata afọ ọhụrụ 2023 nke ha bụ nke ha jikwa egbe na-enwu ọkụ kịrịkịrị ‘fire works’ nabata.
A nụrụ ụda egbe a n’ebe a kpọrọ Sydney Harbour dịka ọtụtụ ndị njem kwụsịrị na-eche ka ha banye afọ ọhụrụ tupu ha amalitekwa njem.
South Korea

Ebe foto si, Reuters
Seoul bụ isiobodo nke South Korea nabatakwara afọ ọhụrụ 2023 n’ụzọ pụrụiche
N’otu aka ahụ mba Tokyo feere afọ 2022 aka dịka ha nabatara afọ 2023 ọhụrụ.
Hong Kong

Ebe foto si, Getty Images
Na-egbughi oge mba ndị nọ na mpaghara Asia dịka Hong Kong anabatala afọ 2023.
Ha jikwa egbe ọkụ kịrịkịrị a kpọrọ ‘fire works’ ma sị afọ ọhụrụ nnọọ!
Ndị ọzọ gụnyere; Bangkok, Hanoi na Jakarta

Ebe foto si, Getty Images
Ọtụtụ mba ndị ọzọ dịka ndị nọ n'Amerịka nakwa Afrịka ka na-akwado ịnabata afọ 2023.








