Abuja-Kaduna Train Attack: A hụbeghi mmadụ 168 nọ n'ụgbọoloko si Abuja aga Kaduna

Oge e ji agụ akụkọ nkeji 10

Ka otu izuụka gachara a wakporo ụgbọoloko si Kaduna aga Abuja, ụlọọrụ Nigerian Railway Corporation ekwuola na a ka na-achọ mmadụ otu narị na iri isii na asatọ achọ.

Onyeisi ụlọọrụ a bụ Fidet Okhiria kwuru n'akwụkwọ ozi o wepụtara na Mọnde sị n'ime mmadụ 176 a na-achọ na a hụrụ ozu mmadụ asatọ n'ime ha nke mere ndị a na-achọ achọ ji dịrị 168.

Okhiria sị na ọnụọgụgụ ndị anyị a hụrụla dị ndụ ma nọrọ nke ọma eruola 186.

Ọ kọwara na ekwentị mmadụ iri ise na otu gbanyụrụ agbanyụ kamgbe ụtụtụ Tuzde ebe iri atọ naise n'ime ha na-akụ kama enweghị onye na-aza ha.

O kwuru na ya bụ akwụkwọ ozi ọ depụtara bụ iji gwa ndị Naijirịa ọnọdụ ọrụ ndozi ụgbọoloko AK9 sị aga.

O kwuru sị, " nkea a mere ya ọnụ ụgbooloko asaa anyị nweterela ma zịga n'ulọọrụ anyị, ọrụ idozi igwe ụgbooloko na-agba na-aga n'ihu".

Ihu mmadụ atọ nwụrụ mgbe awakporo ụgbọoloko si Abuja aga Kaduna

Ndị oyi ndụ egwu wakoro ụgbọoloko sị Abuja aga Kaduna n'ụbọchị iri abụọ na asatọ nke ọnwa Maachị a ma gbuo mmadụ atọ.

Ndịa liri ogbunigwe n'ụzọ igwe ụgbọoloko na-agba nke gbara ma mee ka ụgbọoloko a kwụsị.

Mmadụ atọ nwụrụla na ya bụ mwakpo bụ otu nwaanyị na ụmụ nwoke abụọ.

Lee ihe BBC Igbo ma maka ha.

Dkt Chinelo Megafu

Akụkọ na-efegharị na Soshal Midia na-ekwu na nwaada Chinelo Megafu nwụrụ n'ụgbọ oloko a ndị omekome wakporo dịka mgbọ egbe tụrụ ya.

Odeakwụkwọ ngalaba Nigeria Medical Association nke Kaduna steeti bụ Aisha Mustapha kwuru maka ọnwụ nwa agbọghọ a.

Otu a kwuru na Megafu bụ onye na-etinye uchu n'ọrụ ya.

Musa Lawal Ozigi

Ọkaiwu bụ Ozigi Musa Lawal na-arụ ọrụ dịka ode akwụkwọ otu Trade Union Congress (TUC) nke Naijirịa.

Onyeisi otu a bụ Quadri Olaleye kwuru maka ọnwụ ya.

O kwuru na ọ bụ mgbe ha na-eme njem maka nzụkọ ha nwere n'ụbọcxhị 29 nke ọnwa Maachị a.

Abdu Isa Kofar Mata

Abdu Isa Kofar Mata bụ kwa onye ọzọ nwụrụ na ya bụ mwakpo.

Ọ bụ nwanne ya nwoke nke ọbere kwuru na ọ bụ egbe ndị omekome a gbara Kofar gburu ya.

A na-echeta ya dịka onye ọ na-amasị ịnyere ndị mmadụ aka.

Ndị merụrụ ahụ

Nuhu Danja

Danja na-arụ ọrụ dịka Kọmịshọna Ahụike Katsina Steeti sọ na ndị merụrụ ahụ dịka mgbọ egbe tụrụ ya.

Ibrahim Almu Gafai nke ụlọọrụ na-ahụ maka ahuike gwara ndị ntaakụkọ na epepụla Danja mkpịsị ụkwụ abụọ maka mgbọ gbatara ya.

Ibrahim Wakkala

Ibrahim Wakkala bụ onye ruburu ọrụ dịka osote gọvanọ Zamfara Steeti so na ndị merụrụ ahụ na ya bụ mwakpo dịka mgbọ egbe metụrụ ya n'ụkwụ.

Onye enyemaka ya pụrụiche bụ Yusuf Idris kwuru na ọ bụ n'ụkwụ ka agbatara ya egbe, ma sị na ọ na-anata ọgwụgwọ n'ụloọgwụ.

Atụmaatụ gọọmenti Naịjirịa wepụtara maka mwakpo mere n'ụgbọoloko Abuja-Kaduna

Ụlọomeiwu ukwu Naịjirịa akpokuola ndị agha Naịjirịa ka ha jiri ngwa agha gọọmenti wepụtara wee buso ndị oyi ndụ egwu agha na mpaghara ugwu Naịjirịa.

Ha katọrọ mwakpo mere n'ụgbọoloko bu mmadụ otu puku si Abuja aga Kaduna ma na-ekwu ka ndị ọrụ nchekwa chụwa ndị omekome ma memina ya.

Sinetọ Uba Sani bụ onye tụpụtara atụmaatụ iji ngwa agha memina ndị omekome kwuru ka emewe ya ozugbo ozugbo.

Ndị ụlọomeiwu kwukwara na ha o na-ewute ha na ọnụọgụ ndị ọrụ nchekwa nọ n'okporoụzọ Abuja- Kaduna pere mpe.

Sani kwuru mkpa ọ dị ka echekwa ndụ na akụ na ụba ndị mmadụ dịka iwu Naịjirịa si nye.

Sani kwuru na ọ bụghi mbu ndị ụlọomeiwu na-ewepụta atụmmatụ a ma na etinyebeghị n'uchu, "ọ bụrụ na ọ dabaghị si wete atụmatụ ọzọ." dịka Sani si kwu.

"Anyị ekpebiela ka akpọghachị ndị isi ọrụ nchekwa ka gwa sineti ihe mere ha achọghị ịtụpụta atụmaatụ ọzọ maọbụrụ na nke ahụ adabaghị."

Sani kwuru na ọ ga-adị mma ka gọọmenti wepụta ndị uweojii nke steeti makana ọ ga-enye aka n'iwulite nchekwa n'ebe ndị ọzọ ndị oyi ndụ egwu na-enye nsogbu.

Ihe osote onyeisiala Naịjirịa kwuru maka mwakpo a

Osote onyeisiala Najiria bụ Yemi Osinbajo depụtara n'akara Instagram ya na ndị otu Federal Executive Council akpọrọ FEC n'ịchafụ dere duu ruo otu nkeji iji kwanyere ndị niile nwụrụ na mwakpo ahụ mere n'ụgbọloko Abuja-Kaduna.

Cheta na ọ gara ịleta ndị awakporo n'ụgbooloko sị Abuja gawa Kaduna nọ n'ụlọ ọgwụ na Kaduna Steeti.

Osinbanjo katọrọ ya bụ mwakpo ma sị na ọgaghị egbochi gọọmentị ịmemila ndị omekome na-akpa mkpa mkpa a.

A gbagburu dọkịta Chinelo Megafu n'ụgbọoloko Abuja-Kaduna

Akụkọ na-ewu na soshal midia ugbua bụ maka dọkịta Chinelo Megafu onye ndị mmadụ na-ekwu na ndị omekome gbagburu n'ụgbọoloko bu ihe ruru mmadụ 1000 si Abuja aga Kaduna, n'abalị 28 nke ọnwa Maachị 2022.

Otu onye ụlọọrụ Megafu ji aha @the_beardedsina nọrọ na Twitter, depụtara na nwa ada a bụ ezigbo dọkịta were ndụ ya rụọọrọ Naijirịa ọrụ nke mere ka o rite nturugo.

O gosikwara nturugo ahụ n'akara Twitter ya ma na-akwa arịrị na ezigbo ihe danarịrị mba Naịjirịa taa.

Ihe ikpeazụ Chinelo depụtara n'akara Twitter ya bụ na o so n'ụgbọoloko ahụ a wakporo nakwa na agbaala ya egbe, ka ụwa kpewere ya ekpere.

Mana ndị mmadụ nọ na-akwa ya emu na-ajụ ma Megafu o chere na ọ ga-arafụ ndị mmadụ site n'idepụta ozi ha che bụ ụgha.

Ka ndị ọyị Megafu wepụtara ozi na ọ nwụọla, ndị ahụ kwara ya emu mgbe o deputara na agbaala ya egbe, bidoro wepụwa ozi ịkwa emu ahụ ha dere na Twitter.

Ruo ugbua, ngalaba Nigeria Medical Association (NMA) nke Kaduna azabeghi ozi BBC zigara ha ịji nụta maka ikwuputa maka ọnwụ Megafu na etu o si metụta ha.

Onye ọzọ ji aha Steph Adamu nọrọ na Twitter depụtara na Chinelo na-arụ n'ụlọọgwụ St Gerald dị na Kaduna steeti, edekọchaala akwụkwọ ya iji gaa mba ofesi.

Adamu depụtakwara na ọ gbara arụkwaghị m n'ọnwa gara aga ka o wee hapụ Naịjịrịa n'ụbọchị Fraịde na-abịa.

Osinbajo na El-Rufai agaala leta ndị merụrụ ahụ n'ọdachi ụgbọoloko na Kaduna

Osote onyeisiala Naịjirịa bụ Yemi Osinbajo na aka na-achị Kaduna Steeti bụ Nasir El-Rufai agaala njem nleta n'ụlọọgwụ ebe e bugara ndị merụrụ ahụ na mwakpo ụgbọoloko si Abuja aga Kaduna n'ụbọchị Mọnde.

Osinbajo kwesịburu ịbịa Legọs isonye n'emume ncheta ọmụmụ aka chịburu steeti Legọs bụ Bola Tinubu, mana ọ kagburu njem ahụ, gawa Kaduna.

N'otu aka ahụ kwa, Bola Tinubu kagburu emume ncheta ọmụmụ ya gaara ịdị na Legọs, iji kwanyere ndị tufuru ndụ ha n'ọdachi ahụ ugwu.

Osinbajo na El-Rufai gara n'ụlọọgwụ ndị agha a na-akpọ 44 Military Hospital ebe ha nọrọ kasie ndị niile ya bụ ihe metụtara obi.

Ihe anya anyị hụrụ mgbe a wakporo ụgbọoloko anyị si Abuja gawa Kaduna

Ụfọdụ ndị nọ n'ime ụgbọoloko ahụ a wakporo mgbe o si Abuja gawa Kaduna akọwaala ihe mere na njem ahụ.

Otu nwoke bụ Shehu Isa gwara BBC Pidgin sị ụgbọoloko ahụ hapụrụ n'elekere isii nke mgbede na ihe niile na-aga ọfụma mana mgbe ha ruru ebe a kpọrọ Dutse-Kakau ha nụrụ ụda ogbunigwe nke mere ụgbọ ahụ jiri na-ama jijiji.

"Mụ na onye nọ m n'akụkụ na-akpa nkata mana mgbe o mere, anyị makpuru n'ala ụgbọoloko ahụ."

Isa sị na o teghi aka ha malite ịnụ ụda egbe agharaghara.

"Eji m anya hụụ ọtụtụ ndị mgbọ egbe tụrụ, ụnyaahụ bụ nnukwu ụbọchị ịzọ ndụ nyem."

Anyị anaghị e si n'okporoụzọ eme njem n'ihi egwu enweghi nchekwa mana ugbua ọ bịakwutela anyị n'okporo ụgbọoloko.

Onye ọzọ dere ihe n'akara Facebook ya kwuru na ogbunigwe ndị a tụrụ abụghị nke obere ya dịka o tipịara injine ụgbọoloko ahụ.

Ihe ọkammụta n'ọrụ nchekwa kwuru maka mwakpo a

Aliyu Umar Babangida bụ ọkammụta n'ihe gbasara nchekwa akatọla mwakpo awakporo ụgbọ oloko bu mmadụ 1000 si Abuja gawa Kaduna ụnyahụ bụ March 28,2022.

Ọkamụta Aliyu kwuru na nwakpo a na-eme na Kaduna kwa mgbe kwa mgbe gosiri na gọọmenti etiti achọghi ịgwa onwe ha eziokwu.

N'ọnụ ya, " oye ahụ nọ ebe ọ nọ na-arịọ ka emere ndị omekome a ebere bụ ndị na-akwado mwakpo niile a."

"O na-ewute m na anwụchịbeghị udiri ndị a mana ọ gaghị eme m ka m kwụsị ikwu okwu etu a ga-esi kwụsị mwakpo ndị a"

"Ndị a na-akpa mkpa mkpa a adịghị ka ndị na-anata ndị ha tọrọ ezigbo ego, kedụ ka mmadụ ga-esi na-anata ndị mmadụ n'ike ego ruru ijeri ijeri ma ka na-anọ n'ọhịa , ọ bụ na ịhụghị na ọgbaghị aka?"

Aliyu kwuru na ọ bụ ndị nọ n'ọchịchị ka ụta diri maka mwakpo a na-aga n'ihu makana ha chere na ihe agaghị emebi gawa n'ihu.

"Ha pụta ha na-asị ka ewebatakwa ndị a n'obodo, ọ bụ obodo ebe ha gbuchara ndị mmadụ, gbuo umu, di maọbụ nwunye ha ka a ga-ewebatakwa ha?"

Gịnị ka ndị omekome na-ede na Kaduna?

Mwakpo na-eme na Kaduna kwa mgbe kwa mgbe emeela ka ọtụtụ mmadụ na-ajụ ihe mere o jiri bụrụ ebe ahụ ka mwakpo na-emekarị na nso nso a.

Ọkamụta Umar kwuru na ihe kpatara atụmaatụ ahụ si n'aka ndị omekome na Kaduna ji aga n'ihu bụ na anaghị ata ha ahụhụ diri ha nke ga-eme ka ha ghara ịnwa mwakpo ahụ ọzọ.

N'ọnụ ya, "mgbe ndị omekome wakporo ụlọrụ Nigeria Defence Academy ha nara ije, ha si ya gaa wakpo ọdọụgbọelu dị na Kaduna, ugbua ha awakpola ụgbọ oloko. Ihe na-aka ha obi bụ na anaghị achọpụta ha maọbụ taa ha ahụhụ ga-eme ka ha kwụsị ya bụ mwakpo"

Kedụ ka a ga-esi kwụsị mwakpo a?

Aliyu kwuru na otelarịị o ji tụpụta alo nye gọọmenti dịka onye agha lagoro ezumike nka nakwa ọkammụta n'ihe gbasara gọọmenti mana o nwebeghị nke ọ hụrụ ha tinyere n'uchu.

O kwuru na ọ ga-adị mma ka gọọmenti nwe anya ụgọ ga-adị n'elu na-ele gburugburu Naịjirịa niile tụmadị ebe mwakpo a mere.

Anya ugo ahụ ga dịka igwe na-esete onyonyo ga-enye aka ka a chọpụta ndị omekome a n'ebe nzuzo ha maọbụ jide tupu ha akpa arụ ọbụla na Kaduna steeti nakwa ebe ndị ọzọ dị iche iche n'ala Naịjirịa.

Mgbe ọzọ awakporola ụgbọoloko si Kaduna aga Abuja

Nke a abụghị nke mbụ a na-awakpo ụgbọoloko si okporo Kaduna gawa Abuja.

Ndị njem nwere olileanya na okporo ụgbọoloko nwere nchekwa karịa okporoụzọ ọkachasị nke a si Kaduna gawa Abuja.

N'ọnwa Ọktoba 2021, ụfọdụ mmadụ wakporo ụgbọoloko si Kaduna na-aga Abuja.

N'ọnwa Sepụtemba 2020, ụgbọoloko ọzọ si Abuja na-aga Kaduna banyere n'aka ndị mwakpo, ndị njem nụrụ ụda egbe mana ndị uweojii na Kaduna sị na ọ bụ ogwute ka a tụrụ n'ụgbọoloko ahụ.

N'ọnwa Jenụwarị 2020, nke ọzọ mere n'ọdọụgbọoloko dị na Katari (ji kilomita 70 dị nso n'Abuja), ndị njem nụkwara ụda egbe.

Uru okporo ụgbọoloko si Kaduna gawa Abuja bara

Ọ naanị otu okporo ụgbọoloko jikọrọ Abuja na steetị ndị dị mpaghara Ndịda-Ugwu.

Onyeisiala Muhammadu Buhari gbapere ya n'ụbọchị 26 Julaị, 2016 mgbe ọtụtụ na-achọ ịgbahapụ okporoụzọ maka ntọrị ndị mmadụ.

Ụfọdụ ndị na-enwe egọ ịgba ụgbọelu na-eji ụgbọoloko eme njem.

Kedụ etu ihe a si mee

Akụkọ na-ekwu na-atọrọla ọtụtụ mmadụ na-eme njem ebe egburu otu onye n'ụgbọ oloko si Abuja aga Kaduna na mgbede Monde.

Anya hụrụnụ na-ekwu na ya bụ ụgbọ oloko si n'okporo ya fepụ mgbe ihe ana amaghị gbawara na ya bụ ụgbọ oloko.

Akụkọ kwuru na e nwere ndị nwụrụ mgbe ọdachị a mere ma nwekwa ndị merụrụ ezigbo ahụ.

A wakporo ụgbọ oloko ahụ bu mmadụ otu puku (1000) n'elekere asatọ nke mgbede ụnyahụ bụ March 28, 2022.

Ndị na-eme njem nakwa ufọdụ ndị ezinaụlọ ha gwara BBC na ọdachị a abụghị obere ihe nakwa na ha amabeghị kpọmkwem mmadụ ole ihe a metụtara.

Otu onye na-eme njem kwuru na mgbe ụgbọ oloko ahụ kwụsịrị na ndị oji egbe gbara ya okiri okiri ma gbawa egbe .

N'ọnụ ya, 'ndị mmadụ tukwuru ala ma chọwa ebe nzuzo dịka ndị omekome kpudewere nso n'ụgbọ oloko ahụ, gbawa ndị mmadụ egbe ma tọrọ mmadụ olemole agụtaghị ọnụ ."

" Anyị na-aga ụzọ nụ ihe gbwaranụ , dịka ogbunigwe ma nụkwa ụda egbe , ndị na-eche ụgbọ oloko anyị nche nakwa ndị omekome ahụkwakọrịtara mgbọ mana chukwu zọrọ anyị bụ na ndị nchekwa ekweghị ka ndị omekome napụ ha ike mana ndị omekome torọ ụfọdụ ndị mmadụ n'ụgbọ ooko ahụ." dịka o siri kwuo.

Onye ọzọ hụrụ mgbe ọdachị a mere kwuru na enwere ndị nwụrụ n'ọdachị a.

Kọmishọna na-ahụ maka nchekwa ime obodo na Kaduna bụ Samuel Aruwan kwuru n'akwụkwọ ozi o depụtara na e zipụla ndị agha ka ha ga gbapụta ndị ahụ na-eme njem n'ụgbo oloko a ma buga ndị merụrụ ahụ n'ụlọ ọgwụ dị nso maka nleta ndị ọrụ ahụike.

Ọ bụkwa maka ọtụtụ mwakpo na ntọrọ na-eme n'okporoụzọ Abuja- Kaduna mere ka ọtụtụ mmadụ na-ejizi ụgbọ oloko eme njem.

Mana nke a bụ mwakpo nke abụọ n'ụgbọ oloko na Naịjirịa dịka ọnwa isii gaferela.

Kedụ ihe ndị Nigerian Railway Corporation kwuru?

Ndị ụlọorụ Nigerian Railway Corporation ekwubeghi ihe ọbụla banyere ya mana onye chọrọ ịzụ akwụkwọ njem ha na-ezitere onye ahụ ozi.

Ozi sị "biko onye njem, n'ihi ọnọdụ dị aṅaa e mechiela njem ụgbọoloko si Kaduna gawa Abuja ruo mgbe a na-amaghị.

Akụkọ ụgha so n'ihe mberede a

Otu n'ime akụkọ ụgha gbapụtara ihe n'okwu mwakpo a bụ nke metụtara Obi nke Onicha bụ Igwe Nnaemeka Achebe.

Akụkọ malitere iwu na Igwe Achebe sị na ọ bụ ekwentị ọ zara mere ọ banyeghi n'ụgbọoloko a a wakporo.

Ọtụtụ ụlọọrụ mgbasaozi na Naịjirịa bucha akụkọ ahụ mana o nweghi onye maara kpọkwem ebe akụkọ ahụ si pụta.

Mana obi ọchịchị Igwe Achebe wepụtara akụkwụkwọ ozi sị na nke ahụ bụ asị na o nweghi mgbe Igwe Achebe jiri kwuo ihe dị etu ahụ.

Akwụkwọ ozi ahụ sị n'ezie na e nwere ọgbakọ Igwe gara na Jaji dị na Kaduna n'ụbọchị ahụ, mana ọ lọghachitere n'Abuja na-enweghi nsogbu ọbụla.