You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.
'Unknown Gunmen' egbuola otu 'inspector' na mwakpo isi ụlọọrụ ndị uweojii n'Umuahia
Ndị omekome nwara ịwakpo ọdọ ndị uweojii a na-akpọ 28 Mobile Force n'Umuahia egbuola otu onye uweojii n'ụtụtụ Mọnde.
Atụmatụ ndị omekome ịbanye n'ime ọdọ ndị uweojii ahụ gbara ọnyụpa dịka ndị uweojii chụpụrụ ha.
Ọnụ na-ekwuru ndị uweojii n'Abịa steeti bụ Geoffrey Ogbonna, gwara onye ntaakụkọ BBC na ọ bụ n'isi ụtụtụ, dịka ọ na-akụ elekere otu, ka ndị a bịara njem a.
Ogbonna sị; "Ndị a ji n'abalị bịa mana ndị uweojii dị njikere mere ha jiri chụlaa ha."
Onye ntaakụkọ BBC gbara mbọ ịbanye n'ebe ahụ e mere mwakpo ahụ mana ndị uweojii gbachichara ebe ahụ nke mere na ọ hụghị ohere ọ ga-eji banye.
Mana, ndị uweojii kwuru na ọ bụ ụgbọala bekee na-akpọ "gun truck" ka ndị omekome a ji bịa, ma kwukwaa na ọ bụ uwe ndị agha ka ha yi n'oge ha na-eme mwakpo a.Ndị uweojii Abịa steeti sị ka ndị mmadụ gbaara ha ama maka ndị a ha sị na ụfọdụ n'ime ha bu mgbọ egbe ndị uweojii gbara ha gbalaga.
Ebe a ndị omekome a wakporo dị nso n'isi ulọọrụ ndị uweojii n'Umuahia nke Bekee kpọrọ Command Headquarters.
Abịa Steeti dị n'Ọwụwa Anyanwụ Naịjirịa bụ ebe ndị omekome amabeghi ndị ha bụ na-awakpo, na-egbu ndị uweojii ma na-agba ụfọdụ ụlọọrụ gọọmentị ọkụ kemgbe Ọktoba nke afọ 2020.