Imo State attacks: Etu esi wakpoo ụlọ ma gbuo onye ndọrọndọrọ ọchịchị n'Imo Steeti

Oge e ji agụ akụkọ nkeji 1

Akụkọ na-apụta na-ekwu na ndị amabeghị ndị ha bụ gbara ọtụtụ ụlọ ndị a ma ama ọkụ n'Imo steeti.

Ndị ahụ gụnyere Ekene Nnodimele na-anọchite anya Orsu n'ụlọmeeiwu nke steeti ahụ nke ha gburu onye nche na be ya.

Nke ọzọ bụ Okaiwu COC Akaolisa bụ ọkaiwu kachasị n'Imo steeti.

Dịka akụkọ anyị nụrụ kwuru, ihe a mere n'ebe elekere otu nke etiti abalị.

Onye ọzọ ihe a metụtara bụ Chiozie Nndoim a ma dịka 'Stainless' bụ PG obodo Amaebo dị n'okpuruọchịchị Orsu n'Imo steeti.

Onye ntaakụọ BBC gara ebe ahụ chọpụtara na e gburu otu nwoke bụ Ugochukwu Enebo bụ otu onyeisi n'otu APC na steeti ahụ.

Lee ihe ndị ọzọ ọ chọpụtara mgbe ọ gara ebe ihe mere.

Ndị uweojii na steeti ahụ kwuru na ọ fọrọ obere ihe ka ha nwụchie ndị kpara mkpamkpa a ma kwukwa na ọ bụ ihe ndọrọndọrọ ọchịchị butere.