Etu ndị 'unknown gunmen' si gbagbuo nwaokorobịa ga-agba akwụkwọ n'ọnwa ọzọ

Ndị bu egbe amabeghị ndị ha bụ agbagbuola otu nwoke n'Ọnicha, Anambara steeti, n'ụbọchị Sọnde, abalị iri abụọ naasatọ nke ọnwa Maachị 2022.

E gburu Kingsley Anyalechi a ma dịka KC' oge o si ebe ọ gara mmemme agbamakwụkwọ kwọrọ ụgbọala ya n'ala.

Akụkọ kwuru na ndị omekome ahụ dọpụtara ya n'ụgbọala ya gbagbuo ya, buru ụgbọala Venza ya gbalaga.

Mana ndị uweojii Anambra steeti kwuru na ha anụbeghị maka ihe a merenụ.

Dịka ndị ma nwa amadi ahụ si kwuo, Kingsley na-akwado agbamakwụkwọ n'ọnwa Eprel afọ 2022, tupu ọdachi a dakwasa ya.

Otu enyi ya bụ Kelvin Alanaeme depụtara n'akara facebook ya na Kingsley kwesịkwara ịga ala Bekee maka Masters n'ọnwa Septemba afọ a.

"N'afọ gara aga, o nwetara ohere ịgụ 'Masters' n'ofesi n'ọnwa Septemba mana o yigharịrị ya ruo afọ a, mana ugbua, Naịjirịa emeela ya," Alaneme, onye bụkwa dọkịta, dere.

Ihe anyị ma maka Kingsley Anyalechi

  • Ọ gụrụ akwụkwọ Sekọndịrị na 'Federal Government College' Nise, Anambra Steeti.
  • Ọ gụrụ mahadum na Mahadum Imo Sta Steeti dị n'Owere
  • Ọ nwetara ọzụzụ na ngalaba sayensị nnyocha ahụike, nke bekee kpọrọ 'Medical Laboratory Science.
  • O nwere ụlọahịa ebe a na-ere ọgwụ nke a na-akpọ 'pharmacy' na bekee.
  • Ọ bụ onye Umuobom n'Imo steeti, dịka ihe o depụtara n'akara Facebook ya n'oge gara aga si gosi.

Ihe ndị mmadụ na-ekwu maka ọnwụ kịngsley Anyalechi

Dọkịta Alaneme kọwara Kingsley Anyalech dịka nwoke na-agba mbọ, na-emere onwe ya ọfụma, tupu o zute ọdachi a tara isi ya.

Ihe ndị uweojii kwuru banyere ọnwụ Kingsley Anyalechi

Oge BBC Igbo kpọrọ ndị uweojii Anambra steeti. ọnụ na-ekwuru ha bụ Toochukwu Ikenga kwuru na ha anụghị maka nke a.

Ọ gwara onye ntaakụkọ anyị ka o zitere ya akara ebe e depụtara ya bụ akụkọ. Anyị mere nke.

Ikenga mechara zighachite ozi sị: "Enwetaghị m ụdị ozi ọbụla. Ndị uweojii, ndịagha na ndị ọrụ nchekwa ndị ọzọ jịkọrọ akpa kpagharịa n'ọnịcha niile ụnyaahụ (Mọnde, Maachị 28)".