Kedụ onye nwereike ịnọchi Justin Trudeau dịka Praịm Mịnịsta Canada?

Ebe foto si, Getty Images
N'ime ọnwa ole ma ole gara aga, ọtụtụ mmadụ malitere ịjụ Praịm mịnịsta mba Canada bụ Justin Trudeau 'Kedu mgbe ị ga-arịtu n'ọkwa ọchịchhị?
N'agbanyeghị esemokwu na nsogbu ndọrọndọrọ malitere isepụta isi na nso nso a, Justin Trudeau kwere nkwa ịnọ dịka onye ndu otu Liberal Party.
Mana ụbọchị Mọnde 6 Jenụwarị, 2025, Justin Trudeau pụtara kwuo na ya arịtuola n'ọkwa ọchịchị dịka Praịm mịnịsta mba Kanada
Justin Trudeau kwuru na ya rịturu n'ọkwa ọchịchị ka ya na ezinaụlọ ya kpachara nkata.
N'okwu ya 'Obodo anyị kwesịrị inwe onye ha chọrọ na ntuliaka a na-abịa, n'ihi nke a, o doro anya na mụ abụghị onye ahụ ga-enweta mgbanwe ma merie na ntuliaka ahụ'.
Mana Trudeau kwuru na ya ga-anọ n'ọkwa dịka praịm minista ruo ọnwa Maachị 24 oge pati ha ga-ahọpụta onye ndu ọhụrụ.
Ajụjụ onye ọbụla na-ajụ ugbua bụ kedụ onye ga-anọchi Justin Trudeau dịka Praịm Mịnịsta Kanada?
Chrystia Freeland - Onye bụbu Osote Prịam Mịnịsta

Ebe foto si, Reuters
Chrystia Freeland bụ onye omeiwu na-anọchiteanya Toronto ma bụrụ onye a ma ama n'ọchịchị Justin Trudeau. Ọ bụ onye a na-ekwu nwereike ịnọchi Justin Trudeau dịka Praịm mịnịsta.
Ugbua, i nwereike inweta akụkọ BBC Igbo niile n'ekwenti gị.
Pịa aka ebe a ka i soro anyị
Ebe Ọkwa azụmahịa WhatsApp kwụsịrị
N'agbanyeghị na ọchịchị Trudeau nwere ntụkwasịobi n'ebe ọ nọ, esemokwu dapụtara n'etiti ya na Trudeau mere ka ọ gbaa arụkwaghịm dịka osote praịm mịnịsta n'ọnwa Disemba, 2024.
Chrystia Freeland katọrọ usoro ọchịchị Trudeau n'akwụkwọozi arụkwaghịm o wepụtara. Ọ bụ nke a ka a na-ekwu na ọ kpalitere oku ka Trudeau rịtuo n'ọkwa.
Chrystia Freeland a mụrụ na Alberta, gbara afọ 56. Ọ rụrụ ọrụ dịka onye ntaakụkọ tupu ọ malite ndọrọndọrọ. Nne ya bụ onye mba Ukren.
Ọ banyere ụlọ House of Commons n'afọ 2013. Ka afọ abụọ gara, o sonyere na kabịneti Trudeau.
Dịka mịnịsta na-ahụ maka mmekọ mba ofesi, o nyere Kanada aka dozigharịa nkwekọrịta azụmahịa dị n'etiti ha na mba Amerịka na Mexico.
A họpụtara ya dịka osote praịm mịnịsta nakwa mịnịsta na-ahụ maka ego. Ọ bụ nwaanyị mbụ a họpụtara n'ọkwa a. Ọ bụ Chrystia Freeland rụrụ ịhazi ọnọdụ akụnaụba Kanada oge ọrịa covid kiwapụrụ.
Tupu ọ gbaa arụkwaghim n'ọnwa Disemba 2024, o katọrọ etu Trudeau siri nabata okwu Trump kwuru banyere mbuli ego ụtụisi na ngwa ahịa Kanada na-aga mba Amerịka.
Chrystia Freeland gụrụ akwụkwọ n'ụlọakwụkwọ Harvard, bụ onye na-akwado mba Ukren. Na nso nso a, Donald Trump kpọrọ ya onye nwere ajọ obi.
Mark Carney - Onye rụburu ọrụ n'ụlọakụ etiti

Ebe foto si, Getty Images
Trudeau gbara mbọ ime ka Mark Carney bụrụ onye ọrụ ya dịka mịnịsta na-ahụ maka ego.
Trudeau kọwara Mark dịka onye maara ihe ekwe na-akụ ma bụrụ onye ga-enweta mgbanwe na ndọrọndọrọ ọchịchị Kanada.
Carney dị afọ 59, rụrụ ọrụ dịka onye ndụmọdụ Trudeau n'ime ọnwa ole na ole, bụ onye a na-ekwu nwereike ịnọchi Trudeau.
Mark Carney anọbeghị n'ọkwa ọbụla mana ọ bụ onye ihe gbasara akụnaụba doro anya, nke a bụ maka na ọ rụrụ ọrụ n'ụlọakụ Bank of Canada nakwa Bank of England.
Anita Anand - Mịnịsta na-ahụ maka njem

Ebe foto si, Bloomberg via Getty Images
Anita Anand gbara afọ 57 b ọkaiwu banyere ndọrọndọrọ ọchịchị n'afọ 2019 oge a họpụtara dịka nnọchiteanya Oakville dị n'ọpụpụ Toronto.
Anand gụrụ akwụkwọ na mahadum Oxford, bụ onye maara ihe ekwe na-akụ banyere nhazi ego na nchịkọta ọchịchị.
A họpụtara Anand dịka mịnịsta na-ahụ maka ọrụ ọha na ịzụ ahịa. Nke mere ka ọ nọrọ n'isi ịhụ na mba Kanada nwetara ọgwụ mgbochi oge ọrịa Covid tiwapụrụ n'afọ 2020.
N'afọ 2021, a họpụtara mịnịsta na-ahụ maka nchekwa iji rụọ ọrụ inweta enyemaka nye mba Ukren n'agha ha na mba Rọshịa. Ọ rụrụ ọrụ inweta ndozi n'esemokwu dị n'etiti ndịagha Canadian Armed Forces nke e kwuru na ọ bụ mmetọ ahụ kpatara ya.
N'ọnwa Disemba, a họpụtara Anand dịka mịnịsta na-ahụ maka njem na mịnịsta na-ahụ maka azụmahịa ime ụlọ.
François-Philippe Champagne - Mịnịsta na-ahụ maka mmepụta, sayensị na ụlọ mmepụta

Ebe foto si, Toronto Star via Getty Images
François-Philippe Champagne bụbu onye ji ego achụ ego nakwa onye maara maka azụahịa mba na mba, bụ onye ọzọ chọrọ ịnọchi Justin Trudeau.
François-Philippe Champagne gabara afọ 54, banyere ụlọ Commons n'afọ 2015 mana kemgbe ahụ, ọ rụọla ọrụ na mịnịstrị dị iche iche nke gụnyere azụmahịa mba ofesi, mmekọ mba ofesi ruo ugbua ọ bụ mịnịsta na-ahụ maka mmepụta, sayensị na ụlọ mmepụta.
Ọtụtụ ihe ka e kwuru nwereike inye ya mmeri mana otu ihe gbara ọkpụrụkpụ bụ na ọ bụ onye Quebec mpaghara onu ha kachasị ada ụda na ntuliaka mba Kanada.
Ọtụtụ ndị ndọrọndọrọ ọchịchị doro anya na-ekwu na François-Philippe Champagne nwereike inweta mmeri maka na ọ maara ihe ekwe na-akụ gbasara azụmahịa.
Mélanie Joly - Mịnịsta na-ahụ maka mmekọ mba ofesi

Ebe foto si, Reuters
Dịka Trudeau, Mélanie Joly na-anọchiteanya Montreal.
Ọ bụ onye nọchitegoro anya Kanada n'ọtụtụ ọgbakọ ndị isi mabụwa kemgbe afọ 2021.
Dịka mịnịsta na-ahụ maka mmekọ mba ofesi, Mélanie Joly emeela njem mba Ukren iji gosi nkwado Kanada nye ha.
Ọ gara mba Jordan iji nyere ka zọpụta ma dulata ụmụafọ Kanada tọrọ ebe ahụ oge agha Izrel na Hamas malitere.
Joly bụ onye rụrụ ọrụ iji nweta ndozi n'esemokwu ahụ dapụtara maka ebubo na ndị India gburu onyeisi otu nnupuisi Sikh na Kanada.
Mélanie Joly bụ ọkaiwu gụrụ akwụkwọ na mahadum Oxford bụ onye ndọrọndọrọ ọchịchị anye ruru ala zọrọ ọkwa Mayor Montreal n'oge gara aga.
Ọ bụ Trudeau gwara ya ka ọ zọọ ọkwa ọchịchị.
Dominic LeBlanc - Mịnịsta na-ahụ maka ego na ihe gbasara gọọmentị

Ebe foto si, Getty Images
Dominic LeBlanc gbara afọ 57, bụ enyi Trudeau nwere nnukwu ntụkwasịobi ebe ọ nọ.
LeBlanc letara Trudeau na ụmụnne ya oge ha bụ ụmụaka.
Ọ bụ onye a maara dịka onye na-enwere ọkwa ọchịchị oge ihe isi ike. A họpụtara ya dịka mịnịsta nahụ maka ego n'ime awa ole na ole Freeland gbara arụkwaghịm.
Dominic LeBlanc so Trudeau ga zute Donald Trump na Mar-a-Lago n'ọnwa Nọvemba.
Nwaamdị bụbu onye ọkaiwu anọọla n'ụlọomeiwu ihe ruru afọ iri abụọ. A họpụtara n'afọ 2000 ka ọ nọchiteanya Atlantic mpaghara dị na New Brunswick.
Nna Dominic LeBlanc rụrụ ọrụ dịka mịnịsta oge nna Justin Trudeau bụ Pierre Trudeau bụ praịm mịnịsta. O mechara rigoro n'ọkwa dịka onyeisiala Kanada.
LeBlanc egosila na ọ chọrọ site n'ịzọ ọkwa onyeisi pati ha n'afọ 2008 mana Michael Ignatieff meriri ya na ntuliaka ahụ.









