Lee etu ụgbọoloko mbụ si siri Kogi gaa Warrị ụnyaa

Oge e ji agụ akụkọ nkeji 2

Onye na-ahụ maka mkparịtaụka nke ọgbara ọhụrụ n'ọchịchị onyeisiala Buhari bụ Tolu Ogunlesi egosila ụfọdụ ihe onyonyo gosiri ebe ụgbọoloko si Itakpe gawa Wọrị.

N'okwu ya n'akara ya na twitter, o kwuru na oge a rụsịrị ya bụ ụzọ, a ga-esi Kogi gaa Wọrị gafee Ajaokuta, Uromi, Agbọr na Braka.

O kwuru na ha banyere ụgbọoloko ahụ buru ụzọ kwụsị n'Ajaokuta.

Ha ruru na Wọrị ebe njem ha jedebere. O kwuru na ọ tụrụ ya n'anya na njem ahụ gara nke ọma ma bụrụ ihe nyere ya afọ ojuju.

Samuel Ovbigho Omogor na Facebook tinyere ihe onyonyo ọ sị bụ mgbe ụgbọolokp a batara Warri.

Ụfọdụ ndị mmadụ nọ na twitter kelere atụmatụ ahụ ebe ụfọdụ na-enyo ya enyo ka ọ bụ ezie.

Tesleem lawal kwuru na nke a ga-eweta ọrụ ma weta mmepe n'obodo.

Ụfọdụ n'ime ụgbọoloko a so na ihe onyeisiala Buhari kwere na nkwa oge ọ na-azọ ọchịchị n'afọ 2015 nke ndị ọchịchị buru ya ụzọ bidoro ma hapụ ya.

E kwuru na a rụchaala nke Abuja-Kadụna nke ụfọdụ ndị mmadụ jizi eme njem ugbua.

BBC Igbo gbara Eghosa Emasuen bu onye ode akwụkwọ ajụjụ maka ihe mere.

Emasuen, bụ onye toro na Warri, kwuru na obi dị ya ezigbote ụtọ "maka o teela e bidoro ruwa ụzọ ụgbọoloko a."

O kwuru na e bidoro atụmatụ a ka e si Wọrị na-ebu ngwaọrụ site n'ụlọọrụ Delta Steel Company ga Ajaokuta, ebe ụlọọrụ na-emepụta igwe dị.

Emasuen kwukwara na etu e si haziagharịa ụzọ ụgbọoloka ka ọ bụrụ nke na-ebu mmadụ na ngwaahịa dị mma.

BBC Igbo gbara mbọ inweta ndi gọọmentị ka ha kwuo uche ha n'ihe a mere, mana azaghị ekwenti ndị anyị kpọrọ.

Cheta na e bidoro ịrụ ọrụ n'ụzọ ụgbọoloko a n'afọ 1987 mana ọrụ kwụsịrị ka ọ fọrọ obere ka a rụcha ya.

Akụkọ ga-amasị gị: