You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.
Onyeisiala Tinubu eduola Ọchịagha Musa Christopher n'iyi ọrụ dịka mịnista nchekwa Naịjirịa
Onyeisiala Bola Tinubu eduola Ọchịagha Musa Christopher n'iyi ọrụ dịka mịnista nchekwa Naịjirịa.
Mmemme a nke mere n'obi ọchịchị Aso Rock dị n'Abuja n'ụbọchị Tọzde Disemba 4, 2025, na-abịa dịka ụlọomeiwu Sineti kwadoro nhọpụta Onyeisiala Tinubu họpụtara ya dịka onye ga-anọchị Badaru Abubakar gbara arụkwaghịm n'ụbọchị Mọnde 1 Disemba, 2025.
Nhọpụta Ọchịagha Musa na-abịa dịka a na-enwe nsogbu nchekwa na Naịjirịa. Ụfọdụ nwere olileanya na nhọpụta onyeisiala họpụtara Ọchịagha Musa ga-enyereaka chụọ ọnọdụ enweghị nchekwa ọsọ ụkwụ eru ala na Naịjirịa.
Ụlọomeiwu Ukwu ebinyela aka na nhọpụta Ọchịagha Musa Christopher dịka mịnista nchekwa
Ụlọomeiwu Ukwu anabatala nhọpụta Onyeisiala Bola Tinubu họpụtara Ọchịagha Musa Christopher dịka mịnịsta na-ahụ maka nchekwa na Naịjirịa.
Ha nabatara ya ka ha gbachara ya ajụjụ ọnụ banyere ọrụ ya nakwa etu ọ ga-esi ahazịe ọnọdụ nchekwa na Naịjirịa.
Onyeisi Ụlọomeiwu Ukwu bụ Sinetọ Godswill Akpabio jụrụ mgbe otu onye omeiwu gwara ya o rulata isi gawa ma kwuo na mmadụ niile kwesiri ịnụ ihe ọ ga-eme banyere nchekwa Naịjirịa.
N'okwu ya, Akpabio sirị, "Ndị anyị na-anọchịte anya ha chọrọ ịmara uru ọ ga-abara ha."
"Nwoke a nọ anyị n'ihu nwere ike ịbụ onye ga-egbo mkpa ịkwụsị ajọ ọnọdụ nchekwa na Naịjirịa."
"Anyị bịara n'ebe ịnọchịte anya ndị obodo anyị dị iche iche."
"Ọ ga-amasị ha ịnụ ihe ọ ga-ekwu. Ha chọrọ ịmara na ọ ga-eme ka ha rahụ ụra n'udo."
"Ha chọrọ ịmara na e nye ya ọrụ, na ụmụakwụkwọ ha aga-agụ akwụkwọ n'udo."
Ihe ndị mmadụ chọrọ ịmara – Sịnetọ Godwill Akpabio
Onyeisi ndị Sịneti bụ Godwill Akpabio kwuru na ndị chọrọ ịnụ ọtụtụ ihe gbasara ọnọdụ nchekwa na Naịjirịa.
Ọ gwara ndị omeiwu ka a hapụ ọchịagha Musa Christopher ka ọ gwa ndị mmadụ okwu ma kwuo sị"Anyị adịghị ajụ ya ajụjụ maka na anyị ahụghị ya n'anya, anyị na-ajụ ya ajụjụ maka na ndị obodo anyị kwesiri ịjụ ha ajụjụ ndị a".
"Ugbua abụghị mgba a na-asị mmadụ kpọọ isi n'ala laa gaa rụba ọrụ gị. Onyeisiala mba Amerịka bụ Donald Trump ji anyị n'onu. Anyị kwesiri ịmara ọsịsa ọ ga-enye Onyeisiala mba Amerịka".
"Ndị mmadụ chọrọ ịmara ihe mere na Kebi steeti ebe gọvanọ sị na e nwere onye nyere ikike ka ndịagha pụọ n'ụlọakwụkwọ tupu ndị ojiegbe abịa tọrọ ụmụakwụkwọ".
"Ọchịagha Uba bụ onye ọzọ a na-achọ achọ, amabeghị na e gburu ya maọbụ na-egbughị ya. Ọ kpọrọ ekwentị kwuo ebe o zoro, mana kedụ onye gwara ndị ntọ gaa ebe ahụ kpụrụ ya. Ihe a bụ ihe ndị mmadụ chọrọ ịnweta ọsịsa ya".
Nkwa ọchịagha Musa Christopher kwere
Ọchịagha Musa Christopher zara ajụjụ dị icheiche a jụrụ ya ma kwekwa nkwa ihe ọ ga-eme ma a nabata ya dịka mịnịsta na-ahụ maka nchekwa na Naịjirịa.
N'okwu ya "a ga m ebido n'ihe mere ọchịagha Uba. Ọ bụ ihe jọcgburu onwe ya. A na m agwa ndị Naịjirịa na anyị agaghị anọrọ na-ekiri ndị na-eyi ọha egwu enwe ikike ime ihe dị etua ọzọ".
"Anyị ga ebuso ndị agha. Anyị ga-ama ihe ndị agha anyị na-eme. Anyị agaghị anaba ndị ụjọ. Anyị ga-agba mbọ hụta na ha na-eme ihe ha kwesiri ime".
"Amaghị m etu naanị ọchịagha Uba si nọrọ ebe o zoro mgbe o kwesiri inwe ndịagha nke ya gbara okirikiri, anyị ga-achọpụta ihe mere ma mara ndị mere ihe a".
"Ọ bụ ajọ ihe na ndịagha pụrụ mana nwantịtị oge ha pụrụ ndị ojiegbe abịa tọrọ ụmụakwụkwọ, anyị ga-achọpụta ihe mere ma mee ka ndị niile aka ha dị ya taa ahụhụ dịrị ha".
"A na m agwa ndị Naịjirịa na m anọọla afọ iri atọ na itoolu dịka onye agha. A mara ihe na-eme, anyị ahụla ihe na-eme ọzọ bụ na anyị ma ihe anyị ga-eme"
Tinubu ahọpụtala Christopher Musa dịka Minista Nchekwa Naịjirịa
Onyeisiala Naịjirịa bụ Bola Tinubu ahọpụtala Ọchịagha Christopher Gwabin Musa bụbu onyeisi ndị nchekwa Naịjirịa dịka Minista Nchekwa ọhụrụ.
Tinubu mere nhọpụta a oge ọnọdụ nchekwa Naịjirịa na-ama jijiji, dịka a na-ahụta mwakpo ndị ntọ, ndị ojiegbe na ndị na-eyi ọha egwu n'ọtụtụ mpaghara Naịjirịa.
Nke a dị n'ozi Bayo Onanuga bụ onye ndụmọdụ pụrụiche nke onyeisiala n'ihe gbasara mgbasaozi na atụmatụ ọrụ wepụtara n'ụbọchị Tuzde 2 Disemba, 2025.
Onanuga kọwara na nke a dị n'akwụkwọ leta Onyeisiala Tinubu zigaara Onyeisi Ụlọomeiwu Ukwu Naịjirịa bụ Godswill Akpabio.
Ozi ahụ kwuru na Tinubu chọrọ ka ụlọomeiwu nabata Christopher Musa dịka onye ga-anọchi anya Alhaji Badaru Abubakar, bụ onye gbara arụkwaghịm n'ụbọchị Mọnde 1 Disemba, 2025.
Ọchịagha Christopher Musa bụ onyeagha gara ozi dịka Onyeisi ndị nchekwa Naịjirịa malite n'afọ 2023 ruo n'ọnwa Ọktoba, 2025.
Onye bụ Ọchịagha Christopher Gwabin Musa?
- Ọchịagha Musa bụ onye okpuru ọchịchị Zangon Kataf na Kaduna Steeti.
- Ọ gbara afọ 58 dịka a mụrụ ya na Sokoto Steeti n'ụbọchị 25 Disemba, 1967 bụ ebe ọ gụrụ akwụkwọ Praịmarị na Sekọndịrị.
- Ọ banyere n'ụlọakwụkwọ ndịagha bụ 'Nigerian Defence Academy' dị na Kaduna n'afọ 1986 bụ ebe ọ natara ọzụzụ ruo afọ ise ma pụta n'afọ 1991.
- E duru ya n'iyi ọrụ dịka onyeagha Naịjirịa n'ọnwa Septemba, 1991.
- O nwere nzere agụmaakwụkwọ banyere nchekwa dịka 'Advanced Diploma in Security Management' na Mahadum Lagọs, 'Advance Diploma in Defence and Strategic Course' na mba Chaịna, nakwa ndị ọzọ.
- O jidela ọtụtụ ọkwa dịka onyeagha nke gụnyere Onyeisi ngalaba ọzụzụ nke 81 Division, Ọchịagha ndị 73 Battalion, Ọchịagha ngalaba Lafiya Dole, nakwa Onyeisi ndịagha na mpaghara Lake Chad.
- Musa rụkwara ọrụ dịka Onyeisi ngalaba ndịagha a kpọrọ 'Nigerian Army Infantry Corps'.
- N'afọ 2023 ka a họpụtara Christopher Musa dịka Onyeisi nchekwa Naịjirịa ma mechaa kwụsị ya ọrụ n'ọnwa Ọktoba, 2025.
- N'ụbọchị 2 Disemba, 2025 gọọmenti Bola Tinubu họpụtara Ọchịagha Christopher Musa dịka Minista nchekwa Naịjirịa dịka onye jibu ọkwa ahụ bụ Alhaji Badaru Abubakar gbara arụkwaghịm.