Etu ndị gbanwere ụdịdị ha siri hazie nzukọ nakwa oriri nzuzo na Naịjirịa

Ndị mmadụ na-aga ije nwamba n'ihu onye ọkaikpe

Ebe foto si, Demola Mako/The Fola Francis Ball

    • Onye dere ya, Todah Opeyemi
    • Ndị mere akụkọ a, BBC News, Lagos

Ogige ebe a na-eme emume na-ahụ ihe zoro ezo.

Nke a bụ oriri dị egwu na Naijiria, ebe mmekọrịta nwoke na nwaanyị maọbụ ngosipụta mmetuahụ a na-akwadoghị, ihe ọbụla nabatara omenala a nọ n'ihe egwu.

Ndị na-ahazi mmeme Fola Francis – nke e nyere aha iji sọpụrụ nwaanyị 'gbanwere ụdịdị ya (transgender) nwụrụ n'afọ gara aga ugwu .

E wepụtara aha ogige ebe a ga-eme emume a mgbe ọ fọrọ naanị awa ole ma ole tupu o bido.

Mana nke a egbochighị ihe karịrị mmadụ 500 bịara emume ahụ na mpaghara Legọs, Naịjirịa.

Ihe dị n’akụkụ ebe a gbachiri agbachi bụ ụgbọala na ụlọ nkwakọba ihe ndị a ma ama maka nnọkọ oriri na ọṅụṅụ.

Enwere ike ịnụ ụda egwu site n'ọnụ ụzọ na ịgafe ọnụ ụzọ ahụ.

Mkparịtaụka na ọchị juputara ebe ahụ. Nke a bụ ọṅụ nke ịkwatu egwu.

Onye ọbụla yi akwa site ka iwu mmekọ ahụ si kwuo.

Two people dressed up in black for the ball

Ebe foto si, Demola Mako/The Fola Francis Ball

Nkọwa foto, Uyaiedu Ikpe-Etim (L) and Ayo Lawanson (R) organised the ball

N'ime ụlọ nzukọ ahụ ọkụ na-enwu, ọkụ strobe na-ese ndị bịaranụ n'ụdị dị iche iche.

'Androgyny na eccentricity' pụtara ihe. Otu nwaanyị kpụrụ isi ya gakwuru otu nwoke yi uweojii.

Ndị mmadụ na nnọkọ ahụ nabatara idị ka nwoke kwesiri ịdị, kpuru ntutu na akwa takpara atakpa wee mee ka ihu ha na amụkeamụke

Ndị ọ bụ ha haziri mmeme ahụ - Ayo Lawanson na Uyaiedu Ikpe-Etim – haziri ya site n'ihe mmeme yiri ya nke ha gara.

Lawanson gwara BBC na "Anyị chere na anyị bụ ndị mmekọ ụdị ekere ha na-amasị, mana ịga mmeme ahụ gbanwere echiche anyị banyere ihe ọ bụ ịbụ onye mmekọ ụdị ekere na-amasị."

E mere mmeme mbụ n'afọ gara aga iji cheta mmeme isiokwu ya bụ ‘14 Years and a Day’, mana afọ a ha chọrọ ịsọpụrụ Fola Francis.

Ruo mgbe mmiri riri ya n’osimiri Legọs na njedebe nke afọ gara aga, ọ bụbu onye na-ahụ maka nchịkọtta mmeme ahụ.

Ọ chịkọbara, hazie ma kpọkuo mmemme ndị mmekọ ụdị ekere ha na-amasị.

Ndị mmadụ na-agba egwu n'ihu ọkụ na-acha edo edo

Ebe foto si, Demola Mako/The Fola Francis Ball

Nkọwa foto, Emume a nyere ndị mmadụ ohere ịbụ onye ọbụla ha chọro ịbụ

Ọtụtụ ndị mmadụ mmemme Fola Francis bụ ohere ịsọpụrụ ya.

Otu onye n’ime ha kwuru na “A chọrọ m ịsọpụrụ Fola.”

Oge mbụ m bidoro ịpụta iro, ọ gwara m na m mara mma, onwe bido banye m isi. O mere ka obi kaa m.”

Fola Francis bụ onye metụtara ọtụtụ ndị mmekọ ụdị ekere ha na-amasị mana ọnwụ ya mwutere m nke ukwuu.

Onye ọzọ kwuru na ọ bụ Fola Francis kuziere ya ihe ọ ma taa. O mere m ka mụ nwere onwe m.

Onye ọzọ ọ bụ mbụ ya ịbia mmemme a, gwara BBC na mmemme a bụ ihe ọ na-elejere anya kemgbe.

Ọ kwapụrụ nwe bia Legọs maka mkpagbu a na-akpagbu ndị mmekọ ụdị ekere ha na-amasị na ngbago ugwu Naịjirịa. Ọ bụ Fola Francis nabatara ma nyere ya aka.

Mmemme ndị mmekọ ụdị ekere ha na-amasị na LGBTQ bụ nke bidoro na mba Amerịka na 19th century. Ọ gbasaala n’Amerịka niile ma nwe ụlọọrụ na-enye ndị dị otu ha nkwado.

Ihe nkiri dịka RuPaul’s Drag Race, Legendary and Pose bụ nke mere ka ọ na ada ụda.

Onye yi uwe na-acha uhie

Ebe foto si, Demola Mako/The Fola Francis Ball

Nkọwa foto, Ndị so n'emume a pụtara n'ọgbọ ebe a na-aga ije nwamba iji maa aka n'ogogo dị iche iche.
Nwoke nọ n'ọgbọ na-agba egwu

Ebe foto si, Demola Mako/The Fola Francis Ball

Nkọwa foto, Ndị mmadụ na-akụrụ ndị na-asọmpi aka

Na mmemme Fola Francis, ndị biara ya nwere ọtụtụ ihe egwuregwu nke onye turu ugo nwetara onyinye.

Ndị mmadụ na-akụ aka ma na-enwe aṅụrị.

Ndị haziri mmemme a mere ya iji nwe nye ndị mmekọ ụdị ekere ha na-amasị ohere ma mee ka ha nwe ike nwe aṅụtị.

Otu nwoke mmekọ ụdị ekere ya na-amasị ‘Gay’ kwuru na “Obi a kaghịm ebe a. Ndị ọrụ nchekwa nwere ike ịbata bia wuchie gị.” Ụdị ihe a emeela m na mbụ.

“Ọtụtụ ndị otu a kwesiri ịnọ abe mana ha na-atụ egwu ndị uweojii”

Ndị ọkaikpe abụọ ka a na-ese ha foto

Ebe foto si, Demola Mako/The Fola Francis Ball

Nkọwa foto, Ashley Okoli (L) na odeakwụkwọ bụ Ozzy Etomi (R), bụ ndị a ma ama na Naịjirịa, kwadoro emume a dịka ndị ọkaikpe

Mna ndị haziri ya mere ihe niile iji hụ na-enwere ezi nchekwa ndị biara mmemme ahụ.

Enwere ebe ha ga-eyipụ akwa. Ha kpọrọ ndị ọrụ nchekwa nke onwe.

N’agbagheghị na ọ bụ mmemme ndị mmekọ ụdị ekere ha na-amasị, e nwere ndị na-adighị ka ha biara mmemme ahụ.

Ikpe Etim kwuru na “ndị mmekọ ụdị ekere ha na-amasị adịghị iche, e kwesiri ka anabata ha.”

Onye na-ede akwụkwọ bụ Eloghosa Osunde kwuru na mmemme ahụ bụ ebe ndị mmekọ ụdị ekere ha na-amasị na-anaghị enwe ihere ọbụla.

Onye na-emepụta akwa bụ Weiz Dhurm Franklin kwuru na ọ dị mkpa inwe mmemme dị etu a.

“Ọ bụ ihe dị mma ị nọrọ ebe a nabatrar gị, inwe aṅụrị ma nwe mmekọrịta.”

The dancefloor bathed in red light

Ebe foto si, Demola Mako/The Fola Francis Ball

Akụkọ ndị ọzọ nwereike ịmasị gị: