Etu a sị nwaagbọghọ siri gbuo nwanne ya, merụọ nne ya na nwa nwanne ya ahụ n'Enugwu

Ebe foto si, Screenshot
Ozi anyị nwetara na-ekwu na nwaagbọghọ a sị aha ya bụ Oluchukwu Odo jiiri mma gbuo nwanne ya nwaanyị ma merụọ nne ya na nwa nwanne ya ahụ.
Njinji ahụ jiri n'ụzọ ụtụtụ Wenezde 2 Eprel 2025 mgbe ọ kụrụ ihe dịka elekere abụọ nke ụtụtụ n'Umuidenyi Aji Enugwu Ezike dị n'okpuruọchịchị Igbo Eze North n'Enugwu steeti.
Otu onye ntaakụkọ na-achọghị ka a kpọọ aha ya gbara nwaanyị ahụ ajụjụ ma webatara anyị akụkọ a.
Ọ sịrị na nne Oluchukwu kọorọ ya na nwa ya nwaanyị ahụ nyere ya mmanya mana oge ọ chọpụtara na e nwere ka ụtọ ya dị, o nyeghachiri ya mmanya ahụ, o were ya nye nwanne ya nwaanyị nke ọ tọtara.
Mana ka e mesịrị, nwaanyị ahụ malitere ihi ụra ma tupu nke ahụ emee Oluchukwu gara ugboro ugboro iji mara ma ọ malitela ihi ụra.
Ọ gara n'ihu kwuo na dịka Oluchukwu chọpụtara na nne ya ehiela ụra, o weere mma gbuo ya n'olu nakwa n'isi.

Ebe foto si, Getty Images
"Nne ya jiiri anya ọnwụ tibe mkpu ma mechaa gbapụ n'ezi, were oche dochie ọnụụzọ ha".
"Mana ọ maghị na oge ahụ ọ nọ n'ezi, nwa ya nwaanyị e sila n'ime kpọchie ụzọ 'palour' ha ma banye ebe nwanne ya nwaanyị na nwa ya nọ na-ehi ụra," ka onye ntakụkọ ahụ kọrọ.
Ọ sị na Oluchukwu jiiri mma gbuo nwanne ya nwaanyị ahụ ka anụ ma gbuokwa nwa ya nwaanyị mma n'olu.
E mechara bugaa ha ụlọọgwụ bụ ebe nwaanyị ahụ na nwanwa ya nọ na-anara ọgwụgwọ ugbua.
Onye ntaakụkọ ahụ sịrị na otu ihe onyonyoo fesara n'ikuku gosiri ebe ndị uweojii na-agba Oluchukwu ajụjụ iji chọpụta ihe dunyere ya n'ụdị omume ahụ mana ọ sịrị na ọ bụ "ekwensu" banyere ya n'ime.
Ka ọ dị ugbua, anyị ka na-eche ịnata ozi rijuru afọ site n'aka ọnụ na-ekwuru ndị uweojii Enugwu steeti bụ Daniel Ndukwe.
Akụkọ ka na-abịa...









