Lee ihe iwu Naịjirịa kwuru maka ndị na-azọ ọchịchị igosi ọnọdụ ahụike ha

    • Onye dere ya, Chukwunaeme Obiejesi
    • Ndị mere akụkọ a, Senior Journalist

Ọtụtụ mmadụ na Naịjirịa na-ekwu na ndị niile na-azọ ọkwa Onyeisiala na 2023 ga-ebu ụzọ gosipụta ọha akwụkwọ nnyocha gosiri ọnọdụ ahụike ha, iji mara ma ha a ga-enwekwa ike ịrụ ọrụ onyeisiala.

Okwu a pụtakwara ihe n'ụbọchị Sọnde, na nrụrịtaụka a kpọrọ 'Presidential Townhall' e nwere n'Abuja, ebe Peter Obi, onye na-azọ ọkwa onyeisiala na 'Labour Party' kwuru na ọ dị mkpa ka onye ọbụla na-azọ ọchịchị gbaa ọnọdụ ahụike ha n'anwụ.

Obi kwuru sị: "Ekwenyere m na ọ dị mkpa ka onye ọbụla chọrọ ịchị ọchịchị wepụta akwụkwọ gosiri ọnọdụ ahụike ya ka ọha hụrụ."

Ọzọkwa, onye ntaakụkọ a ma ama na Naịjirịa bụ Rufai Oseni ekwukaala ugboro ugboro na ndị Naịjirịa nwere ikike ịma ọnọdụ ahụike ndị na-achọ ịchị ha.

Site n'akara Twitter ya, Rufai jụrụ sị: "Ebe ọ bụ na mmadụ na-eme nnyocha ahụike tupu ọ banye ụlọakwụkwọ mahadum, maọbụ nweta ọrụ, gịnị mere o ji sie ike ime nnyocha ahụike maka ndị chọrọ ịbụ Onyeisiala Naịjirịa?"

Gịnị ka iwu kwuru?

Dịka ngalaba 131 nke iwu Naịjirịa si kwuo, e nwere ọtụtụ ihe ga-eme ka mmadụ tozu ịbụ onyeisiala Naịjirịa. Ha gụnyere:

Ịbụ nwaafọ Naịjirịa site n'ọmụmụ, iru afọ 40, ịnọ n'otu ndọrọndọrọ ọchịchị, ịnwe nzere mmụta 'school certificate', dgz.

Mana gbasara ahụike, ngalaba 137 (2) nke kọnstitushọn Naịjirịa kwuru na ihe ga-egbochi mmadụ ịbụ onyeisiala bụ na onye ahụ bụ:

  • onye nwere isi mgbaka, maọbụ
  • onye uche ya ezuchaghị oke

Mana onweghị ihe iwu a kwuru gbasara etu a ga-esi mata onye nwere ọnọdụ ahụike ndị a.

Ọzọkwa, tupu mmadụ amalite ọrụ dịka Onyeisiala Naịjirịa, ngalaba 140 nke iwu Naịjirịa kwuru na onye ahụ ga-ewpụtarịrị akwụkwọ ngosipụta ihe niile o nwere, nke a na-akpọ 'assets declaration'.

Naanị akwụkwọ a bụ nke iwu kwuru na onye na-azọ ọkwa onyeisiala ga-ewepụtarịrị, akwụkwọ ngosi ọnọdụ ahụike esoghi na ya.