Take it Back: Ndị ndịda ọwụwa anyanwụ Naịjirịa esoghị eme ngagharịiwe

Kemgbe ndị a na-akpọ 'Take it Back Movement' bidoro ngagharịiwe na steeti dị icheiche na Naịjirịa, BBC Igbo mere nyocha na ọwụwa anyanwụ ị mara na ha eso eme ngagharịiwe.
Ndị ntaakụkọ BBC Igbo gara nleta na steeti dị icheiche dịka Anambra, Enugwu, Ebonyi, Abịa na Imo steeti bụ ebe ha chọpụtara na enweghị ihe dịka ngagharịiwe n'ebe niile ha gara.
Photo gosiri etu ọnọdụ si dị taa na ndị ndịda ọwụwa anyanwụ Naịjirịa



Ebe foto si, Owerri, Imo Steeti

Ndị uweojii agbala ndị na-eme ngagharịiwe n'Abuja anwụrụ anya mmiri, chụsasịa ha ma jide mmadụ ole ma ole

Otu onye na ndị so ahazị ngagharịiwe 'Take it Back Movement' na-eme n'Abụja bụ Rex Elanu ekwuola na ọ bụ eziokwu na ndị uweojii jidere ndị so ha eme ngagharịiwe.
Rex Elanu kwuru na otu onye a maara dịka 'Abuja flay boy' nakwa nwaanyị ọzọ a ma dịka 'Bosede' so na mmadụ abụọ ya maara e jidere.
Ndị uweojii jiri egbe anwụrụ anya mmịrị chụsasịa ndị na-eme ngagharịiwe ahụ na mpaghara Maitama dị n'Abuja.
Out onye a maama bụ Omoyele Sowore so na ndị a hụrụ n'ebe a na-eme ngagharịiwe ahụ.

Lee iwe ndị 'Take it Back Movement'
Ndị na-eme ngagharịiwe bụ 'Take it back movement' gụpụtara ihe na-enwe ha iwe.
N'ime ihe ha kwuru gunyere:
Iwu Naịjirịa nke a kpọrọ 'Cybercrime Act' bụ nke ha kwuru na e ji akpagbu ndị mmadụ.
Ajọ ọnọdụ akụnụba Naịjirịa na oke agụụ
Ị manye ọchịchị gbatagbata na Rịvas Steeti.
Take it Back: E bidola ngagharịiwe maka mkpagbu ikike onye kwuo uche ya na Naịjiịrịa

Otu a na-akpọ 'Take it Back Movement' ebidola ngagharịiwe na steeti dị iche iche na Naịjịrịa maka ihe ha kọwara dịka gọọmentị ọjọọ na ịkpagbu ikike onye kwuo uche ya na Naịjirịa.
Ndị otu ahụ bidoro ngagharịiwe n'agbenyeghị ndụmọdụ ndị uweojii nyere ha maka ụbọchị taata.
Otu ahụ ji akara soshal mịdịa ha were na-agbasa ozị ma na-egosi ihe na-eme na mpaghara steeti dị iche iche bụ ebe ọ na-akpọtụ ugbua.

Ebe foto si, Take it back Movement / X
Ihe ndị uweojii Naịjirịa kwuru maka ngagbarịiwe a
Isi ụlọọrụ ndị uweojii Naịjirịa dị n'Abụja adọọla aka na ntị ma kwuo na ụbọchị taa adịghị mma ka ndị mmadụ were ya mee ngagharịiwe.
Ndị uweojii Naịjirịa mere ka amata nke a n'akwụkwọ ozi ha kesere n'akara soshal mịdịa ha nke ọnụ na-ekwuru ha bụ Olumuyiwa Adejobi binyere aka.
"Anyị agụọla akụkọ otu a na-akpọ 'Take it back movement' dere maka ime ngagharịiwe na Naịjirịa niile ọkachasị n'isi obodo Naịjirịa bụ Abuja n'ụbọchị Mọnde Epril 7, 2025, ụbọchị e ji eme emume icheta ndị uweojii na Naịjirịa ma ịkwanyere ndị uweojii mere nke ọma ugwu".

Ebe foto si, NPF/X
Ihe ọzọ ndị uweojii gbadoro ụkwụ were sị ka a hapụ ime ngagharịiwe taa
N'akwụkwọ ọzị ahụ Olumuyiwa Adejobi kesere ka ha nọ kọwaa sị "Anyị adịghị emegide ikike dịrị mmadụ dịka iwu Naịjirịa si kwadoo mana anyị na-atụle ihe ndị na-ahazị ya bu n'obi".
"Kedụ ka ọ si bụrụ otu ụbọchị ahụ a na-eme emume ịcheta ndị uweojii, nke ga-eme ka ndị isi uweojii na mba dị iche iche bata na Naịjirịa, ka ndị mmadụ chọrọ ime ngagharịiwe?"
"Ngagharịiwe a nwereike ịmetọ aha ndị uweojii nakwa Naịjirịa niile".
"Anyị na-asị ka ndị niile chọrọ ime ngagharịiwe ka ha kwụsị atụmatụ ahụ kama ha gaa n'ụlọọrụ gọọmenti dị iche iche ga mee mkpesa ọbụla ha chọrọ ime".








