You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.
Ihe ruru mmadụ 257 anwụọla na mberede ụgbọelu n'Algeria
Ndị ọrụ mịnịstrị na-ahụ maka nchekwa n'Algeria kwuru na ihe ruru mmadụ 257 nwụrụ n'ihe mberede ụgbọelu ndịagha mere taa.
Ha kwuru na ndị ahụ nwụrụ nọ n'ụgbọelu na-ebu ndị agha tupu ụgbọelu ahụ akpọkasịa taa.
Ọtụtụ ndị nwụrụ bụ ndị ọrụ agha na ezinaụlọ ha. Mmadụ iri bụ ndị na-arụ ọrụ n'ụgbọelu ahụ.
Amabeghị ihe butere ụgbọelu a ji kpọkasịa, mana onyeisi na-achịkọta ndị agha enyela iwu sị nyochapụta ihe butere mkpọkasị a.
Nke a bụ mkpọkasị ụgbọelu kacha gbuo mmadụ kamgbe Julaị 2014, oge mmadụ 298 nwụrụ n'ihe mberede ụgbọelu Malaysian Airlines nke MH17, oge agbaturu ya na mpaghara ọwụwa-anyanwụ Ukraine.
Ọ bụkwa mkpọkasị ụgbọelu nke abụọ kacha gbuo ndị mmadụ kamgbe afọ 2003.
Ndị ọrụ gọọmentị na-agba mbọ ịhụ na achọpụtara ndị nwụrụ.
A na-ahụ ka ahụrụọkụ si n'ụgbọelu ahụ apụta.
Ụgbọelu ahụ bụ nke Ilyushin Il-76, nọ na-aga obodo Bechar dị na mpaghara ọdịda-anyanwụ Algeria tupu ihe mberede a emee.