You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.
Last Will: Ihe i kwesịrị ị ma maka ike ekpe
- Onye dere ya, Michael Ilediagu
- Ndị mere akụkọ a, Journalist
- Ebeg o si, Legọs
Ike akụnaụba mmadụ oge onye ahụ nwụrụ bụ otu n’ime ihe na-ebute esemokwu n'ezinaulo ma bụrụkwa otu ihe na-etisa nwanne na nwanne.
Ọtụtụ ezinaulo nọ n’ụlọikpe maka ọgbaaghara sitere na etu nne ha maọbụ nna ha sị kee akụnaụba ha.
Onye ntaakụkọ anyị gbara onye ọkaiwu na ndị ọzọ o were anya ihe ndị mmadụ kwesiri ịmata maka ideputa ka a ga-esi kee akụnaụba ha ma ọ bụrụ na ha nwụọ.
O tinyere anya n'ihe na-akpata esemokwu na etu ezinaulo ga- esi gbanarị ya ma ọ bụrụ na ha nweta onwe ha n'ọnọdụ ike akụnụba.
Gịnị bụ ‘ideputa etu a ga esi kee akụnụba mmadụ’?
Ndị Bekee kpọrọ ideputa etu a ga-esi kee akụnaụba mmadụ “Will-writing”.
Nke a bụ mmadụ ide etu ndị ezinaulo ya, maọbụ ndị ọ chọrọ ka a ga-esi kee akụnụba ya ọ bụrụ ma ya nwụọ.
Nghọtahie ndị mmadụ nwere maka idepụta etu a ga-esi kee akụnụba ha
N'ala Igbo, ọtụtụ ndị mmadụ anyị gbara ajụjụ na-ahụta idepụta etu a ga-esi kee akụnụba ha dịka ihe onye na-anwụ anwụ na ede; mana nke a abụghị eziokwu.
Otu onye anyị jụrụ ajụjụ bụ onye iị ego achụ ego aha ya bụ Chukwuemeka Eze kwuru na ya achọbeghị ịnwụ, mana ya chọrọ ide ya tupu ya anwụọ.
N'ọkwụ ya “di anyị, achọbeghị m ịnwụ, 'will' bụ ihe ndị kara nka chọrọ ịnwụ na-ede ”.
Onye ozọ bụ Angela Odoh, ọ kwuru na ọ bụ ndị nwere ego na-ede etu a ga-esi kee akụnụba ha.
“Ọ bụ onye nwere ego ga-ede ya, m ga-ede ya ma ọ bụrụ na m nwee ego.”
Onye ọkaikpe a ma ama n’Enugwu steeti bụ Nnenna Anọzie kwuru na mmadụ idepụta etu a ga-esi kee ihe ya bụ ihe onye ọbụla ruru afọ iri na asatọ kwesịrị ide na-agbanyeghị afọ ole onye ahụ dị, ma o nwere nnukwu ego maọbụ obere ego.
“Ihe a na-azọ n'ezinaụlọ karịrị. Ọtụtụ na-azọ ma uwe, ọtụtụ na-azọ ma akpụkpọụkwụ na ihe dị icheiche; nke a mere o ji dị mma na onye ọbụla dere etu a ga-esi kee ihe ya.”
Nnenna Anọzịe sara ajụjụ dị icheiche banyere mmadụ ide etu a ga-esi kee ihe ya ọ bụrụ ma onye ahụ nwụọ.
N'okwụ ya “onye ọbụla rụrụ afọ ịrị na asatọ kwesịrị ide ya, ọ masị ya bụrụ naanị akwa nkịtị ka ị nwere, maọbụ akpụkpọụkwụ, ị kwesịrị ide etu a ga-esi kee ya ọ bụrụ ma gị laa nmụọ.”
Onye kwesiri idere mmadụ etu a ga-esi kee ihe ya?
Nnenna Onozie kwuru na onye kwesiri idere mmadụ etu a ga esi kee ihe ya na ọ bụrụ na ọnwụọ bu onye ọkaikpe ya na oge ọ dị ndụ.
“Ọkaikpe gi ga edeputa ihe niile gi nwere, deputa ndị gị ga enye ya ma ọbụrụ na gị nwụọ. Gị ga ebinye aka gị na akwụkwọ ahụ, ọkaịkpe gị ga ebinyekwa aka ya, onye ọzọ bụ onye aka ebe gị ma ọ bụ ndị aka ebe gị ga ebinyekwa aka”.
Uru ọ bara ide etu a ga-esi kee akụ gị
Anozie kwuru na ya nwere ọtụtụ ikpe ya gị na aka ụgbụa bụ ebe ezinaụlọ nọ na ọgbaaghara maka akụnụba nne na nna ha maka na edeghi etu a ga esi kee akụnụba ha.
“Ụrụ ọ bara na mmadụ dere etu a ga esi kee akụnụba ya bụ na ọ ga egbochi ọgbaaghara ọkacha na ọ bụrụ na edee ya ọhụma”.
Ọ ga egbochi ndị ịrọ ịbata ma kwara ọnọdụ na etigheri ezinaulo gị anya.
Ihe na-ebute ọgbaaghara
Anọzie kwuru na ọ were ihe ole ma ole nwereike ibute ọgbaaghara na oge ebịdọro ike ihe e deputara na akwụkwọ.
Na okwu ya “otu n’ ime ihe na ebute ọgbaaghara na oge a na eke ihe bụ anya ụkwụ. Ihe ọzọ bụ ndị na amanye nne ha ma ọ bụ nna ha n’ike ma mee ka ekenye ha ihe buru ibu. Ọ bụrụ na ndị ọzọ chọpụta nkea, ha ga eje ụlọikpe maka ya”
Ọ gara n’ịrụ kwụọ na enwereike ọ bụrụ na agụpụtachaa ihe nne ma ọ bụ nna ha dere, ndị enyere obere ihe nwere ike ịsị na ha ekweghi ma gaa ụlọ ikpe maka ya.
Ihe ọzọ bụ na ụfọdụ na edeputa etu aga esi kee ihe ha nwere ike tinye aha ndị ezinaulo ha amaghị. Nke a sọ na ihe ndị ọzọ sọ ebute ọgbaaghara.
“Ụfọdụ nwereike ikwu na nna ha hụrụ onye nke a na anya karịa na ọ bụ maka ya mere ọ gi kenye ya ihe karia, ha nwekwereike ịgawa ụlọikpe”
“Ọ bụrụ na i dewe etu a ga-esi kee ihe gị, ị ga eme ya ka ọ hara iwe onye ọbụla iwe, ị ga eme ka ọ ghara ịdị ka ị na-akpagbo onye ọbụla maka na nke ahụ ga-ese okwu.”
Ụzọ dị icheiche esi ede ya
Anọzie kwuru na e nwere ụzọ dị icheiche esi ede etu esi eke ihe mmadụ na oge onye ahụ nwụrụ.
Ọ sị na nwere nke dị mfe ọ bụ otu onye na edeputa ya. Ọ ga edeupe ihe niile onwere na dekwaa ndị ọga enye ya na ya nwụọ.
Ọ gara n’ịrụ kwụọ na nke ọzọ bụ nke mmadụ abụọ dịka dị na unye na edekota anụ ma binye aka.
Ọ kwụrụ na e nwere etu ndị ọzọ ma ọ bụ ụdịrị ndepụta dị icheiche mana nke a kacha ede na Naịjirịa bụ nke otu onye ma ọ bụ dị na nwunye.
Ọghọm dị n'edeghị etu a ga esi eke akụ gị ma ị nwụọ
Anozie kwuru na ọghụm dị na mmadụ edeputaghi etu a ga-esi kee ihe ya ma ọ nwụọ bụ na o nwere ike ibute ọgbaaghara.
Ọmụmaatụ: Ọ bụrụ na mmadụ nwere ego n' ụlọakụ mana ọ nweghi onye o nyere ikike iwere ego ya na ọ bụrụ na ya nwụọ; tụpu ndị ezinaulo ya a gachaa ụlọikpe iweta ikike ha ga-emefu nnukwu ego.
Ndụmọdụ pụrụ iche
Ọ bụrụ na ideputa etu a ga-esi kee ihe gi na ị nwụọ ọfụma, ọ ga-enyere ezinaụlọ aka ma nwete udo.
Ọ bụrụ na i deghi ya, e nwere ihe a na akpọ “letter of administration” ọnụ Bekee, nke ahụ bụ iweta ikike n’ụlọikpe ka ihe niile nna gị ma ọ bụ nne gị nwere nwee ike ị.
Ndụmọdụ m na enye dị na ụnye bụ ha na azụ ihe ọbụla, ha zụọ ya na aha ha, ọ bụ ala, ulọ, ma ọ bụ ụgbọala, ha zụọ ya na aha ha abụọ, nke a ga enyere aka enwee onye a chọrọ achọ, ọ ma hịa ahụ onye nke ọzọ itinye akụnụba ha na aha ha.
Ọzọ bụ deputa etu a ga-esi kee ihe gị, ma dee ya etu a gaghị enwe onye e nyere obele ihe, ma mee ka aghara inwe onye ga-enwe iwe na e nyere ya obele, mee ka onye ọbụla nweta oke ruru ya.