You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.
E nweghi m 'aka gum' kama a na m asọ mmefu ego n'ụzọ ezighi ezi - Peter Obi
Peter Obi asaala ndị niile na-ekwu na o nwere 'aka gum' kwuo na ọ bụghị eziokwu kama na ọ na-asọ mmefu ego n'ụzọ ezighi ezi.
Nke a pụtara ihe dịka ya na ụlọntaakụkọ nwere mkparịtaụka n'ụbọchị ụka eji echeta ndị nna.
Ọ sị "ị gụọla ihe Bianca dere? Ọ bụ eziokwu - aka m ndị niile ahụ emefu ego mana ọ naghị adị m mma ma emefuo ego n'ụzọ ekwesighi maọbụ nke gọọmentị maọbụ nke mmaọdụ nkịtị"
Cheta na Fada ụka Katọlik bụ Ejike Mbaka bụrụ ya ọnụ ma kwuo na ọ gaghị achị Naịjirịa n'abalị ole na ole gara aga.
Ihe ọzọ Obi kwuru na ya bụ mkparịtaụka bụ na Fada Mbaka bụ ụkọchukwu echiri echichi.
Obi si "nsọpụrụ mwere ebe ọ nọ dị ya oge niile. Mgbe ọbụla o kwuru ihe ọbụla, ekpeerem okwu ahụ ekpere"
Ọ sị kwa na ọ hụrụ Mbaka n'anya.
Ndị isi ụka Katọlik nke Dayọsisi Enugu agọlahụla ụkọchukwu Ejike Mbaka maka okwu o kwuru megide Peter Obi, bụ onye na-azọ ọkwa onyeisiala Naịjirịa n'otu 'Labour Pati'.
Onye ji ọkwa 'Auxiliary Bishop' nke Enugwu bụ Ernest Anaezichukwu Obodo kwuru nke a n'akwụkwọ ozi o wepụtara na mgbede ụbọchị Tọzde.
Bishọp Obodo kwuru na ihe niile mbaka kwuru megide Peter Obi megidere iwu na-achịkwa ụka Katọlik a kpọrọ 'Canon Law'.
Akwụkwọ ozi ahụ kwuru sị: "Dayọsis ụka Katọlik nke Enugu ji ohere a na-akatọ, mana na-agọrọ onwe ya n'ihe niile Mbaka kwuru megide Peter Obi."
"Anyị na-agwa ọha mmadụ na ihe niile ahụ Mbaka kwuru bụ uche aka ya, ọ bụghị nkwekọrịta ndị ụka Katọlik na dayọsis Enugu."
"Anyị na-akpọku Mbaka ka ọ kwụsị ikwu okwu maọbụ ibu amụma nwereike ibute ọgba aghara n'obodo."
Bishop Obodo kwukwara na ndị isi ụka Katọlik nke dayọsis Enugu amalitela atụmatụ ụka wepụtara maka iso okwu dị otu a.
Ọ gakwara n'ihu rịọ ndị mmadụ ka ha gaa gbata akwụkwọ ikike ha ga-eji atụ vootu na ntuliaka 2023.
Lee ihe Peter Obi sara Mbaka maka amụma o buuru ya.
Peter Obi ji aha Labour Party azọ ọkwa Onyeisiala Naịjirịa asaala Fada Ejike Mbaka nke Adoration Ministry okwu n'ihe ọ gwara ya maka ịzọ ọkwa ahụ.
Odeakwụkwọ mgbasaozi Obi bụ Valantine Obienyem sị mgbe ya na Obi kpara n'ụtụtụ Tọzde, na ọ chọrọ ịkọrọ ya ihe Mbaka kwụrụ bụ nke na-ewu na soshal midia.
Ọ sị Peter Obi jụrụ ya, "ọ bụ gịnị ka Mbaka kwuru?"
Obienyem sị na mgbe o mepere ọnụ kpọta aha Fada Mbaka na Obi napụrụ ya okwu n'ọnụ sị, "Biko ka anyị hapụ Mbaka, kọọ ihe m jiri kpọọ gị n'ụtụtụ a".
Ọ sị na o nweghi ihe ọbụla ọ chọrọ ikwu banyere Fada Mbaka.
Obienyem gara n'ihu kwuo na Peter Obi gara mba Egypt na ọ ga-abata Naịjirịa na Tọzde.
Cheta na soshal midia nwuuru ọkụ na Wenezde maka okwu Mbaka gwara Peter Obi.
Mbaka sị na Peter Obi agaghị enweta ọkwa Onyeisiala ọ na-azọ maka na ọ bụ onye aka ntachi.
N'okwu ya "ọ ka mma onye kara nka na-emepụ aka inweta ọkwa Onyeisiala karịa onye ntọrọbịa na-eme aka ntachi.
Ọ sị na ọ gwụchala ma Obi bịara n'Adoration Ministry buo ikpere n'ala ma rịọ ya mgbaghara ma ọ bụghị ya na ọ gaghị enweta ọkwa ahụ ọ na-achọ.
Ihe mere n'ụka Mbaka mgbe o kwuru ya bụ ihe
Ndị nọ n'Adoration Ministry mgbe Mbaka kwuru ya bụ ihe gbaara BBC ama sị na ọtụtụ ndị mmadụ gbarụrụ ihụ maka ya bụ ebe ụfọdụ kuliri lawa.
Ụfọdụ na-ekwukwa sị na, "Mbaka ekwuteghị nke a".
Ihe ndị mmadụ na-ekwu
Ọtụtụ ndị mmadụ etinyela ọnụ na ya bụ okwu Mbaka kwuru banyere Peter Obi.
Ụfọdụ sị na
Ebe ụfọdụ na-ekwu na Mbaka enweghị ike ikwu ụdịrị ihe ahụ, ndị ọzọ na-ekwu na o kwesịghi ikwu okwu dị etu ahụ.
Ndị a ma ama dịka Destiny Etiko na Kanayo Kanayo katọrọ ihe a Fada Mbaka kwuru
Cheta na mgbe a na-achụ nta vootu ọkwa onyeisiala nke 2019 na Peter Obi nwere nsogbu n'Adoration maka na o kweghị ekwu ego ole ọ ga-eji gbaara ha Bazaa ebe ahụ.
Mbaka mere ihe niile ọ nwereike ka Peter kpọọ aha ego maka ọ kweghị.
Nke a wutere Mbaka nke ukwuu mere ha abụọ jiri dị ka ha anọghị n'udo ugbua.