Igbo culture: Anụmanụ asaa ndị Igbo na-asọ na ihe mere ha ji asọ ha

    • Onye dere ya, Uche Akolisa
    • Ndị mere akụkọ a, BBC Igbo, Lagos

N'ala Igbo, e nwere ọtụtụ nsọala zụrụ Igbo ọnụ nke na onye meerụọ ya, ọ kpụọ arụ.

O meghị etu ahụ, e rie ya nha maọbụ a mapụ ya n'obodo.

Nsọ ndị a gụnyere; nwaanyị anaghị awa oji nke o ji arị nkwụ; mmadụ anaghị alụ maọbụ dinaa nwanne ibe ya maọbụ ọbara ya; mmadụ anaghị edina anụmanụ; mmadụ agaghị akwụ ụdọ maọbụ gbuo onwe ya n'ụzọ abụla ụzọ.

Nsọala ndị ọzọ bụ ; nwoke anaghị edina nwoke ibe ya maọbụ nwaanyị; nwaanyị ibe: nwanne anaghị egbu nwanne ya maọbụ gboo onye ọzọ.

I mee ya na-amaghị ama, ị gbaa ọsọ ọchụ.

Mana ọ bụghị naanị agwa mmadụ kpasoro mmadụ ibe ya nwere ike ịghọ nsọala n'ala Igbo.

Ndị Igbo na-asọ ụfọdụ anụmanụ.

E nwere anụ Igbo zuzugbe na-asọ, nwekwaa anụ ndị ọzọ bụ n'obodo n'obodo maọbụ na mpaghara na mpaghara.

Ka obodo siri dị icheiche ka ihe ha na-asọ siri dị icheiche.

Lee anụmanụ ụfọdụ Igbo na-asọ:

1.Udele

N'ala Igbo, anaghị eri udele n'ihi na a na-ewe ya na udele bụ ajọ anụ.

Dịka ndị ochie siri kọwaa, nke a bụ n'ihi na udele bụ anụ na-eri ihe nwụrụ anwụ nke gụnyere ozu mmadụ.

Akpọmasị a kpọrọ udele n'Igbo mere e ji ahụta ya ka nnukwu abụmaọnụ ịsị mmadụ, "Udele rie ozu gị."

2. Nkapị/Nkakwụ

Nkakwụ bụ anụ ọzọ Igbo zuzugbe na-asọ.

Nkakwụ bụ anụ ya na oke si otu ezianụlọ mana ndịiche bụ o nwere ọnụ ogologo.

Ọtụtụ na-asọ nkakwụ nsọ n'ihi ajọ isi ya.

3. Ewi

Ndị Igboụzọ (Ibuzọ) dị na Delta steeti na-asọ ewi.

N'otu aka ahụ, ndị Nnewi dị n'okpuru ọchichị 'Nnewi-North' na Anambara steeti anaghị eri ewi.

Akụkọ mgbe ochie kwuru na iji gbalahụ mwakpo nke ndị iro ' oge gboo, na ndị okenye Nnewi gara kpọta oke dibia bịara gwọrọ ha ọgwụ.

Ọgwụ ahụ ghọrọ ewi were gazuo Nnewi niile.

Nke a mere ndị iro ha bịazie iwakpo Nnewi, naanị nzọụkwụ ewi ka ha ga na-ahụ, ha echee na onweghị mmadụ bi n'ala ahụ.

Onye Nnewi ma ọ nọ n'ụlọ ma ọ nọ na mba rie ewi, ihe na-eso ya.

Dịka Christopher Asomugha, onye Nnewi sị kọwaa, onye Nnewi rie ewi, " ire ya etuo ka ntu".

Ọ gara n'ihu kwuo na o nwere omenala onye ahụ ga-emee, ihe ahụ tụrụ ya n'ọnụ ya niile a laa na-egbughị oge.

Ọ bụghị naanị ewi, ndị Nnewi na-asọkwa eke.

4.Ọkwa

Ndị Amaigbo dị na Mbaise, Imo steeti na-asọ iri anụ ọkwa.

Dịka Udechukwu Agbarakwe, onye AmaIgbo sị kwuo, ọkwa nyere obodo ha aka n'agha ha lụrụ oge gboo nke mere ndị ochie ha ji nye ya ọkwa pụrụ iche.

Ndị Nnọkwa n' Anambara steeti anaghị erikwa anụ ọkwa.

5. Enwe

Ndị Ọka (Awka) na ndị Ojoto n'Anambara steeti anaghị eri enwe.

Ndị ọzọ na-asọ enwe bụ ndị Orodo nakwa ndị Lagwa na Mbaise n'Imo steeti.

Otu onye Orodo bụ Obinna Akunna gwara BBC na ihe ndị obodo ha ji asọ enwe bụ n'ihi na" o yiri mmadụ".

Ndị Agbọ(Agbor) dị na Delta steeti na-asọ enwe.

Ha na-egbu ya mana ha anaghị eri ya.

Nnabuihe gara n'ihu sị, "N'obodo Agbọ, ha na asọ enwe. Ihe kpatara ha ji asọ enwe bụ na otu n'ime ndị eze chịrị ha bụ dinta.

"mgbe ọ na-achụ nta,ụmụanụ dogburu ya n'ọhịa. Ha kwenyere na ọ bụ ụwụ anụ nọ n'ezinaụlọ enwe. Ya kpatara ha anaghị eri enwe.

"Ebe ọbụla ha hụrụ enwe ha na-egbu ya, mana ha agaghị eri ya."

6. Eke

Ọtụtụ obodo dị n'Anambara steeti, ọkachasị ndị dị n'okpuru ọchịchi Idemili-North dịka Uke,Neni, Umuoji, Abba,Abatete, Nnobi, Awka-Etiti, wdg...na-asọ eke.

Ha anaghị egbu ya maọbụ rie anụ ya nke a bụ n'ihi na eke bụ ihe e ji mara 'Idemili bụ chi ọtụtụ ndị Igbo si mpaghara ahụ na-efe oge ochie.

Mana ọ bụghị naanị ndị Anambara na-asọ eke, akụkụ ebe ụfọdụ n'Imo steeti na-asọkwa iri anụ eke.

Ọkammụta na mmụta maka Afrịka na asụsụ na mahadum 'University of Lagos' bụ Chigozie Nnabuihe si kọwaa, ndị Imo ndị mmiri Njaba gafere obodo ha na-efe mmiri ahụ nke e jikwa eke mara.

Dịka Anachuna Phillano, onye Abba dị n'okpuru ọchịchị Njikọka Anambara steeti siri kwuo, onye gburu eke na-akwa ya dịka e si akwa mmadụ.

Ihe ịtụnanya dị n'obodo ndị a na-asọ eke bụ na eke anaghị ata ha maọbụ chọọ ha okwu.

Mana ọ bụghị ndị Igbo niile na-asọ Eke; ụfọdụ ndị Igbo si Ebonyi na Enugwu steeti na-ahụ eke dịka nnukwu anụ ntanta.

7. Mbe

Ndị Awo-Idemili dị n'Imo steeti anaghị eri anụ mbe.

Ha na-asọkwa iri anụ eke.

Gịnị mere e ji asọ ụfọdụ anụmanụ?

Dịka ndị okenye siri kọwaa, nke a bụ n'ihi ụfọdụ n'ahụta anụ ndịa dịka chi ha na-efe n'oge gboo.

Ọtụtụ na-asọkwa anụ ụfọdụ na-amaghị ihe mere ha ji aso ya karịa kwa na "ndị be anyị na-asọ ya."

Na nkọwa ya, Nnabuihe kwuru na obodo ọbụla nwere ihe kpatara ha ji asọ ihe ha na-asọ.

"O nwere akụkọ so ihe ọbụla obodo ọbụla na-asọ."

Gee nkọwa Nnabuihe n'uju ebe a:

N'otu aka ahụ, otu onye omenala doro anya bụ Ezenka Agbarakwe kọwakwara, ihe mere ọtụtụ obodo n'ala Igbo ji asọ anụmanụ dị iche iche bụ "maka ihe anụ ndị ahụ mere ha."

Dịka Nnabuihe na Agbarakwe siri kọwaa, nsọ anụmanụ ụfọdụ ndị metụtara mmalite obodo ndị ahụ, agha maọbụ ọdachi dagidere ha nke anụ ahụ ha na-asọ nyere ha aka gbabido.

Akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị: