Jiri ọsọ gaa ụlọọgwụ ma ọ bụrụ na ị chọpụta ihe ndị a na ntị gị - Dọkịnta Moses

    • Onye dere ya, Michael Ilediagu
    • Ndị mere akụkọ a, Journalist
    • Ebeg o si, Lagos, Nigeria
  • Oge e ji agụ akụkọ nkeji 3

Mmadụ adịghị anụ ntị maọbụ ntị ịkpọchi akpochi bụ otu ọrịa nwere ike eme onye ọbụla ma nwatakịrị a mụrụ ọhụrụ, ma okeye.

N'akụkụ a, dọkịnta maara ihe gbasara ntị, akpịrị na ịmị bụ onye ọkachamara Moses Ayodele Akinola tinyere ọnụ n'ihe dị icheiche na-emetụta ntị na nke na-akwụsị mmadụ ịnụ ihe.

Akinolati kwuru nke a dịka mba ụwa na-eme nchata ịnụ ntị bụ nke a na-eme n'abalị atọ nke ọnwa Maachị afọ ọ bụla.

Isi okwu mba ụwa ji eme emume nchata ịnụ ntị nke afọ 2025 bụ "Ịgbanwe uche: nyere onwe gị aka, mee ka ntị na ahụike ịnụ ntị dịrị mmadụ niile".

Lee ihe na-egosi na mmadụ ebidola inwe nsogbu ntị

Akinola kwupụtara ọtụtụ ihe wereike igosi na mmadụ ebidola inwe nsogbu ntị.

Akinola kwuru na ihe ndị ahụ bụ ihe na-eme ndị okenye ma dọọ aka na ntị na onye ọbụla bidoro na-enwe udiri nsogbu ahụ kwesiri ịga hụ dịbịa bekee na-ahụ maka ntị.

Ọ kọwara na ihe ndị ahụ gunyere:

  • Onye na-anụ ihe nke ọma bido na-enwe nsogbu ịghọta ihe onye ọzọ na-ekwu n'oge a na-akpa nkata.
  • Onye ahụ bido na-agwa ndị mmadụ ka ha kwuharịa ihe ha kwuru.
  • Onye ahụ bido na-anụ ntị nke ọma naanị n'oge a na-ekwusi okwu ike.
  • Ọ bụrụ na onye ahụ na-ekiri onyonyo maọbụ na-ege redio mgbe a gbaniri okwu ya elu.

Etu o si metụta nwa a mụrụ ọhụrụ na nke e bu n'afọ

Moses Ayodele Akinola gara n'ihu kọwaa na e were ọtụtụ ihe na-ebute adịghị anụ ihe.

Ọ sị na ihe mere mgbe adị ime mmadụ ga-eme ya ọ hara ịnụ ntị. Ọ sị na ngaraba ahụ e ji anụ ntị nwereike imebi n'ime afọ mgbe e bu onye ahụ na-afọ.

Ọ sị na ọgwụ nne nwa ahụ nụrụ maọbụ nwa nne ya na-arịa ọrịa ọtọbịrịbịrị na-akpata adịghị anụ ntị.

Ọzọ bụ nwa a mụrụ mana anya ya na-acha edoedo nke ndị ọcha kpọrọ "Juandice". Ọ sị na e kwere ịzọ ndụ nwa ahụ nke ọma ka ọrịa ahụ ghara ịba ya n'ụbụrụ.

Ọ sị na ọtụtụ ọrịa ndị ọzọ nwereike ime nwa e bu n'afọ ahara ịnụ ntị mgbe a mụpụtara ya.

Ụzọ mmadụ ga-esi chekwaa ntị ya

Ayodele Akinola kwuru na ọtụtụ ihe nwereike ime ka mmadụ nwee ọnọdụ adaịghị anụ ntị.

Ọ sị na mmadụ ịnọ ebe unukwụ mkpọtụ mere nwereike imebi ntị onye ahụ.

Ọzọ bụ ndị na-anọ ebe mkpọtụ na-eme oge ọ bụla nwereike inwe ọnọdụ ntị ike maọbụ inwe ọrịa ntị.

"Nnukwu mkpọtụ nwereike imebị mmadụ ntị mee ka ọ hara ịnụ ihe".

Akinola gara n'ihu kwuo na ọ dị mma na onye ọbụla were nsogbu na ntị ga-eje ụlọ ọgwụ ga hụ dọkịnta.

O kwuru ka a kpachapụ anya n'ebe ụmụaka a mụrụ ọhụrụ nọ ma nye ha ọgwụ mgbochi n'oge.