Mbaka agọziela Peter Obi ma rịọ ndị nkwado ya mgbaghara

Ụkọchukwu Katọlik a ma ama n'Enugwu Steeti bụ Ejike Mbaka arịọla aka chịburu Anambra Steeti bụ Peter Obi mgbaghara maka nkatọ ọ katọrọ ya n'abalị olemole gara aga.

Mbaka rịọrọ mgbaghara a n'akwụkwọ ozi o wepụtara site n'akara Facebook ya n'ụbọchị Fraịde.

O kwuru na ọ bụ nghọtahie ka ndị mmadụ ghọtahiere ihe o kwuru.

"N'ụzọ ọbụla ụnụ si ghọtahie m, maọbụ etu ọbụla m si mejọọ, biko ghọtanụ ma gbagharanụ m," Mbaka kwuru.

Cheta na Mbaka kwuburu na "enweghị ebe Peter Obi ji azụ aga n'okwu gbasara ịbụ onyeisiala Naịjirịa na 2023".

O kwuru nke a n'ọgbakọ ekpere nke 'Adoration Ministry' nụbọchị Wenezde, abalị iri na ise nke ọnwa Jun 2022.

N'akwụkwọ ozi ya, Mbaka kwuru na ya na-ekpere Peter Obi ekpere ka uche Chineke mezuo n'isi ya.

"Ebumnuche m abụghị iluso Peter Obi ọgụ maọbụ kọtọọ ya."

"Ọ bụ enyi m ma bụrụkwa nwanne m nwoke. Ahụrụ m ya n'anya, ma na-ekpekwara ya ekpere ọma."

"Ana m agọzi Peter Obi na ndị na-akwdo ya."

"Ana m agọzikwa ndị ọzọ niile na-azọ ọkwa onyeisiala nakwa ndị nkwado ha."

"Ana m ekwe mmadụ niile nkwa na ana m ekpe ekpere ka Chineke nye anyị ezi ndị ndu na Naịjirịa ndị ga-eme uche ya."

Mbaka gara n'ihu kwuo na ya anọghị n'otu ndọrọndọrọ ọchịchị ọbụla, kama ya na-akwado onye ọbụla ga-eweta ọchịchị ọma na Naịjirịa.

"Ihe na-agụ m agụụ oge niile bụ ka Naịjirịa pụta n'ụbịam na ihe isi ike na-echere ọtụtụ mmadụ aka mgba," Mbaka kwuru.

"Ka Chineke nyere anyị aka."

Onye bụ Fada Mbaka?

Fr Ejike Camillus Mbaka bụ ụkọchukwu Katọlik na-arụ ọrụ na Dayọsis nke Enugwu, na mpaghara Ọwụwa Anyanwụ Naịjirịa.

Ọ bụkwaya ya bụ onyeisi ụlọ ekpere a na-akpọ 'Adoration Ministry Enugwu, Nigeria' (AMEN).

E chiri ya ụkọchukwu n'ọnwa Julaị nke afọ 1995, nke pụtara na ọ rụọla ọrụ dịka ụkọchukwu ihe ruru afọ 27 ugbua.

Otu ihe e ji mara Mbaka bụ na ọ na-ebukarị amụma gbasara ndọrọndọrọ ọchịchị, ntuliaka, nakwa ndị ga-emeri ntuliaka.

N'afọ 2020, Mbaka buru amụma na Hope Uzodinma ga-arigo n'oche Gọvanọ Imo Steeti.

O buru amụma a na-agbanyeghị na Emeka ihedioha bụ Gọvanọ Imo Steeti n'oge ahụ, dịka okwu ntuliaka ya kadị n'ụlọikpe.

Ulọikpe kachasị na Naịjirịa mechara chụtuo Ihedioha ma kwuo na ọ bụ Hope Uzodinma meriri ntuliaka ahụ.

Mbaka bukwere amụma na Buhari ga-emeri Jonathan na ntuliaka nke 2015, Amụma a bịakwara na mmezu.