Gịnị bụ nwabebi 'Labubu' na-ewu ewu ụgbua?

Nwabebi Labubu dolls kwụrụ n'ahịrị n'igbe ngosi ahịa

Ebe foto si, Xia Yu/VCG via Getty Images

    • Onye dere ya, Fan Wang
    • Ndị mere akụkọ a, BBC News
    • Ebeg o si, Singapore
    • Onye dere ya, Adam Hancock
    • Ndị mere akụkọ a, Business reporter, BBC News
    • Ebeg o si, Singapore
  • Oge e ji agụ akụkọ nkeji 5

Ọ bụrụ na i chere na ọ mara mma, na ọ jọrọ njọ maọbụ na e nwere etu ọ dị, nke bụ eziokwu bụ na ị nụla maka nwabebi nwere ajị na-ewu ewu n'ụwa a kpọrọ Labubu.

Nwabebi a nke Pop Mark mba Chaịna na-emepụta ihe ụmụaka ji egwu egwu mepụtara, abụrụla ihe na-aga ahịa ugbua.

Ọ bụghị na ọ mara mma dịka Rihanna, Kim Kardashian, Dua Lipa maọbụ Lisa nke Blackpink.

Ọtụtụ mmadụ na Lọndọn na-akwụ n'ahịrị iji nwee ike zụta nwabebi Labubu a, oge ụfọdụ a na-alụ ọgụ maka ya.

Fiona Zhang kwuru na "Ọ bụ ihe ọṅụ ma ọ bụrụ na ị zụta ya n'agbanyeghị ọtụtụ ndị chọrọ ịzụ ya."

Ka ọ dị ugbua, Pop Mart na-enweta nnukwu uru site n'etu ndị mmadụ si mpaghara ụwa dị iche iche si achọ ịzụta Labubu n'afọ gara aga.

Mana kedụ ka nke a si mee?

Gịnị bụ Labubu?

Nke a bụ ajụjụ juru ọtụtụ mmadụ ọnụ - ebe ụfọdụ maara ọsịsa ya enweghị ike ịkọwa ihe mere o ji ewu ewu.

Labubu bụ ihe e chepụtara ma bụrụ ngwaahịa. Aha ya enweghị ihe ọ pụtara. Ọ bụ aha otu onye n'ejije ihe ụmụaka ji egwu egwu a kpọrọ "The Monsters" nke Kasing Lung a mụrụ na Hong Kong mepụtara.

Nwabebi Labubu nwere nnukwu anya, ntị ogologo nakwa ọchị na-egosi eze itoolu ya.

Ụfọdụ na-ekwu na ọ mara mma ebe ndị ọzọ kwuru na ọ maghị mma.

E jirila nwabebi Labubu mee ọtụtụ agba ihe nkiri "The Monsters",nke gụnyere "Big into Energy", "Have a Seat", "Exciting Macaron" nakwa "Fall in Wild".

Ebe foto si, He Xiaoxiao/VCG via Getty Images

Nkọwa foto, E jirila nwabebi Labubu mee ọtụtụ agba ihe nkiri "The Monsters",nke gụnyere "Big into Energy", "Have a Seat", "Exciting Macaron" nakwa "Fall in Wild".

Dịka websaịtị ụlọọrụ na-ere ya siri kwuo, Labubu "nwere ezigbo obi, ọ bụ onye chọrọ inyere mmadụ aka oge niile mana nke a abụghị etu ndị mmadụ si ahụta ya."

E jirila nwabebi Labubu mee ọtụtụ ihe nkiri "The Monsters", nke gụnyere "Big Into Energy", "Have a Seat", "Exciting Macaron" nakwa "Fall in Wild".

Onye na-ere nwabebi Labubu?

Ihe pụrụiche banyere ụlọahịa Pop Mart bụ igbe nzuzo - nke a pụtara na ọ bụ naanị oge ị zụrụ ya ka ị ga-ahụ ihe dị n'ime ya - nke a ruru ọtụtụ afọ tupu Pop Mart enye Kasing Lung ikike ire Labubu.

Nke a mere n'afọ 2019, n'ọtụtụ afọ gara aga onye ji ego achụ ego bụ Wang Ning hiwere Pop Mart dịka ụlọahịa na-ere ihe dị iche iche, o yiri ụlọahịa pound store dị na Beijing. Oge atụmatụ igbe nzuzo a malitere ịmịta mkpụrụ, Pop Mart mepụtara ejije nwere ọtụtụ nkebi Bekee kpọrọ series n'afọ 2016, malitere ire nwabebi Molly dolls - nwabebi yiri ụmụaka nke Kenny Wong si Hong Kong mepụtara.

Ndị na-azụ ahịa na-ekiri nwabebi Labubu dị na Pop Mart na Juun 16, 2025 na Chongqing, Chaịna.

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto, Pop Mart meghere ụlọahịa mbọ ya na-ere ihe dị iche iche n'afọ 2010

Mana ọ bụ etu ọtụtụ si azụ Labubu nyere Pop Mart uru, n'ọnwa Disemba 2020, ha malitere ire oke 'shares' n'ụlọ azụmahịa Hong Kong Stock Exchange. Oke ahụ eritela uru karịrị pasentị 500 n'afọ gara aga.

Pop Mart abụrụla ụlọahịa bụ ọkaibe. O nwere igwe azụmahịa 2,000 n'ụwa niile. I nwereike ịzụ Labubu na mba 30 site na UK, Amerịka, Ọstrelia na Sịngapọ mana ụfọdụ akwụsịtụla ire ya n'ihi ọtụtụ mmadụ chọrọ ya.

Ndị zụrụ na mba ndị ọzọ na-abụghị Chaịna, nyere Pop Mart uru pasentị 40 ha nwere n'afọ 2024.

Nke a na-egosi na Labubu na-ewu ewu ebe ndị ọrụ na-ahụ maka ngwaahịa na-abata na Chaịna kwuru na ha amachiela nwabebi Labubu adịgboroja ruru 70,000 n'ime abalị ole na ole gara aga.

Kedụ etu Labubu si malite iwu ewu?

Ashley Dudarenok, bụ onye hiwere ụlọọrụ mba Chaịna na-eme nchọpụta ChoZan, kwuru na tupu ụwa amata ihe Labubu bụ, ọ bụ na Chaịna ka ọ malitere iwu. Ọ malitere iwu ewu dịka mba Chaịna si na mmachi ọrịa Covid pụta na ngwụcha afọ 2022.

"Labubu bụ ihe nyeere ọtụtụ mmadụ aka inweta onwe ha dịka ọrịa covid lara maka na ọ bụ ihe mara mma ma na-akpali mmụọ n'otu aka ahụ," ka Dudarenko kwuru.

Ịntanetị mba Chaịna buru ibu mana ọ na-anaghị emepụta ihe na-ewu ewu n'ụwa. Mana nke a dị iche maka na ọ na-ewu na ndịda ọwụwa anyanwụ Eshia.

Fiona, bi na Kanada, kwuru na oge mbụ ọ nụrụ maka Labubu bụ n'ọnụ ndị enyi ya si mba Filipin n'afọ 2023.

Ọ bụ oge ahụ ka ọ malitere ịzụ ya - o kwuru na ọ bụ ihe mara mma mana etu o si ewu ewu bụ ihe na-echu ya ụra maka na dịka ọ na-ewu ewu, ọ na-achọ ya ọzọ.

"Di m anaghị aghọtazi ihe mere onye rurula afọ m dị si hụ ihe dị etu a n'anya nke ukwuu"

Nwaanyị tinyere nwabebi Labubu n'akpa ya.

Ebe foto si, Getty Images

Labubu dị ọnụala n'ahịa, n'agbanyeghị na ọnụahịa ya arịala maka na ọtụtụ mmadụ chọrọ ya, Fiona kwuru na ezigbo ọnụahịa ya bụ dọla Kanada iri abụọ na ise maọbụ dọla Kanada iri asaa.

Labubu malitere iwu ewu nke ukwuu n'ọnwa Eprel, 2024 oge Lisa onye a ma ama si mba Taịland, malitere ikesa foto nwabebi Labubu n'akara Instagram ya. Ọ bụ oge ahụ ka ndị ọzọ a ma ama malitere ikesa foto ya, ọ bụ nke a mere o ji malite iwu ewu n'ụwa niile.

Otiegwu Rihanna sere foto o tinyere Labubu n'akpa Louis Vuitton ya n'ọnwa Febụwarị. Kim Kardashian kesara nwabebi Labubu iri n'akara Instagram ya n'ọnwa Eprel. David Beckham jikwa Labubu nwa ya nwaanyị see foto.

Labubu ejula ebe niile ugbua.

Onye mere e ji achọ Labubu?

E nweghị onye ma - dịka ihe ndị ọzọ dị ka ya, enweghị onye nwereike ịkọwa ihe mere ndị mmadụ ji hụ Labubu n'anya ma na-achọ ịzụ ya.

Mana nke a bụ ihe obiụtọ nye Beijing. Ụlọọrụ mgbasaozi Xinhua kwuru na Labubu na-egosi ezi mmepụta na akọnauche ndị Chaịna nakwa etu ha si emepụta ihe na-amasị ọhanaeze.

Nwoke na nwaanyị na-ekiri nwabebi dị na Pop Mart.

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto, Ụlọahịa Pop Mart dị na Shanghai

Ọtụtụ vidio ebe ndị mmadụ na-emepe Labubu ha zụtara ejula na soshal midia. Otu n'ime ha bụ nke otu onye ọrụ nchekwa n'ọdọụgbọelu Amerịka mepere akpati Labubu otu onye na-eme njem iji chọpụta nwabebi dị n'ime ya.