Ihe ndị ịmaghị maka nsị si n'agwọ, akpị nakwa agụụlọ

    • Onye dere ya, Uche Akolisa
    • Ndị mere akụkọ a, Senior Journalist

Agwọ tara Onyewuchi Osuji n'ime ọhịa n'obodo ha.

Naijiria dị nwaamadi ahụ ka Ghana tupu ndị ezinaụlọ ya nọ ya nso gbatara ya ọsọ enyemaka, kee ya eriri n'ụkwụ ma chee ya ọgwụ mgbọrọgwụ nke o chere zọrọ ya ndụ.

Ọ gwaara BBC Igbo sị, "A gwara m mụ aṅụla mmiri, mụ akpọkwala agwọ ahụ aha. Ha wulitere ebo aja sị m wufee ya ugboro abụọ ma kee m eriri n'ikpere ụkwụ iji gbochie nsi agwọ ahụ ịgbasa n'akụkú ahụ m ndị ọzọ, ọkachasị obi."

Osuji gara n'ihu kwuo na ha nyere ya ọgwụ nke e ji mkpọrọgwụ, mkpọahịhịa, esu, arịrị, agbakịrị na awọ sie.

"Nwanne nna m bụ dibịa mkpọrọgwụ na mkpọ akwụkwọ. Anọọla m ọtụtụ mgbe ọ na-esi ọgwụ agwọ ọtịta na ọgwụ akpị. Ahụla m ya o gburuie ngwerew, awọ, akpị, agwọ esu, ejula nakwa azụ osisi n'akwụkwọ si n'ime ọhịa maaka ọgwụ agwọ ọtịta. I lee ihe akwọkọrọ anya,, agbọọ ga-ahụ gị. mana dimkpa anọ jiderem gbaa m ọgwụ ahụ."

" Amaghị m ihe mere mana ọgwụ ahụ rụrụ ọrụ."

N'otu aka ahụ, Ngozi Emedolibe kwuru na ya dị afọ itoolu dịka nwata na-eto na Ngwa dị n'Abia steeti oge anwụ gbara ya n'ime ọhịa.

" Etipụtara m n'ọhịa., otu okene jidere m ma tipu m ihe na-acha ọcha ebe ahụ ọ gbara, m nwere onwe."

Mụ onwe m na-ede akụkọ oge m dị afọ asatọ. Etipuru m mkpu dịka ụfụ si n'apata m gazuo ahụ nile. Aghọtaghị m ihe na-eme m. Ndị agbataobi gbakọrọ. Otu onye wetara alụbasa bee na-afọnye m nọ n'ọnụ si m tawa. A tara ya n'ike n'ike iji mara ma nnukwu ụfụ ji ọ ga-ahapụ m. Onye ọzọ wetara rezọ bepu ebe ọ tara m, ọbara na-agbapụta.

Ha ji ọkụ chọta akpị ahụ ma gbuo ya. Ebe otu onye m bịara ọbịa n'ụlọ ya kwọrọ gbapụ ọsọ na be dibịa mkpọrọgwụ na mkpọakwukwọ dị nso. Nwoke ahụ nyere m ọgwụ m rachara ma jiri aka ya kpụcha ihu apa ahụ tee ya ọgwụ ma gwa ha kpọrọ m lawa.

N'Ọwụwa Anyanwu, ndị ochie nwechara nkwenye na mkpọrọgwụ na ihe dị iche iche ha na-eme ma agwọ maọbụ ihe ọgbụgba gbaa ha bụ ndị ha kwenyere na -adị ire n'ọgwụgwọ.

Mana onye ọkachammara n'ihe gbasara ike nsi nke Bekee kpọrọ 'toxicology' bụ Dọkịta Anthony Fidelis Uwah gwara BBC Igbo na ọ bụghị ka akụilu si ada n'ọnụ ka o si atọ.

Uwah bụ nnukwu odeakwụkwọ otu jikoro ndị ọkachamara n'ike nsi'Society of Basic and Clinical Toxicology of Nigeria'(SBCTN) kwuru na ikekwe na ọ bụghị agwọ nwere nsi tara Osuji nke mere ka ọ dịka ọ bụ ọgwụ na ihe a sị ya mee gwọrọ ya arụ ahụ agwọ tara ya.

O kwuru na ike nsi dị n'agwọ, akpị, anwụ maọbụ ihe ndị ọzọ na-ata ata maọbụ na-agba agba si n'ụdị ha, sị na ụfọdụ na-enwe nsi, ebe ụfọdụ enweghị.

Dọkita Uwa, onye bụ onye nkuzi na ngalaba Bio-Chemistry na mahadum 'University of Uyo' kwuru sị," Ọtụtụ agwọ nọ na mpaghara ebe a, pasent 60 a bụghị agwọ nwere nsi(venom)."

" Ọ bụghị agwọ nile nwere nsi, ike nsi ha gbadoro ụkwụ n'ụdị agwọ ha bụ."

Ya mere ụfọdu ga-eji ṅwọ mammiri, nụọ ọtụtụ ihe a kụkọrọ akụkọ, sị na ya bụ ihe agwọla ya arụ agwọ."

"Mana nke a apụtaghị na o nweghị mkpọrọgwụ na-agwọ arụ agwọ."

" Ndị nọ n'ime obodo nwere akwụkwọ na mgbọrọgwụ e nyocharala n'ụzọ sayensi, hụ na ha nwere ike ịgwọ arụ agwọ n'ezie."

Kwa afọ ọbụla , ọ kachasị n'oge udummiri, mmiri na idemmiri na-achụpụta anụ na ihe ọtịta di iche iche dịka agwọ, akpị. agbakịrị na ihe ndị ọzọ m'ebe obibi ha nke mere ka ha pụta na-achọ nri maọbụ ebe mgbaba.

Mgbe ụfọdụ ha naa-atagbu mmadụ dịka ha na-achọ nri maọbụ azọ isi onwe ha.

Dịka otu ahụike mba ụwa bụ WHO si kwuo, kwa afọ magwọ na-ata agbata nde mmadụ anọ maọbụ nde ise na ụma anọ kwa afọ.

N'ime ndị a, mmadụ dị agbata otu nde na ụma asatọ(1.8m-2.7,) na nde abụọ na ụma asaa na-anwụ site arụ agwọ tara ha.

N'aka nke ọzọ, nchọpụta gosiri na akpị na-agba ihe ruru mmadụ otu nde n'ụwa mma na-ebutekwa ọnwụ mmadụ ruru 3250 kwa afọ.

Onye ọkachammara n'ihe gbasara ike nsi nke Bekee kpọrọ 'toxicology' bụ Dr Fedelis Uwa gwara BBC Igbo na ihe nsi dị n'agwọ, akpị maọbụ ihe ndị ọzọ na-ata ata maọbụ na-agba agba bụ n'ụdị ha.

" Ọ bụghị agwọ nile nwere nsi,." ike nsi ha gbadoro ụkwụ n'ụdị agwọ ha bụ."

"Ụfọdụ na-ata naanị ọtịta ha ji azọ onwe ha."

Agụụlọ o nwere nsi?

Agụụlọ na-akwụgharị n'aja n'ọtụtụ ezinaụlọ.

Dkta Uwa kọwara sị, "Amaghị agụụlọ dịka ihe na-ata mmadụ mana nke apụtaghị na o nweghị nsi."

"Agụụlọ na-eji nsi ya egbuo anụ ọ na-eri."

"Agụụlọ nwere ike igbu anụ ndị ọzọ were ha mee nri, ị ga-ahụ na ha ji nsi. Anyị anaghị ahụ agụụlọ dịka ihe nwere ike igbu anụmanụ karịrị mana ahụbeghị m ebe o gburu mmadụ ."

"Ị gaghị E nwere akpị ka agwọ dị njọ."

Njirimara ị ga-eji ama ma agwọ ọjọọ tara gị

Ọ naghị edo anya kpọkwem ị mata ụdị agwọ tara mmadụ ọ bụ nke ọjọọ ya ma na ọ bụghị.

Ndị ọkachamara na-ekwukarị na ọ ka mma ị buga ọnye agwọ tara ụlọgwụ ọsọ ọsọ tupu ihe emebie.

Maa lee ụfọdụ njirimara onye agwọ tara , dịka ụlọọrụ mba Amerịka na-ahụ maka mgbocchi ọrị a bụ CDC si kwuo:

  • Mkpọpu ahụ ebe agwọ tara onye
  • Ọzịza, apa, ebe ahụ ịcha ọbara ọbara maọbụ na-agba ọbara maọbụ dịka etito
  • Ahụ ụfụ maọbụ ebe ahụ ịdị nro
  • Agbọ ọhụhụ, agbọ maọbụ afọ ọsịsa
  • Iku ume ọsịsọ
  • Igụsị ọnụmmiri maọbu okofụfụ ịgba onye
  • Aka maọbụ ihu isinwụ onye
  • Ire ịtọ onye ntụntụ

Ihe mbụ i kwesịrị ime ma agwọ taa gị

Akpị gbara Marcell Dike n'afọ 1992.

"E bugara m ọsọ ọsọ n'ụlọọgwụ Unimaid Hospital' ebe a gbara m ọgwụ mana ụfụ ahụ fụrụ awa atọ tupu ọ kwụsị."

Dịka Dọkita Anthony Fidelis Uwah si kwuo, "Ozigbo ọ dị gi ka agwọ(maọbụ ihe ndị ọzọ na-enwe nsi ) tara gị, gbaa ọsọ buga onye ahụ ụlọọgwụ na-egbughị oge."

"Kama ịṅụ ihe nwere ike ibutere gị ọrịa ozọ."

N'okwu ike eriri, Dkta Uwa kwuru na "ike eriri nwere ike is na ọ bụghị ihe ọjọọ ike eriri ga-egbochi ọbara ọjọọ si na-arụ ahụ ịgbasa nwere ike."

N'okwu ibepu ebe akpị gbara mmadụ, " Ibe razọ nwere ike ibelata nsi ahụ ịgbasa n'ọbara ."

Lee ndụmọdụ CDC na-enye maka ihe i kwesịri ime:

See foto agwọ tara onye ahụ n'ihi na ịmata ụdị agwọ ga-enye aka ịmata ụdị ọgwụ aga-eji gwọ ya ma e rue ụlọọgwụ

E kwela ka onye agwọ tara gagharịa kama ya nọrọ ala

Wepụ onye ahụ ọla ọbụla ọ gba tupu ahụ onye ahụ azawa aza

Detuo oge ya bụ ihe mere nakwa oge o jiri zawa aza

Were mmiri na ncha sachapụ ihu ebe agwọ tara onye ahụ

Enyekwala ya ọgwụ ahụ mgbu( ;ọmụmaatụ: 'aspirin', 'ibuprofen' maọbụ 'naproxen')

Buru ya gbaga n'ụlọọgwụ.

E kwekwala ka onye ahụ kwọọ ụgbọala n'ihi na n'ihi na ajụ nwere ike ibu onye ahụ, ọ tụbọọ dịka ọ na-akwọ onwe ya.