You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.
Ụgbọ oloko egbuola mmadụ atọ na London
Mmadụ atọ nwụrụ tata ka ụgbọ oloko kwọrịrị ha n'ebe adịghị anya na ọdọ oloko nke London.
A na-eche na ndị a nwụrụ ga-adị afọ iri abụọ na mmanye. Ahụkwara okpokoro ihe eji agba "paint" na ngụ ozu ndị a nwụru.
Akpọrọ ndị uweojii na "Loughborough Junction", na gbụrụgbụrụ Brixton ka ọ na-akụ elekere 07:30 nke ụtụtụ tata.
Ndị ọrụ gbata gbata kwukwara na ha anwụọla mgbe ha ruru ebe ahụ.
Ndị uweojii na-enyocha ihe etu ndị nwụrụ siri ruo ebe ahu ha nọ nwụọ, ma na-ekwukwa na ha aghọtaghị ihe gbụru ha.
Supt Matt Allingham, bụ onye uweojii njem nke akpọrọ "British Transport Police" (BTP), kwuru na ahụ ndị a "dị ka ahụ ndị ọgbọ oloko kụrụ".
O kwuru na ọ bụ onye na-anya ụgbọ oloko ọzọ hụrụ ozu ụmụ nwoke ahụ were kpọ ndị uweojii. O kwukwara na "otela ndị ahụ nwụru tupu ahụ ha".
"Anyị ka na-achọ ịchọpụta ụgbọ oloko gbụrụ ndị a nwụrụ," Supt Allingham kwuru.
Ndị uweojii n=ka nọ ebe ahu ihe a mere na-acho ịchọpụta aha ndị nwụru ma gwa ndị nwe ha.