Atiku Abubakar: Aga m anata ọgwụgwọ na Naịjirịa ma ọrịa rịa m

Onye bụbu Osote Onyeisiala Naịjirịa bụ Abubakar Atiku, ekwuola na ọ bụrụ na ya daa na ntuliaka ọkwa onyeisiala nke afọ a, na ọ ga-ewere ya n'obi ọcha maka na ọ gaghị abụ onye mbụ dara ntuliaka.

Atiku kwuru nke a na mkparịtaụka ya na BBC nwere n'ọdị nso a n'Abuja, ebe ọ nọrọ kọwaa ihe o bu n'obi ime ma ya merie ntuliaka.

O kwuru na otu ihe mere ya ji azọ ọkwa Onyeisiala ugboro ugboro bụ maka ọdịmma ụmụ Naịjirịa ndị na-abịa n'ọdịnihu nakwa ụmụ nke ya.

"Amụrụ m ọtụtụ ụmụ, zụlite ha ọfụma ma zigakwa ha n'ụlọakwụkwọ kacha mma, ma na Naịjirịa ma na mba ofesi. Mana ana m ajụ onwe m sị 'ọ bụrụ na ha lọghachi Naịjirịa, kedụ ụdị obodo ha ga-alọghachi na ya?" Atiku kwuru.

"Ọ bụkwa ụdị echiche a ka nne na nna niile na Naịjirịa na-eche gbasara ụmụ ha. Nke a mere m ji azọ ka m bụrụ Onyeisiala iji weta ọdịmma ọbụghị naanị maka ụmụ nke m, kama maka ụmụ ndị Naịjirịa niile."

Adị m njikere iwepụta ozi maka ahụike m

Atiku kwuru na asịrị na-efegharị gbasara ọnọdụ ahụike ya abụghị eziokwu n'ihi na onwebeghị mgbe ọ rịara nnukwu ọrịa ọbụla.

"Ihe m na-aga eme na mba ofesi bụ naanị nnyocha ahụike, o nwebeghị mgbe m gara maka ọgwụgw ọrịa ọbụla," ka o kwuru.

"Ọ bụ naanị n'afọ 2006 oge m dara ada merụọ ahụ n'ikpere, ka m gara Germany ebe a nọrọ dozie ya."

"Ọ bụrụ na ndị na-ahazi ntuliaka sị ka anyị wepụta akwụkwọ gosiri ọnọdụ ahụike anyị, adị m njikere iwepụta nke m."

Atiku gara n'ihu kwuo na ọ bụrụ na ya merie ọkwa Onyeisiala, na ya agaghị aga mba ofesi ịnata ọgwụgwọ ma ọ bụrụ na ọrịa na-enye ya nsogbu bụ ihe e nwereike ịgwọta na Naịjirịa.

"Mana ọ bụrụ ihe agaghị agwọtanwu na Naịjirịa, gịnị ka ị chọrọ ka m mee? Ị chọrọ ka m nọrọ nwụọ?" Atiku jụrụ.

Adị m njikere ikwupụta akụnụba m

Gbasara nkwupụta akụnụba onye nke bekee kpọrọ 'asset declaration', nke iwu kwuru na ndị ọchịchị niile kweọ̀ịrị ime, Atiku kọwara na ya na-ekwupụta akụnụba ya kwa mgbe kwa mgbe, mana ọ naghị ewepụta ya ka ọha mara.

"Ọ bụrụ na iwu kwuo na m kwesịrị iwepụta ya ka ọha mara, aga m ewepụta ya," ka o kwuru.

Ebubo nrụrụaka a na-ebo m abụghị ihe ọhụrụ

N'ọdị nso ka otu nwa amadị pụtara na soshal midia na-ebo Atiku nakwa ụfọdụ ndị ezinụlọ ya ebubo nrụrụaka dị icheiche.

N'otu n'ime ebubo ndị ahụ, nwa amadị a wepụtara onyonyo ebe otu olu dịka nke Atiku na-ekwu okwu.

Mana Atiku kwuru na ebubo ndị ahụ abụghị ihe ọhụrụ, kama o kwughị ma olu ahụ a nụrụ n'onyonyo ahụ ọ bụ nke ya n'ezie ka ọ bụghị.

"Ebubo ndị ahụ niile bụ ihe ndị ọrụ nchekwa lebagoro anya n'oge gara aga ma kwuo na onweghị ihe dị na ha," Atiku kwuru.

"Olu ahụ a nụrụ n'onyonyo ahụ egosighi ihe ọhụrụ ọbụla."