You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.
Lee foto na aha ndị omekome Boko Haram gbapụrụ na nga Kuje
Ụlọọrụ nlekọta ndị nga na Naịjriịa nke Nigeria Correction Service (Ncos) ebipụtala nchịkọta foto na aha ndị omekome Boko Haram gbapụrụ na ụlọ nke Kuje, Abuja n’abalịTuzde.
Ncos bipụtara aha na foto mmadụ 68 ndị a. E depụtara aha ha dịka ndị a na-achọ achọ.
Ha kwuru na ha ga-ebipụta aha ndị ọzọ gbapụrụ dịka ndị omekome wakporo ụlọ nga ahụ n’abalị ahụ. Akụkwụọ ozi Ncos nyere ọha akara ekwentị atọ nke ha nwereike iji zigara ha ozi ma ha hụ maọbụ nọ ihe ịgba ama ọbụla banyere ndị a maọbụ nsogbu nchekwa n’ebe obibi ha.
End of Akụkọ mwakpo ndị ọzọ nwereike ịmasị gị
Cheta na na dịka ihe a mechara mba Amerịka na mba Briten zipụtara ozi ịdọ aka na nti nye ndị mba ha bi maọbụ na-abata Naịjriịa ọkachasị Abuja ka ha gbado anya, jiri akwụkwọ njirimara onye, nakwa zokwawa onye ha n’oge a.
Otu Boko Haram nke Iswap kwuru na ọ bụ ha mere mwakpo na nga ahụ n’abalị Tuzde.
Ọ bụ anyị wakporo ụlọmkpọrọ Kuje - ISWAP
Otu oyindụegwu kpọrọ onwe ha Islamic State (IS) ekwuola na ọ bụ ha mere mwakpo e mere n'ụlọmkpọrọ Kuje, n'Abuja, n'abalị Tuzde, 5 Julaị 2022.
N'ozi ha si n'ọgbọ mgbasaozi ha bụ Amaq ziputa, ha kwuru na ha "tọhapụrụ ọtụtụ ndị a tụrụ nga".
IS na-akpa mkpamkpa na mpagahara Ọdịda Anyanwụ Afrịka n'okpuru aha ISWAP.
Cheta na gọọmentị Naịjiria ekwubuola na ha na-eche na ọ bụ ndị oyindụegwu Boko Haram mere ya bụ mwakpo.
'Ndị mkpọrọ 879 gbapụrụ n'ụlọ mkpọro Kuje' - Interior ministry
Ngalaba na-ahụ maka nchekwa ime obodo Naịjirịa ekwuola na ndị ụlọmkpọrọ anọ nwụrụ ebe iri na isii merụrụ ahụ dịka awakporo ụlọ mkpọrọ Kuje dị n'Abuja n'abalị ụnyahụ bụ Tuzdee, Julaị 06, 2022.
Otu onye nchekwa nwụrụ ebe ndị nchekwa atọ merụrụ ahụ.
Umar Abubakar bụ ọnụ na-ekwuru ngalaba ahụ kwuru na ndị ụlọ mkpọrọ ruru narị asatọ na iri asaa na itoolu (879) gbapụrụ, ebe e jidere ndị mkpọrọ ruru narị anọ, iri anọ na atọ (443) n'ime ha.
Abubakar kwuru na a ka na-agba mbọ ịhụ na anwụchịgharịrị ndị mkpọrọ gbapụrụ n'ụlọmkpọrọ ahụ mana ndị ọrụ ụlọ mkpọrọ esoghị na ndị gbapụrụnụ.
Abba Kyari o so na ndị gbapụrụ n’ụlọ mkpọrọ Kuje?
Abba Kyari o so na ndị gbapụrụ n’ụlọ mkpọrọ Kuje ụnyahụ? Nke a bụ ajụjụ ọtụtụ mmadụ na-ajụ ugbua. Ọnụ na-ekwuru Nigeria Correctional Service PRO gwara BBC na Abba Kyari bụ osote kọmịshọna uweojii akwụsịtụrụ ọrụ maka ebubo nrụrụaka nọsike n’ụlọ mkpọrọ Kuje dị n’Abuja. Ndị omekome agaghị agakeje ụlọ mkpọrọ Kyari. Ndị omekome ahụ gbadoro anya hụ na ha gara kụkaa ụlọmkpọrọ ndị otu ha nọ na ya ka ha wee tọghapụ ha.
E hibere ụlọ mkpọrọ Kuje n’afọ 1989, dịka o nwere ebe ukwu na ebe nta a na-edowe ndị nga.
Naịjirịa na-adọlị ịhu na ha kwụsịrị enweghị ezi nchekwa gbara bee ha gburu gburu dịka ntọrị, ndị agha Boko Haram nakwa IS na-ebute oke mwakpo na ogbugbu n’ebe ahụ.
Mwakpo Kuje na-abịa na-erughị awa ole na ole awakpochara ụgbọala na-ebu ndị ọrụ nchekwa onyeisiala Naịjirịa bụ Muhammadu Buhari n’obodo ya bụ Daura dị na Katsina steeti.
Ihe Permanent Secretary ngalaba nchekwa ime obodo Naịjirịa kwuru
Shuaibu Belgore, bụ onye ji ọkwa Permanent Secretary na mịnịstrị nchekwa ime obodo Naịjirịa, kwuburu na mmadụ narị isii (600) si na ụlọmkpọrọ gbapụ dịka ndị ekperima wakpọrọ ebe ahụ n'abalị Tusde.
Ọ kọwara na ọ bụ mmadụ 994 nọ n'ime ụlọ mkpọrọ ahụ oge mwakpo a mere.
Belgore kwuru na ha ejidekwala ihe karịrị mmadụ 300 n'ime ndị ahụ gbara ọsọ.
Ọ gara n'ihu kwuo na ọ bụ ndị ekperima Boko Haram ka a na-eche na ha mere mwakpo a.
Nnukwu ụjọ jizi anyị ugbua - Ndị bi na Kuje
Ndi bi na mpaghara Kuje, dị n'Abuja, chị obi n'aka n'ụtụtụ a dịka akụkọ fesara gbasara mwakpo ndị ekperima n'ụlọ mkpọrọ dị ebe ahụ.
Dịka ọnụ na-ekwuru ndị ọrụ nchekwa mkpọrọ bụ Umar Abubaka si kwuo, mwakpo ahụ malitere n'elekere iri nke abalị ụbọchị Tuzde.
Umar kwuru na ndị ọrụ nchekwa nọ n'ụlọ mkpọrọ ahụ busokwara ndị ekperima agha, ma mee ka udo lọghachi.
Mana o kwughị ma e nwere ndị si n'ụlọ mkpọrọ ahụ gbaa ọsọ dịka ya bụ mwakpo mere.
Akụkọ ụfọdụ na-ekwu na ụfọdụ ndị ekperima e ji eji n'ụlọ mkpọrọ Kuje agbaala ọsọ, mana BBC Igbo ka na-eme nnyocha iji mata ihe merenụ kpọmkwem.
Ihe ndị bi na Kuje kwuru
Otu onye bi na mpaghara Paseli, bụ ogbe dị nso n'ụlọ mkpọrọ ahụ, gwara BBC Igbo na ha chị obi n'aka ogologo abalị niile dịka mwakpo ahụ na-aga n'ihu.
Onye a kwuru na ya ma kpọkwem na ọtụtụ ndị mkpọrọ gbapụrụ n'ụlọ mkpọrọ ahụ.
O kwukwara na ha hụrụ ebe a nwụchiri ụfọdụ ndị ahụ gbara ọsọ ebe ha zoro n'ụlọakwụkwọ 'Government Secondary School' na Paseli.
Ọ gara n'ihu kwuo na ụjọ dị n'okirikiri ahụ niile ugbua.
"Ebe ndị ekperima a wakporo ụlọ mkpọrọ ebe ha ma na ndị ọrụ nchekwa ji egbe na-eche nche, gịnị ka ha ga-emezi anyị na-enweghị nchekwa ọbụla?" Onye a kwuru.
Onye ọzọ bi na mpaghara Kuchiako na Kuje gwara BBC Igbo na ọ bụghị na mpaghara nke ha ka ụlọ mkpọrọ ahụ dị, nke mere na ha anụghị oge mwakpo ahụ na-eme.
Mana o kwuru na ụlọọrụ ya eziterela ha ozi ka onye ọbụla nọrọ n'ụlọ taa hapụ ịbịa ọrụ.
O kwukwara na ụlọ akwụkwọ dị na mpaghara ahụ ezigarala ndị nne na nna ozi na-agwa ha ka ha ghara ịbịa akwụkwọ taa.
Mwakpo ụlọ mkpọrọ na Naịjirịa n'ọdị nso a
Nke a abụghị nke mbụ a na-awakpo ụlọ mkpọrọ na Naịjirịa.
Ugboro anọ ka a wakporo ụlọ mkpọrọ na steeti dị icheiche na Naịjirịa n'afọ 2021.
Na ngwụcha afọ 2021, mmadụ atọ si n'ụlọ mkpọrọ dị n'Ilorin, Kwara steeti gbaa ọsọ, dịka ndị ọrụ nchekwa ụlọ mkpọrọ ahụ si kwuo.
Mmadụ atọ a gụnyere Umaru Altine, onye a mara ikpe ọnwụ maka iji egbe ezu ohi; Segun Nasiru na Isa Usman, ndị e boro ebubo iji egbe aga ohi
N'ọnwa Ọkutoba 2021, mmadụ 837 gbapụrụ n'ụlọ mkpọrọ dị n'Oyo steeti dịka ndị ekperima wakporo ma tiwaa ya bụ ụlọ mkpọrọ.
Na Plateau steeti, n'ọnwa Nọvemba 2021, ndị emperima wakporo ụlọ mkpọrọ dị na Jos, gbuo mmadụ iri ma tọhapụ ndị mkpọrọ dị 252 n'ọnụ ọgụgụ.
Ihe karịrị ndị mkpọrọ 1200 ka ndị ekperima tọhapụrụ n'ụlọ mkpọrọ dị n'Owere Imo steeti n'ọnwa Eprel 2021.