Nnewi South LGA Attack: "Anyị agaghị ekwe ka ndị ekperima na-adọghachiri anyị aka elekere azụ" - Soludo

Aka na-achị Anambra steeti bụ Chukwuma Soludo agaala njem nleta n'isi ụlọọrụ Nnewi South ebe ahụ ndị ekperima wakporo n'abalị Wenezde, Maachị 30, ma gbaa ya ọkụ.

Soludo kwuru na ihe dị otu a bụ arụ kwọ nwa n'azụ, "ọ bụghịkwanụ ihe e ji mara anyị."

"Ndị Anambra agaghị ekwe ka ndị ekperima olemole na-adọghachiri anyị aka elekere azụ," Soludo kwuru.

"Anyị ejiri otu obi kwekọrịta na anyị ga-eme ka udo na ndokwa chịa n'ala anyị, onweghị ụdị mbibi ọbụla nwere ike ịkwụsị anyị."

Soludo gara n'ihu kwuo sị: "Oge m na-ele anya n'ụlọ na ihe ndị ọzọ lara n'iyi na mbibi a, ajụjụ m jụrụ onwe m bụ,"onye ka ọghọm dịịrị?"

"Ego a gaara iji rụọ ọrụ ma wulite ndụ ndị nkịtị na-akwụ ụtụ isi ha n'obodo, ya ka a ga-eji ugbua doziwe ụlọ na ihe niile ndị a e mebiri."

"Enweghị ka anyị ga-esi gaa n'ihu n'ụzọ dị otu a."

Etu ndị 'unknown gunmen' si gbaa isiụlọọrụ Nnewi South ọkụ, gbuo otu nwoke

Ndị omekome bu egbe agbalal isiụlọrụ Okpuruọchịchị Nnewi-South dị n'Ụkpọ, Anambara steeti ọkụ ma gbuo onye nche nọ ọrụ n'ogige ụlọọrụ ahụ n'ụzọ ụtụtụ Tọzde.

Ụkpọ bụ obodo Mbazulikie Amaechi, okenye Igbo nwere agba bụbụ Minista njem ụgbọelu n'oge ọchịchị Shehu Shagari ma bụrụkwa onye du ndị Igbo ndị ọzọ wee agba gaa Abuja ịrịọ onyeisisala Muhammadu Buhari arịrịọ ka a tọhapụ onye ndu otu Ipob bụ Nnamdi Kanu na mkpọrọ DSS e tinyere ya kemgbe ọnwa Juun afọ 2021 a nwuchiri ya na mba Kenya.

Onye nọ nso ebe ihe mere kwuru na ndị bu egbe a maghị ndị ha bụ wakporo ogige ụlọọrụ ahụ n'ụzọ ụtụtụ Tọzde,

Onyeisioche Okpuru Ọchịchị Nnewi-South bụ Hon. Chieloka Okoye gwara BBC Igbo na ya bụ ihe mere n'ebe Elekere 12.30 nke isi ụtụtụ Tozde.

Okoye kwuru n'ezie na "ọ bụ ndị bu egbe a maghị ndị ha bụ" (unknown gunmen).

O kwuru na ndị nọ nso gara ịgbanyụ oku chee na ọ bụ ọkụ nkịtị mana ka ha rutere, ha hụrụ ọgbatumtum e dọtachara, dịka ha na-echezi etu ndị dọsara na gburugburu ebe ahụ.

Ndị ahụ malitere gbawa ha egbe ha were mata na ọ bụ ha sunyere ọkụ ahụ.

O kwuru na ndị omekome ahụ gbagburu otu onye nche nọ ọrụ n'ụlọọrụ ahụ.

Mbọ BBC Igbo gbara ịnata ozi ndị uweojii Anambara steeti amịtaghị mkpụrụ.

Ọnụ na-ekwuru ndị uweojii Anambara steeti bụ Tochulwu Ikenga asaghị okwu ka a kpọrọ ya n'ekwentị, nke ọ na-asa ozi e zigara ya n'igwe okwu 'Whatsapp' dịka a na-ewepụta akụkọ a. yo ya oge

Ọdachi na-abịa babalị ole na ole gọvanọ ọhụrụ Anambara steeti kpọrọ otu Ipob oku ka ha dajụụ ma kwado mmepe obodo na steeti ahụ ma kwe nkwa inye aka maka ntọhapụ onye ndu ha bụ nnamdi Kanu.

Kemgbe Januwarị afọ 2021, tigbuo-zogbuo gunyere izunye ụlọ ọkụ, oke ogbugbu ndị mmadụ gụnyere ndị ọrụ nchekwa, ọkachasị ndị uweojii na ndị andị Igbo nwere agba na-arị elu n'Ọwụwa Anyanwụ.

Ndị uweojii Naijiria na -ekwu aka na ọbụ otu nnwereonwe Biafra a kpọrọ Ipob na alaka ọgụ ha bụ ESN bụ ndị na-akpa mkpamkpa ndịa mana otu Iponb agọola ugboro ugboro na aka ha dị ọcha.