Etu a sị nwaagbọghọ siri gbuo nwanne ya, merụọ nne ya na nwa nwanne ya ahụ n'Enugwu

Nwaagbọghọ gburu nwanne ya n'Enugu

Ebe foto si, Screenshot

Nkọwa foto, Nwaagbọghọ gburu nwanne ya n'Enugu
Oge e ji agụ akụkọ nkeji 2

Ozi anyị nwetara na-ekwu na nwaagbọghọ a sị aha ya bụ Oluchukwu Odo jiiri mma gbuo nwanne ya nwaanyị ma merụọ nne ya na nwa nwanne ya ahụ.

Njinji ahụ jiri n'ụzọ ụtụtụ Wenezde 2 Eprel 2025 mgbe ọ kụrụ ihe dịka elekere abụọ nke ụtụtụ n'Umuidenyi Aji Enugwu Ezike dị n'okpuruọchịchị Igbo Eze North n'Enugwu steeti.

Otu onye ntaakụkọ na-achọghị ka a kpọọ aha ya gbara nwaanyị ahụ ajụjụ ma webatara anyị akụkọ a.

Ọ sịrị na nne Oluchukwu kọorọ ya na nwa ya nwaanyị ahụ nyere ya mmanya mana oge ọ chọpụtara na e nwere ka ụtọ ya dị, o nyeghachiri ya mmanya ahụ, o were ya nye nwanne ya nwaanyị nke ọ tọtara.

Mana ka e mesịrị, nwaanyị ahụ malitere ihi ụra ma tupu nke ahụ emee Oluchukwu gara ugboro ugboro iji mara ma ọ malitela ihi ụra.

Ọ gara n'ihu kwuo na dịka Oluchukwu chọpụtara na nne ya ehiela ụra, o weere mma gbuo ya n'olu nakwa n'isi.

Ime ụlọọgwụ

Ebe foto si, Getty Images

"Nne ya jiiri anya ọnwụ tibe mkpu ma mechaa gbapụ n'ezi, were oche dochie ọnụụzọ ha".

"Mana ọ maghị na oge ahụ ọ nọ n'ezi, nwa ya nwaanyị e sila n'ime kpọchie ụzọ 'palour' ha ma banye ebe nwanne ya nwaanyị na nwa ya nọ na-ehi ụra," ka onye ntakụkọ ahụ kọrọ.

Ọ sị na Oluchukwu jiiri mma gbuo nwanne ya nwaanyị ahụ ka anụ ma gbuokwa nwa ya nwaanyị mma n'olu.

E mechara bugaa ha ụlọọgwụ bụ ebe nwaanyị ahụ na nwanwa ya nọ na-anara ọgwụgwọ ugbua.

Onye ntaakụkọ ahụ sịrị na otu ihe onyonyoo fesara n'ikuku gosiri ebe ndị uweojii na-agba Oluchukwu ajụjụ iji chọpụta ihe dunyere ya n'ụdị omume ahụ mana ọ sịrị na ọ bụ "ekwensu" banyere ya n'ime.

Ka ọ dị ugbua, anyị ka na-eche ịnata ozi rijuru afọ site n'aka ọnụ na-ekwuru ndị uweojii Enugwu steeti bụ Daniel Ndukwe.

Akụkọ ka na-abịa...