Ụfọdụ ọkpụrụkpụ ihe ndị mere na ndọrọndọrọ ọchịchị Naịjirịa na 2022

Ebe foto si, Getty Images/Facebook
2023 bụ afo ọtụtụ chi obi n’aka eche ọkachasị dịka nke a bụ afọ ntuliaka na Naịjirịa, mana tupu anyị awụba 2023, 2022 a na-abịa na njedebe bịara bụrụ afọ dịka nne kwọ nwa, kufu ụfọdụ ma kpọrọ ndị ọzọ n’aka.
Anyị ga-eleghachite anya n’ụfọdụ ihe ndị mere na ndọrọndọrọ ọchịchị Naịjirịa; ndị tụrụ ọha n’anya, ndị nyere ọha obi ụtọ nakwa ndị mere tipụrụ ọha anya mmiri akwa.

Ebe foto si, Getty Images
Peter Obi na ndị ‘Obidents’
Aka chiburu Anambra steeti bụ Peter Obi mere ihe tụrụ ọha n’anya mgbe o kwuputara n'ebe ngwụcha ọnwa Mee na ọ hapụla otu pati Peoples Democratic Party (PDP) ma wezugakwa onwe ya n'ịzọ ọkwa n’aha pati ahụ.
Ọha ndị mmadụ chirii obi n’aka na-eche imata ihe ga-eme dịka o si pati nke ọ nọbụ zọọ ọkwa osote onyeisiala n’afo 2019. Ọ bụghị ihe ijuanya na mgbe Obi gosipụtara mmasị ịzọ ọkwa onyeisiala na pati ọzọ mana nke na-esoghi na pati abụọ kacha nwee agba na Naịjirịọ́.
Nzọụkwụ ndọrọndọrọ Obi gara n'ihu n'ike n'ike dịka ọ pụtakwara dịka onye ga-azọ ọkwa onyeisiala Na Labour Party ihe dịka ụbọchị atọ ọ batachara na pati ahụ. Ọ pụtara dịka onye otu pati ahụ họpụtara n’ọgbakọ ime ụlọ ha n'Asaba, isi obodo Delta steeti, dịka ndị ọzọ chọburu ịzọ ọkwa ahụ rituru nke gunyere Pat Utomi; Faduri Joseph na Olubusola Emmanuel-Tella.
Ka egwu, ka egwu ha Obo malitere na-ewu ọkachasị na soshal midia dịka ụzụ ndị mmadụ gbakọtara na-akwado ya. Ndi nso nso ya malitere ịkpọ onwe ha ndị ‘Obidents’ ma malite imere ya achumnta vootu tupu achụmnta vootu amalite n’uju. Ọ tụrụ ọha n’anya etu obi onye na-anaghị azọbụ ya bụ okwa ma bụrụkwa onye si akụkụ Ọwụwa Anyanwụ Naịjirịa siri buru onye ọha bịara kpụrụ n’ọnụ na achumnta vootu Naịjirịa.

Ebe foto si, Nigerian Presidency
Mbinye aka n’iwu ntuliaka ‘Electoral act’
Mmalite ihe ịtụ n’anya n’akụkụ ndọrọ ndọrọ ọchịchị Naịjirịa mere n’ọkwa Febụwarị afọ a. Onyeisiala Muhammadu Buhari binyere aka n'akwụkwọ niwu ntuliaka 2022 bụ ihe ọtụtụ chọrọ ugboro ugboro kemgbe afọ ole m ole gara aga ka ọ mee mana ọ meghị ya.
Ọtụtụ na-ekwu na iwu a agbanwela ọnọdụ ndọrọndọrọ ọchịchị Naịjrịa dịka ọ gbadoro ụkwụ n’akụkụ akwụkwọ iwu Naịjirịa nke 84(12) ma machie ndị ndọrọndọrọ ọchịchị ka ji ọkwa iso zọọ ọkwa na ntulika pati ọbụla, Ya iwu kwadoro iji tekunzu tụọ ma gụkọọ vootu dịka ọ dọtiri oge achụmnta vootu Naịjirịa. Akụkụ iwu gbanwere ọtụtụ ihe dịka ọha na-ele anya ịhụ etu ọ ga-esi metụta mpụtara ntuliaka 2023.
Cheta na iwu ahụ manyere ọtụtụ ndị ndọrọndọrọ ọchịchị ka ha gbaa arụkwaghịm maka ịzọ ọkwa ndọrọndọrọ ọchịchị na pati ha ebe ndị ọzọ tụhapụrụ atụmatụ ha ịzọ ọkwa ọzọ ma nọrọ n’oche ha ji eji.
'Muslim-Muslim ticket' na nhọpụta Kashim Shettima
Ugbua, i nwereike inweta akụkọ BBC Igbo niile n'ekwenti gị.
Pịa aka ebe a ka i soro anyị
Ebe Ọkwa azụmahịa WhatsApp kwụsịrị
Dịka Bola Ahmed Tinubu nwetere ikike iji ọkọlọtọ All Progressive Congress azọ ọkwa onyeisiala nakwa onye okpukperechi alakụba kpọpụtara osote ya bụ Kashim Shettima bụkwa onye okpukperechi alakụba, ọtụtụ okwu pụtara, ụfọdụ katọrọ ya ọkachasị ndị ụka Kraịsti dịka soshal midia enwụrụla ọkụ. Naịjirịa bụ mba e ji okpukperechi dị icheiche mara, mana abụọ kacha ibe ha bụ okpukperechi Kraịst na nke Islam.
Nke a mere ndị mmadụ ji na-ekwu na nhọpụta Tinubu mere nke enwebeghị onye ọchịchị ọzọ mere kemgbe afọ 1993 mgbe MKO Abiola zọrọ ọkwa agaghị achịta aja n’ihi na o megider, e tinyere ndị ebe a, e tinyere ndị ebe a.
Onyeisi All Progressives Congress (APC) bụ Abdullahi Adamu kọwara na atụmaatụ 'Muslim-Muslim ticket' dịka aka ọrụ chukwu, ma na-ekwu na ndị okpukperechi Kraist na-eti mkpụ enwela ụjọ ọbụla.
Adamu kwuru na obi siri ya ike na pati APC ga-emerị na ntụliaka gọvanọ a na-eme n'Osun steeti iji wee gosi udiri mmeri ha ga-enwe na ntuliaka 2023.
Adamu kwuru ihe ndị a mgbe ọ kpọ ndị isi pati APC ga kele onyeisiala Muhammadu Buhari na Daura bụ obodo ya dị Katsina steeti.

Ebe foto si, Getty Images
Achụmnta ndebanye aha na nweta akwụkwọ ikike ịtụ vootu (PVC)
Dịka ụlọọrụ na-ahazị ntuliaka na Naịjirịa bụ Inec kwupụtara mmepe ụlọọrụ ha maka atụmatụ ndị mmadụ idebanye aha ha nakwa inweta akwụkwọ ikike ịtụ vootu ha bụ PCV n'ịchafụ, n'akụkụ Naịjirịa dị iche iche ụzụ ndị mmadụ malitere ịgba dịka ọtụtụ nọ na-ekwu na ike agwụla etụ ọnọdụ Naịjirịa dị.
Nke a mere igwe mmadụ jiri foro ntutu taa ma na ndebanye aha n'ihi ha sị ha chọrọ ịtụ vootu nye onye ha chere ga-agbanwe ọnọdụ Naịjirịa.
Inec kwuru ugboro ugboro na ụdịrị ihe a metubeghị dịka ndị mmadụ malitere ihibere ebe nweta achụmnta vootu n'ahịa, n'ọdọ egwuruegwu, n'akụkụ dị iche iche ma 'na-enyere Inec aka' na nhazi ya bụ atụmatụ. Inec kwupụtara na ọnụ ọgụgụ ndị pụtara debanye aha ha n'agba nke afọ a karịrị nke afọ ndị ọzọ ọkacha dịka ọ bụ ndị ntorobịa kacha pụta debanye aha ya.
Mmeri Ademola Adeleke n’Osun steeti
N'ọnwa Julaị afọ a, Ademola Adeleke zọrọ okwa gọvanọ Osun steeti nke afọ a kụsara olileanya gọvanọ nọ n'ọchịchị oge ahụ bụ Gboyega Oyetola nke APC dịka o nwetere mmeri dara ụda na ntuliaka ahụ.
Adeleke nwetara ngụkọta vootu 403,371, ebe Oyetola nwetara vootu 375,027 na ya bụ ntuliaka. Ha abụọ azọbuola ọkwa mana akụchapụrụ Ademola nke mere o jiri foro ntutu taa ịhụ na o nwetere mmeri.
Ọ dịkwa mkpa ikwupụta na wa nwanne Adeleke bụ onye otiegwu a ma ama n’ụwa bụ David Adeleke ( Davido) gbara mbọ ukwu na nkwado nakwa achụmta vootu nna ya ukwuu bụ Adeleke Ademola nke nyere ha mmeri na steeti ahụ. Adeleke zipụtara ozi ekele nye Buhari maka ibinye aka n’iwu ahụ dịka o kwuru na ọ kpachịrị nrụrụrụaka nakwa mpụ na ya bụ ntuliaka.

Ebe foto si, Bola Ahmed Tibubu/Facebook
Okwu ‘E mi lo kan’ Bola Tinubu
Ka ọ na-eru ebe n'etiti afọ 2022, aka chiburu Lagos steeti bụ Bola Tinubu so na ndị ndọrọndọrọ ọchịchị pati ‘All Progressives Congress’ pụtara ịzọ nweta ikike ịzọ patị ahụ okwa onyeisiala na na 2023. Ka ikuku ntuliaka a nọ na-abịa ihe onyonyo gbara n’ọha ebe Tinubu nọ na-ekwusi okwu ike na Presidential Lodge nke Abeokuta, Ogun Steeti maka ịzọta ọchịchị n'afọ 2023. Okwu ya ahụ wuru ewu dịka ọ kọwara na ‘oge a mbụ oge nke m’. O kwukwara etu o siri nyere Onyeisisla Buhari aka inweta ọchịchị. Ihe kpatara ọtụtụ okwu nakwa nkatọ ebe ndị nso nso zịpụtara ozi gbachitere ya. Abdullahi Adamu bụ onyeisioche pati ahụ zipụtara ozi gosiri na ọchịchị pati gbaruru ihe n’etu o siri kwuo okwu.
Ọtụtụ cheere na etu o siri kwuo okwu ahụ ga-emetụta ya nakwa mpụtara ntuliaka ime ụlọ ahụ mana nke a emeghị dịka ọ ji vootu 1,271 kụchapụ ndị ọzọ welitere isi dịka Osote onyeisiala bụ Osinbajo, onye bụbu minista njem Naịjirịa bụ Amaechi nakwa onyeisi ụlọomeiwu bụ Ahmad Lawan.
Okwu na oge a bụ oge ọchịchị ya nke bụ ‘E mi lo kan’ n’asụsụ Yoruba malitere iwu ma mecha soro na isi okwu Tinubu ji malite achụmnta vootu ya mgbe o nwetere mmeri.
Ntuliaka ime ụlọ APC
Dịka ọha ndị mmadụ chere na ha ma ihe ga-eme na ntuliaka ime ụlọ pati All Progressives Congress (APC), ọkachasị ka ụfọdụ kwuru na ihe onyonyo Bola Tinubu n’ụzọ ọjọọ, Yemi Osinbajo, Rotimi Amaechi, Rochas Okorocha, Ahmed Lawan, Gọvanọ Yahaya Bello nke Kogi, Ogbonnaya Onu, Tunde Bakare, Tein Jack-Rich na ndị ọzọ achitaghị aja vootu ọbụla tụnyere Tinubu na ya bụ ntuliaka ime ụlọ pati ahụ.
Ihe ọzo mekwara bụ na akụkọ dapụtara na-ebo ebubo na onyeisioche pati ahụ bụ Abdullahi Adamu, na ọ nwara itinye Lawan dịka onye ga-azọrọ pati ahụ ọkwa, mana ngwa ngwa, agbara izu ime ụlọ ma kụchapụ ya bụ atụmatụ. Tinubu nwetere mmeri nke enweghị onye hụrụ azụ ya anya.

Ebe foto si, Nyesom Wike
Ntuliaka ime ụlọ PDP, Wike na ndị gọvanọ G5
Mpụtara ntuliaka a mere ka o si emebu nke bụ na Atiku Abubakar onye zọọrọ pati ahụ ọkwa ahụ ugboro abụọ, nwetere mmeri. Mana ọ bịara dị ka mpụtara ya kpatara okwu n’etiti ya na Gọvanọ Nyesom wike.
Atiku ji vootu narị atọ na iri asaa na otu merie Wike bụ onye nwetara vootu 237, ebe onye bụbu onyeisi ụlọomeiwu ukwu bụ Bukola Saraki nwetara vootu iri asaa.
Ka nke a mechara, Atiku họpụtara Gọvanọ Delta State Gọvanọ bụ Ifeanyi Okowa, dịka osote ya, Wike na ụfọdụ ndị otu na pati PDP malitere ịchọ ka onyeisioche pati ahụ bụ Iyorchia Ayu, pụọ n'ọkwá ya.Wike kwuru na iwe ha bụ na onye na-azọrọ patị ahụ ọkwa nakwa onyeisioche pati ahụ sicha otu mpaghara nke bụ mpaghara ugwu. Ha kwuru na ha chọrọ ka enye onye si ndịdị Naịjria ọkwa onyeisi oche pati ahụ. Wezuga Wike, ndị ọzọ n'otu ahụ bụkwa Seyi Makinde nke Oyo steeti, Samuel Ortomnke Benue steeti, Ifeanyi Ugwuanyi nke Enugu steeti na Okezie Ikpeazu nke Abia steeti.
Na mkpesa ha, nke a bụ iji kwado ‘e menyere ndị ebe a, e menyere ndị ebe a’.
Ka ha mere mkpesa a ugboro ugboro mana enwgehị onye gere ha nti, Wike na ndị otu ya kpọrọ onwe ndị ‘gọvanọ G5’ malitere ibuso pati ahụ ‘agha’ n’ụzọ dị iche iche ma jụọ isonye nn’otu achụmnta vootu pati ahụ. Wike na nso nso a kwuru na ebe anaghị ege ya nti na ọ ga-ekwupụta onye na-azọ ọkwa onyeisiala 2023 ọ ga-akwado dịka ọtụtụ na-eche na ọ gaghị akpọpụta aha Atiku na ọkwa ahụ.

Ebe foto si, Ike Ekweremmadu/Facebook
Nwụchi Sịnetọ Ike Ekweremadu
Ndị otu ‘Specialist Crime Team’ bụ ngalaba ndị uweojii Metropolitan na Lọndọn, mba Briten nwụchiri sịnetọ onye bụbu osote onyeisioche ụlọomeiwu Naịjirịa bụ, Sịnetọ Ike Ekweremadu na nwunye ya, Beatrice. maka ebubo na ha kpara nkata izuru ime ahụ otu nwoke n’ụzọ na-ezighi ezi. Nke mere mgbe akụkọ na nwa nwaanyị ha dara ọrịa akịrị ma na-achọ mgbanwe akịrị ya site n’iwa ahụ.
E jidere Ekweremadu na nwunye ya n'ọdụ ụgbọ elu Heathrow dị na Lọndọn ka ha na-aga Istanbul nke Turkey. E mechara tọhapụrụ Beatrice, mana Ekweremadu na-eche okwu ikpe a na UK ugbua. Nke a kụsara atụmatụ ya ịzọ ọkwa gọvanọ Enugu steeti bụ nke o kwupụtara ime na ntuliaka a na-abịa abịa.
Goodluck Jonathan na Godwin Emefiele ịpụta zọọ ọkwa onyeisiala
N'oge a ndị ndọrọ ndọrọ ọchịchị malitere ikwupụta mmasị ha ịzọ ọkwa, ọtụtụ kepụ kepụ malitere ifesa na onye bụbu onyeisiala Naịjriịa bụ Goodluck Jonathan, nakwa onyeisi ụlọakụ etiti Naịjirịa bụ Godwin Emefiele, na-ele anya ịnọchite Buhari n’ọkwa n’okpuru pati APC.
Ndị na-akwado Jonathan na APC gbaara ọsọ zụtara ya akwụkwọ ikike ịzọ ọkwa dịka otu otu ndị Fulani wepụtara ozi na ha zụtara ya bụ akwụkwọ n’ọnụ ego nde naịra 100. Nke a tụrụ ọha n’anya ọkachasị etu Jonathan siri pụọ n’ọkwa ahụ nakwa etu kepụ kepụ siri malite ifesa na ọ ga-azọrọ APC ya bụ ọkwa ebe ọ bụ onye PDP.
Goodluck ekwupụtaghị atụmatụ a mana ọtụtụ ndị ọkaibe na ndọrọndọrọ ọchịchị kwetere na APC nọ na-arịọ ya pụta zọrọ ha ya bụ ọkwa dịka onye si ndịda Naịjirịa.
Akụkọ pụtakwara na Emefiele site n’aka onye ọkaiwu ya bụ Mike Ozekohome mere mkpesa n’ụlọikpe nye Inec nakwa ọkaiwu gọọmentị etiti ka ọ ghara ịgba arụkwaghịm n’oche dịka iwu ntuliaka ọhụrụ siri kwuo ruo ụbọchị 30 tupu e mee ntuliaka.
Ọ gakwara n’ihu kwuo na ya bụ iwu emetụtaghị ya dịka ọ bụghị onye ndoro ndoro ọchcịhị kama a họpụtara ya ahọpụta na ya bụ ọkwa.









