You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.
Fake News: Foto na-ekwu na ndị agha na-emekpa ndị okenye ahụ n'Abịa steeti abụghị eziokwu
Foto na-efegharị ugbua na soshal midia nke na-egosi ebe ndị agha na-emekpa ndị okenye ahụ abụghị na Naịjirịa ka o mere, nke o ji abụ n'Abịa steeti.
Akụkọ ụgha ahụ na-efegharị na-ekwu na ọ bụ n'Abia steeti ka ndị agha Naịjirịa na-emekpa ndị okenye Igbo ahụ mana egbu ha.
Otu akara facebook kesara akụkọ ụgha a kwuru na ya bụ ihe mere taa bụ Wenezde, ụbọchị 14 nke ọnwa Ọgọst, 2022.
Mana nnyocha nke ngalaba 'BBC Disinformation' mere gosiri na ebe e sere foto ahụ bụ na mba Kemerun, n'afọ 2020.
Anyị chọpụtakwara na ndị agha nọ na foto ahụ bụ ndị otu a kpọrọ 'Rapid Intervention Battalion' (BIR).
Ndị okenye nọkwa na foto ahụ bụ ndị a zọpụtara n'aka ndị ọgụ nnupuisi na mba Kemerun.
BBC ji akụrụngwa tekịnụzụ nyochaa foto ahụ wee chọpụta na ọ bụ n'ụbọchị 16 nke Ọnwa Ọkutoba 2020 ka foto ahụ bu ụzọ pụta na Facebook.
Nnyocha akwa ndị agha nọ na foto ahụ gosikwara na ọ bụ ụdị akwa nke ndị agha BIR nke mba Kemerun na-eyi.
N'otu aka ahụ kwa, ọbaozi ntaakụkọ mba Kemerun a na-akpọ kontripipo.com dere akụkọ gbasara foto ahụ n'ụbọchị 17 nke ọnwa Ọkutoba 2020.
Kemerun na Naịjirịa nwere okeala na mpaghara Ọwụwa Anyanwụ, ọtụtụ mpaghara dị na Kemerun yikwara mpaghara ụfọdụ na naịjirịa.
Naịjirịa na Kemerun na-enwekwa nsogbu ndị nnupuisi na-achọ nnwereonwe, nke mere ụdị akụkọ ụgha ndị a ji apụtakarị na mba abụọ a.