Ihe mere ụmụnwaanyị Akokwa jiri mee ngagharịiwe n'ụlọ ndị Eze ha

Ihe mere ụmụnwaanyị Akokwa jiri mee ngagharịiwe n'ụlọ ndị Eze ha

Ebe foto si, Screenshot

Nkọwa foto, Ebe ụmụnwaanyị Akokwa na-eme ngagharịiwe n'ihu ụlọ Eze ha
Oge e ji agụ akụkọ nkeji 2

Ụmụnwaanyị emeela ngagharịiwe na nke ndị Eze ha n'obodo Akokwa dị n'okpuru ọchịchị Ideato North n'Imo steeti megide ihe ọjọọ na-eme n'obodo ahụ.

Otu ihe onyonyoo fesara na soshịal midịa gosiri ebe ụmụnwaanyị e kwuru na ha bụ ụmụada na-eme ngagharịiwe n'ihu ụlọ Eze obodo ha.

Akụkọ kwuru na ọ bụ n'ụbọchị Tuzde 12 Ọgọst, 2025 ka ha bụ ụmụada zọrọ njem ngagharịiwe ahụ.

Ụmụnwaanyị ahụ ruru mmadụ iri n'ọnụọgụ ka onyonyoo gosiri ebe ha na-ekpo ureghure, mkpọmkpọ ihe na ihe ndị ruru unyi n'ihu ụlọ Eze ha.

A hụkwara ka ụfọdụ na-anyụ nsị na mmamịrị n'ọnụụzọ ụlọ Eze ahụ, ebe ndị nke ọzọ na-akpọ iyi ma na-agbara eze ahụ ọtọ.

BBC News Igbo abanyela n'ọbaozi Whatsapp chanelụ
Nkọwa foto, Pịa aka ebe a ka i soro Whatsapp chanelụ anyị

Ọ bụ ngagharịiwe n'ụzọ udo ka ụmụnwaanyị mere - Onye ntoroọbịa Akokwa

Otu onye Akokwa aha ya bụ Nzubechukwu kwuru na ihe ụmụnwaanyị obodo ahụ mere bụ ngagharịiwe n'ụzọ udo.

Oge onye ntaakụkọ BBC News Igbo gbara ya ajụjụ ọnụ n'ekwentị, ọ sịrị na nke a abụghị mbụ ndị obodo ahụ na-eme ngagharịiwe maka ihe ọjọọ ndị na-eme n'obodo ha.

"Ndị ntoroọbịa obodo anyị eburula ụzọ mee ngaghrịiwe n'ụzọ udo na nke ndị Eze isii e nwere n'Akokwa mana ya bụ nsogbu agaa n'ihu".

"Nke ahụ mere ụmụnwaanyị anyị na ụmụada anyị jiri jikọọ aka mee ngagharịiwe n'ụzọ udo iji mee ka ndị Eze mata ihe na-eme n'obodo anyị, ma nụ ihe a ga-agwa ha," ka Nzubechukwu gwara anyị.

Ọ sịrị na ihe ụmụada ahụ rịọrọ ndị Eze ha bụ ka e wepụ okwu niile gbasara ndị Akokwa nọ n'ụlọikpe ma dozie ya n'obodo.

Ọzọ abụrụ na o nweghị nwaafọ Akokwa ọbụla a ga-akpụpụ nwanne ya n'ụlọikpe.

Nzubechukwu gara n'ihu kwuo na ihe ọzọ kpatara ụmụnwaanyị ji mee ngagharịiwe ahụ bụ maka otu nwaada obodo ahụ e ji eji n'ụlọọrụ DSS dị n'Owere.

Dịka nwaokoroọbịa ahụ siri kwuo, ọ bụ naanị ndị Eze atọ nabatara ụmụnwaanyị ahụ ebe atọ ndị nke ọzọ ekweghị anabata ha.