You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.
Nke bụ eziokwu maka Rev Fr Jude Obasi a sị gbara akwụkwọ n'Ebonyi steeti
Dịka akụkọ fegharịri na otu ụkọchụkwu ụka Katolik gbara akwụkwọ n'otu ụlọụka dị n'Abakaliki, Ebonyi Steeti, ihe ọtụtụ ndị mmadụ na-ajụ bụ onye bụ Fada Jude Obasi a akpụ n'ọnụ?
Nke a na-abịa dịka Dayosis Ụka Katolik nke Abakaliki kwupụtara na akụkọ na ụkọchukwu ha gbara akwụkwọ bụ akụkọ ụgha.
Akụkọ fegharịrị na soshal midia na nsonso a kwuru na otu ụkọchụkwu a kpọrọ Fada Jude Obasi , onye okpuru ochịchị Afikpo-North dị n' Ebonyi Steeti na enyi ya nwaanyị ya na ya yịrị ruo afọ isii, gbara akwụkwọ n'ụlọụka 'St Mary's Catholic Church, Abakailiki.
Akụkọ ahụ nke ya na foto onye yi akwa ụkọchukwu ma jidekwa nwaanyị yi akwa agbamakwụkwọ aka kwukwara na Fada Jude kwuru na ya ekwenyeghị na ibi ndụ ụgha na aghụghọ nke ụfọdụ ndị ụkọchukwu na-ebi.
Ihe Ụka Katolik kwuru maka ebubo ahụ
Mana n'akwụkwọ ozi mgbasaozi nke onyeisi nhazi dayosis Abakaliki bụ Fada Mathew Uzoma Opoke binyere aka ma wepụta na nsonso a, kwuru na ha enweghị ụkọchukwu dayosis ahụ aha ya bụ Jude Obasi nke a na-enwe ụlọụka dị n'dayosis ahụ a na-akpọ 'St Mary's Catholic Church.
Ozi ahụ sịrị, "Anya ụka Katolik na Dayosisi Abakaliki erutela akụkọ a wuru ewu na soshal midia banyere otu Rev Fada Jude Obasi a sị bụ onye Afikpo-North bụ onye a sị lụrụ enyi ya nwaanyị n'ụbọchị Satode abalị 25 nke ọnwa Mee afọ 2024 n'ụlọụka St Mary's Catholic church , Abakaliki."
"Anyị na-ekwu kwusie ike na o nweghị onye na-aza Jude Obasi n'ime ndị ụkọchukwu niile nọ na Dayọsis Ụka Katolik nke Abakaliki."
" O nweghị ebe a na-akpọ 'St Mary's Catholic Church' na dayosis anyị."
Kedụ onye nwekwanụ foto agbamakwụkwọ ahụ?
Foto ahụ fegharịri na soshal midia na nsonso a bụ foto otu ụkọchụkwụ otu ụka dị na mba Kenya kpọrọ onwe ha Catholic Charismatic Church ( ọ bụghị 'Roman Catholic Church')aha ya bụ Edwin Gathang’i Waiguru.
Dịka BBC Africa si kwuo, e chiri Gathang’i Waiguru ụkọchụkwu n' n'Ụbọchịụka, abalị 22 nke ọnwa Oktoba afọ 2023, na mpaghara Kiambu dị n'ugwu isiobodo Kenya bụ Nairobi bụkwa ụbọchị ọ gbara nwunye ya bụ Margaret Wanjira Githui, akwụkwọ.
Ọ bụghị Ụka Katolik bụ ndị nwere iwu na ụkọchukwu agaghị alụ nwaanyị chiri ya echichi nke ha na-agbaba ya akwụkwọ.
N 'ozi ya dịka Bishọpụ Patrick Mulau nke ụka Kirinyaga Charismatic duchara na mmemme ahụ dọtara ọtụtụ ndị mmadụ gụnyere ndị ezinaụlọ na ndị enyi ya, Edwin Waiguru, onye ọnụ ya bụ naanị ọchị sịrị, " Mmadụ nwere ike ife Chukwu ma nwekwaa ezinaụlọ na-ezi nwaanyị mara mma."
"Chukwu adahieghị oge o kere nwoke na nwaanyị ma sị na o nweghị onye kwesịrị ịnọ naanị ya."
Otu 'Catholic Charismatic Church' si na ha kwenyere na Roman Catholic mana ndị iche ha bụ na ndị ụkọchukwu ha nwere ohere ịlụ nwaanyị.
Kedụ ebe akụkọ ụgha ahụ si malite?
Nnyocha BBC Igbo mere gosiri na akụkọ na Fada Jude Obasi gbara enyi ya nwaanyị akwụkwọ n'ụlọụka Katolik dị n'Abakaliki, Ebonyi Steeti,malitere n'ehihie Fraide, abalị 24 nke ọnwa Mee afọ 2024.
Ọ bụ otu onye ode akụkọ soshal midia Bekee kpọrọ 'blogger' kpọrọ onwe ya Okoronkwo Ejike bụ ụzọ boo ebubo a n'akụkọ o wepụtara n'hu akwụkwọ Facebook ya.
Mmadụ otu puku na ụma tụnyere ọnụ n'okwu ahụ, ebe mmadụ otu puku kesara ya.
Ụfọdụ toro atụmatụ ahụ, ebe ụfọdụ katọrọ ya.
Akụkọ ahụ si Facebook banye ọbaozi X ebe ọtụtụ ndị mmmadụ kesakwara ya.
Nke a abụghị mbụ nwa amadi ahụ kọwara onwe ya dịka onye gbasa okwu na ụka('controversial blogger')na-ekesa akụkọ pụtara ụka.
N'ọnwa Eprelụ afọ 2024, Okoronkwo Ejike so na mmadụ ise nke otiegwu ụka a ma ama bụ Mercy Chinwo gbara akwụkwọ maka ifesa akụkọ ụgha banyere onye bụ nna mụrụ nwa Chinwo.
Okoronkwo mechara rịọburu mgbaghara maka ozi ụgha ahụ ọ gbasara.
Mbọ BBC Igbo gbara ịnụta olu okwu ya tupu akụkọ apụta amịtaghị mkpụrụ.