You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.
Etu ndị omekome si wakpoo ụlọ kọmịshịna ọrụ na owuwe ọrụ n’Imo steeti
Ndị a sị bụ o ji egbe awakpola ụlọ kọmịshọna na-ahụ maka ọrụ na owuwe ọrụ n'Imo steeti bụ Ford Ozumba nke dị n'obodo Umuhu Okabia n'okpuruọchịchị Orsu, Imo steeti.
Ndị bi ebe ahụ na-achọghị ka akpọ aha ha kwuru na ndị omekome ahụ wụbatara n'ogige ụlọ Ozumba n'isi ụtụtụ Fraịde ma tụbanye ogbunigwe arụrarụ nke eji mmanụ ụgbọala rụọ n'ime ya bụ ụlọ.
Agbara ma na ya bụ mwakpo gbara akụkụ ụlọ ahụ ọkụ.
Nke a na-abịa dịka ọtụtụ mwakpo merela n'okpuruọchịọchị Orsu nke Imo steeti na nso nso a.
Orsu bụ ebe so n'akụkọ Imo steeti akụkọ mwakpo na-arị ibe ya elu.
Ndị ọrụ nchekwa nke gụnyere ndị uweojii Naịjirịa agbala mbọ ugboro ugboro inyochapụta ma gbaa n'anwụ ogige zoro ezo nke a sị bụ ebe ndị omekome a na-anọ mkpa nkata ọjọọ ha.
Mbọ niile BBC Igbo gbara ịnụ okwu ndị uweojii n'Imo steeti banyere mwakpo a, amịtaghị mkpụrụ ruo ugbua.
Kọmịshọna mgbasaozi na steeti ahụ bụ Declan Emelumba zara ekwentị ya mana ọ tịnyeghị ọnụ n'okwu gbasara ya bụ akụkọ.
Akụkọ ka na-abịa.
Anambra steeti ga-amachị ngagharị ndị mmadụ n'okpuruọchịchị anọ maka atụmatụ mkpocha na nzacha ezi
Bido n'ụbọchị Satọde bụ ụbọchị abụọ nke ọnwa Eprel, gọọmemtị Anambra steeti ekwuola na ha ga-amachị ngagharị ndị mmadụ ruo ụbọchị atọ n'okpuruọchịchị anọ na steeti ahụ maka atụmatụ mkpocha na nzacha ezi.
N'ozi osote gọvanọ Anambra steeti bụ Onyekachukwu Ibezim zipụtara, o kwuru na okpuruọchịchi ebe nke a ga-eme bụ Idemili North, Onitsha North, Onitsha South na Ogbaru, bido na elekere isii ụtụtụ ruo elekere anọ nke mgbede kwa ụbọchị.
O kwukwara na a ga-eme mkpocha na nzacha dị etu a n'okpuruọchịchị ndị ọzọ na steeti ahụ n'oge adịghị anya.
Ụgbọelu agha ga na-edu ụgbọoloko sị Abuja a ga Kaduna
Minịsta na-ahụ maka njem na Naijirịa bụ Chibuike Amaechi ekwuola na mgbe ụgbọoloko ga-ebido ịgba site Abuja gawa Kaduna, na ụgbọelu ndị agha ga na-edu ya.
Cheta na ndị omekome a na-akpọ 'Bandits' na bekee wakporo ụgbọoloko sị Abuja aga Kaduna n'ụbọchị mọnde, ha ji ogbunigwe gbarie igwe ụgbọoloko a na-agba n'elu ya, wakpoo ya bụ ụgbọoloko nke opekete mpe mmadụ asatọ nwụrụ na ya.
Amaechi kwuru na ya na onyeisi ndị agha elu enweela nzụkọ ma kwekọrịta na ha ga-eji ụgboelu agha edu ụgbọoloko na-eme njem site Abuja aga Kaduna tutu ruo mgbe ha hiwere igwe na atụmatụ nchekwa ndị njem ụgbooloko.
Ihe gọọmentị Naijirịa na-eme
Ndị omekome na-enye nsogbu na mpaghara ugwu nke gụnyere Kaduna, Naija na ụfọdụ ebe n'Abuja.
Ndị nchekwa na-agba mbọ ịhụ na ha kwụsịrị aka ọrụ ndịa dịka ha kwuru na ha gburu mmadụ iri atọ na anọ ndị omekome a mgbe ha wakporo ebe obibi ha n'ụbọchị Wenesde.
Mpaghara ugwu Naijirịa bụ ebe ụfọdụ otu nke gụnyere Boko Haram, ISWAP na ndị omekome na-enye nsogbu.
Nyocha nwata nwaanyị si n'ọnwụ bilie na mba Mozambik ga-ebido
Akụkọ sitere mba Mozambik na-ekwu na nwa agbọhọ aha ya bụ Eurelia Manuel Banjamin si n'ọnwụ bilie.
Ndị obodo ndị kwara ya ma lie ya na-ekwu sị, " Anyị akwaala ya ma lie ya dịka usoro obodo anyị siri dị, ọ meela abalị atọ eliri ya, anyị agaala ili ya ma enweghị onye metụrụ ya aka".
Kama Eurelia na-ekwu na ọ nwụghị anwụ kama na ọ gara na nke nwanna ya ịrụ ọrụ ugbo kamgbe ọnwa ole ma ole gara aga.
Ezịgala ndị ọkachamara gawa obodo Lindi ka ha nyochaa ihe mere na onye eliri.