Pascal Dozie hibere ụlọakụ Diamond Bank alaala mmụọ

Ebe foto si, Uzoma Dozie/Instagram
Pascal Gabriel Dozie, onye ọchụnta ego a mara dịka onye guzobere ụlọakụ Diamond Bank na onyeisioche Mahadum Pan-Atlantic anwụọla.
Ọ bụ n'ụbọchị Tuzde 8 Eprel 2025 ka ọ nwụrụ dịka ọ gbachara afọ iri asatọ na ise (85).
Ọ nwụrụ otu ụbọchị tupu ụbọchị ncheta ọmụmụ ya nke afọ 86.
N'ozi Onyeisiala Bola Tinubu wepụtara, o nyere ezinaụlọ Dozie, ndị ọchụnta ego, na ndị Naịjirịa niile nkasi obi maka ọnwụ nke onye ọchụnta ego, na onye ọrụ ụlọakụ ahụ.
Onyeisiala kọwara Dozie dịka ihe nketa mba Naịjirịa na-adịgide adịgide maka ntinye aka na nhazi akụnaụba na Nịajirịa.
Ọnụ na-ekwuchitere onyeisiala Tinubu bụ Bayo Onanuga kwuru na dịka onye guzobere Diamond Bank na onyeisioche nke MTN Nigeria, Dozie bụ onye na-ebute ụzọ na-iwete mgbanwe n'akụkụ abụọ kachasị n'ihe banyere ụlọakụ na nzikọrịta ozi yana njem mmepe Naịjirịa.
Onyeisiala nyere nwunye Dozie, ụmụ ya, na ezinaụlọ ya nkasi obi. Ọ kpọkuru ndị ọrụ nke Naịjirịa ka ha sọpụrụ Dozie site n'ịkwado ezi ihe, ihe ọhụrụ, na iwu obodo, bụ nke eji mara ya.
Onye bụ Pascal Dozie?

Ebe foto si, peter obi/X
Dozie bụ onye nwere oke n'ụlọọrụ MTN Group ma rụkwa ọrụ dịka onyeisioche ụlọọrụ ahụ.
Ugbua, i nwereike inweta akụkọ BBC Igbo niile n'ekwenti gị.
Pịa aka ebe a ka i soro anyị
Ebe Ọkwa azụmahịa WhatsApp kwụsịrị
Ọ bụbu onyeisioche nzụkọ ahịa nke Naijiria 'Nigerian Stock Exchange' n'otu oge.
Dozie malitere ọrụ ya dịka onye ọka mmụta akụnaụba na National Economic Development Office dị n'United Kingdom.
Ọ bụbu onye nkuzi nwa oge n'ụlọ akwụkwọ North Western Polytechnic nke London.
Bido n'afọ 1970 ruo 1971, ọ jere ozi dịka onye ndụmọdụ gbasara akụnaụba n'Afrikan States Consulting Organisation dị n'Uganda.
N'afọ 1971, ọ hapụrụ ọrụ ya n'Uganda kwaga Nịajirịa. Dịka onye mara ihe ekwe na-akụ na Economics and injinia ụlọọrụ 'Industrial Engineering,' ọ malitere ụlọọrụ mbụ ya a kpọrọ Afrikan Development Consulting Group (ADCG) nke ya na ụlọọrụ Nestle na Pfizer rụkọrọ ọrụ.
O nwere mgbe onye bụbu Gọvanọ Central Bank nke Naịjirịa Clement Isong, were ya n'ọrụ, ka o mee ụfọdụ ọmụmụ n'ụlọakụ Co-operative na Commerce.
N'afọ 1985, a họpụtara ya dịka onyeisioche nke Progress Bank, adịzighị ugbua.
Mgbe otu afọ ahụ gasịrị, Dozie tinyere akwụkwọ ikike n'ụlọakụ iji nyere ndị ahịa nọ na ndịda ọwụwa anyawụ Naịjirịa aka ọkacha ndị nwere nsogbu ụlọakụ.
N'afọ 1990, o mezuru ihe Central Bank Naịjirịa chọrọ make ịrụ ụlọakụ, nke a mere o jiri malite ụlọakụ Diamond n'afọ 1991.
Ọ bụ onyeisi ụlọakụ Diamond site n'afọ 1991 ruo 2006 mgbe ọ nyefere ya nwa ya nwoke bụ Uzoma Dozie.
Ndụ nwata Pascal Dozie
Dozie bụ onye a mụrụ n'afọ 1939 n'obodo a na-akpọ Egbu dị n'okpuru ọchịchị nke ugwu Owere, Imo steeti. A mụrụ ya n'ezinaụlọ Charles Dozie bụ Katikist ụka katọlik.
Dozie gara ụlọakwukwo Our Lady's School Emekuku n'afọ 1961 ebe o nwetara asambodo izizi ụlọ akwụkwọ nke mbụ.
O mechara gaa Holy Ghost Juniorate Seminary na Holy Ghost Kọleji, dị n'Owere, ebe o nwetara nzere asambodo nke West African Senior School.
Mgbe ọ nwetasịrị asambodo ụlọ akwụkwọ sekọndrị, ọ gara London ebe ọ gụrụ akwụkwọ gbasara akụnụba na London School of Economics wee nweta BSc na Economics.
Mgbe nke ahụ gasịrị, ọ gara Mahadum City dị na London ebe ọ gụrụ akwụkwọ maka nnyocha ọrụ na injinia ụlọọrụ wee nweta nzere masta na Sayensị Administrative.








