'One chance' emeela Legọs otu n'ime obodo kachasị njọ ịbanye ụgbọala

Aha onyonyo, 'One chance' emeela Legọs otu n'ime obodo kachasị njọ ịbanye ụgbọala'
    • Onye dere ya, Marvelous Obomanu & Donald Wogu
    • Ndị mere akụkọ a, Broadcast Journalist & Video Journalist
  • Oge e ji agụ akụkọ nkeji 2

Nyocha BBC Igbo mere na Legọs n'egosi na ọtụtụ ndị mmadụ adabala n'aka ndị omekome n'eji ụgbọala ọha eme mpụ nke ndị bekee na-akpọ "one chance"

Mmadụ abụọ ndị agbara ajụjụ ọnụ kọwara etu ha si banye n'aka ndị ojọọ a ma kwuo na 'one chance' emeela Legọs otu n'ime obodo kachasị njọ ịbanye ụgbọala na Naịjiria

Victoria Akpan, nwa agbọghọ si AkwaIbom steeti batara Legọs n'ọnwa Januarị 23, 2021 banyere ugbọala ndị ọjọọ mana ọ bu site n'amara Chineke mere ndị ọjọọ ahụ egbughị ya, dịka ha napụrụ ya ihe niile o ji

 Victoria na Ahmed

Onye ọzọ BBC Igbo gbara ajụjụ ọnụ gbasara nsogbu a bụ Ahmed Morufu. Ọ dabara n'aka ha mana ngwangwa ọ hụrụ ihe dị iche n'akparamaagwa ha, ya jiri nwayọ pụta n'ụgbọala ahụ tupu ha amalite njem.

Mgbe ụlọ mgbasa ozi BBC Igbo kpọtụụrụ ọnụ na-ekwuchitere ndị uweojii na Legọs steeti bụ Benjamin Hundeyin, o kwuru na "mpụ ndị uweojii steeti ahụ na-anata mkpesa maka ya agụnyeghị iji ụgbọala ezu ohi a na-akpọ "one chance"

Nke a pụtara na "e nweghị mpụ dị etu ahụ maọbụkwanụ na ndị o metụtara anaghị enye mkpesa n'aka ndị uweojii,"