Etu ndị a sị bụ ndị ‘unknown gunmen’ si wakpoo ahịa Nkwo Inyi n’Enugu steeti

Akụkọ si Enugu steeti pụta taa bụ Mọnde ụbọchị iri abụọ n'otu nke ọnwa Maachị na-ekwu na ndị o ji egbe amaghị ndị ha bụ wakporo otu ahịa n'obodo Inyi dị n'okpuruọchịchị Oji River n'Enugwu steeti.

Ihe onyonyo na-efegharị na soshal midia gosiri etu ọnọdụ ahịa ahụ dị dịka ndị a eboro ebubo na ha bụ ndị 'unknown gunmen' wakpochara ahịa ahụ.

Ihe onyonyo ahụ gosiri ebe a sị ndị omekome ahụ gbara ụgbọala na ọgba tumtum ọkụ ụfọdụ ọkụ ma gbakwa ụlọ ndị nọ ebe ahụ ọkụ.

N'ihe onyonyo ahụ ọtụtụ ụlọ ka agba ọkụ ebe anwụrụ ka na-apụ n'elu ụgbọala ndị gbacharala ọkụ ebe ahụ. Olu ndị nọ n'ihe onyonyo ahụ bụ ndị ka nọ na-agba mbọ ịmenyụ ọkụ na-agba ebe ahụ gbara ama na ya bụ ebe bụ Inyi nke Oji River, Enugu steeti.

Otu onye bi ebe ahụ na-achọghị ka akpọ aha ya kwukwara na ya bụ ihe mere n'ahịa Inyi ma kọwa etu mkpamkpa a si tinye egwu n'obodo ha.

Ụbọchị Mọnde nke taa a bụ ụbọchị ahịa nkwọ nke bụ na ahịa ahụ mepere emepe.

Cheta na n'ụbọchị Mọnde kwa izu ndị bi na ọwụwa anyanwụ na-eji ụjọ anọ n'ụlọ ha maka iwu onye nọrọ n'ụlọ akpọrọ 'sit-at-home'.

Malite ọnọdụ ịnọ n'ụlọ a si n'aka iwu otu Indigenous People of Biafra (Ipob) tiri n'afọ 2021 gwaa ndị mmadụ ka ha nọrọ n'ụlọ kwa Mọnde nakwa ụbọchị ọbụla ekpere ikpe onye ndu ha bụ Nnamdi Kanu dịka gọọmentị Naịjirịa nwụchịrị n'ọnwa Jun 2021.

Ipob mechara kwuo na ha esepụla aka na ya bụ iwu mana ọtụtụ mwakpo na ọgbaghara malitere ọkachasị n'ụbọchị mọnde izụụka ọbụla.

Mgbe BBC Igbo zigara ọnụ na-ekwuru ndị uweojii na steeti ahụ bụ Daniel Ndukwu ihe onyonyo ahụ, o kwuru ka enye ha ohere ka o nyocha ya nke ọma ma mara ma ya bụ ihe e mere n'ezia.

Akụkọ ka na-abịa