Onyeisiala Tinubu eduola Ọchịagha Musa Christopher n'iyi ọrụ dịka mịnista nchekwa Naịjirịa

Ọchịagha Musa ji akwụkwọ nsọ baịbụlụ oge e duru ya n'iyi ọrụ n'obi ọchịchị Aso Rock dị n'Abuja, isiobodo Naịjirịa

Ebe foto si, Bayo Onanuga/X

Oge e ji agụ akụkọ nkeji 5

Onyeisiala Bola Tinubu eduola Ọchịagha Musa Christopher n'iyi ọrụ dịka mịnista nchekwa Naịjirịa.

Mmemme a nke mere n'obi ọchịchị Aso Rock dị n'Abuja n'ụbọchị Tọzde Disemba 4, 2025, na-abịa dịka ụlọomeiwu Sineti kwadoro nhọpụta Onyeisiala Tinubu họpụtara ya dịka onye ga-anọchị Badaru Abubakar gbara arụkwaghịm n'ụbọchị Mọnde 1 Disemba, 2025.

Nhọpụta Ọchịagha Musa na-abịa dịka a na-enwe nsogbu nchekwa na Naịjirịa. Ụfọdụ nwere olileanya na nhọpụta onyeisiala họpụtara Ọchịagha Musa ga-enyereaka chụọ ọnọdụ enweghị nchekwa ọsọ ụkwụ eru ala na Naịjirịa.

Ụlọomeiwu Ukwu ebinyela aka na nhọpụta Ọchịagha Musa Christopher dịka mịnista nchekwa

 Ọchịagha Musa Christopher dịka mịnịsta na-ahụ maka nchekwa na Naịjrịa.

Ebe foto si, Bayo Onanuga / x

Nkọwa foto, Ọchịagha Musa Christopher

Ụlọomeiwu Ukwu anabatala nhọpụta Onyeisiala Bola Tinubu họpụtara Ọchịagha Musa Christopher dịka mịnịsta na-ahụ maka nchekwa na Naịjirịa.

Ha nabatara ya ka ha gbachara ya ajụjụ ọnụ banyere ọrụ ya nakwa etu ọ ga-esi ahazịe ọnọdụ nchekwa na Naịjirịa.

Onyeisi Ụlọomeiwu Ukwu bụ Sinetọ Godswill Akpabio jụrụ mgbe otu onye omeiwu gwara ya o rulata isi gawa ma kwuo na mmadụ niile kwesiri ịnụ ihe ọ ga-eme banyere nchekwa Naịjirịa.

N'okwu ya, Akpabio sirị, "Ndị anyị na-anọchịte anya ha chọrọ ịmara uru ọ ga-abara ha."

"Nwoke a nọ anyị n'ihu nwere ike ịbụ onye ga-egbo mkpa ịkwụsị ajọ ọnọdụ nchekwa na Naịjirịa."

"Anyị bịara n'ebe ịnọchịte anya ndị obodo anyị dị iche iche."

"Ọ ga-amasị ha ịnụ ihe ọ ga-ekwu. Ha chọrọ ịmara na ọ ga-eme ka ha rahụ ụra n'udo."

"Ha chọrọ ịmara na e nye ya ọrụ, na ụmụakwụkwọ ha aga-agụ akwụkwọ n'udo."

Ọchịagha Musa Christopher dịka mịnịsta na-ahụ maka nchekwa na Naịjrịa.

Ebe foto si, Bayo Onanuga / x

Nkọwa foto, Musa Christopher

Ihe ndị mmadụ chọrọ ịmara – Sịnetọ Godwill Akpabio

Onyeisi ndị Sịneti bụ Godwill Akpabio kwuru na ndị chọrọ ịnụ ọtụtụ ihe gbasara ọnọdụ nchekwa na Naịjirịa.

Ọ gwara ndị omeiwu ka a hapụ ọchịagha Musa Christopher ka ọ gwa ndị mmadụ okwu ma kwuo sị"Anyị adịghị ajụ ya ajụjụ maka na anyị ahụghị ya n'anya, anyị na-ajụ ya ajụjụ maka na ndị obodo anyị kwesiri ịjụ ha ajụjụ ndị a".

"Ugbua abụghị mgba a na-asị mmadụ kpọọ isi n'ala laa gaa rụba ọrụ gị. Onyeisiala mba Amerịka bụ Donald Trump ji anyị n'onu. Anyị kwesiri ịmara ọsịsa ọ ga-enye Onyeisiala mba Amerịka".

"Ndị mmadụ chọrọ ịmara ihe mere na Kebi steeti ebe gọvanọ sị na e nwere onye nyere ikike ka ndịagha pụọ n'ụlọakwụkwọ tupu ndị ojiegbe abịa tọrọ ụmụakwụkwọ".

"Ọchịagha Uba bụ onye ọzọ a na-achọ achọ, amabeghị na e gburu ya maọbụ na-egbughị ya. Ọ kpọrọ ekwentị kwuo ebe o zoro, mana kedụ onye gwara ndị ntọ gaa ebe ahụ kpụrụ ya. Ihe a bụ ihe ndị mmadụ chọrọ ịnweta ọsịsa ya".

Nkwa ọchịagha Musa Christopher kwere

Gafere Ọkwa azụmahịa WhatsApp ma gaa n'ihu na-agụ
Anyị nọ na WhatsApp

Ugbua, i nwereike inweta akụkọ BBC Igbo niile n'ekwenti gị.

Pịa aka ebe a ka i soro anyị

Ebe Ọkwa azụmahịa WhatsApp kwụsịrị

Ọchịagha Musa Christopher zara ajụjụ dị icheiche a jụrụ ya ma kwekwa nkwa ihe ọ ga-eme ma a nabata ya dịka mịnịsta na-ahụ maka nchekwa na Naịjirịa.

N'okwu ya "a ga m ebido n'ihe mere ọchịagha Uba. Ọ bụ ihe jọcgburu onwe ya. A na m agwa ndị Naịjirịa na anyị agaghị anọrọ na-ekiri ndị na-eyi ọha egwu enwe ikike ime ihe dị etua ọzọ".

"Anyị ga ebuso ndị agha. Anyị ga-ama ihe ndị agha anyị na-eme. Anyị agaghị anaba ndị ụjọ. Anyị ga-agba mbọ hụta na ha na-eme ihe ha kwesiri ime".

"Amaghị m etu naanị ọchịagha Uba si nọrọ ebe o zoro mgbe o kwesiri inwe ndịagha nke ya gbara okirikiri, anyị ga-achọpụta ihe mere ma mara ndị mere ihe a".

"Ọ bụ ajọ ihe na ndịagha pụrụ mana nwantịtị oge ha pụrụ ndị ojiegbe abịa tọrọ ụmụakwụkwọ, anyị ga-achọpụta ihe mere ma mee ka ndị niile aka ha dị ya taa ahụhụ dịrị ha".

"A na m agwa ndị Naịjirịa na m anọọla afọ iri atọ na itoolu dịka onye agha. A mara ihe na-eme, anyị ahụla ihe na-eme ọzọ bụ na anyị ma ihe anyị ga-eme"

Tinubu ahọpụtala Christopher Musa dịka Minista Nchekwa Naịjirịa

Tinubu ahọpụtala Christopher Musa dịka Minista nchekwa Naịjirịa

Ebe foto si, Defence Headquaters/X

Onyeisiala Naịjirịa bụ Bola Tinubu ahọpụtala Ọchịagha Christopher Gwabin Musa bụbu onyeisi ndị nchekwa Naịjirịa dịka Minista Nchekwa ọhụrụ.

Tinubu mere nhọpụta a oge ọnọdụ nchekwa Naịjirịa na-ama jijiji, dịka a na-ahụta mwakpo ndị ntọ, ndị ojiegbe na ndị na-eyi ọha egwu n'ọtụtụ mpaghara Naịjirịa.

Nke a dị n'ozi Bayo Onanuga bụ onye ndụmọdụ pụrụiche nke onyeisiala n'ihe gbasara mgbasaozi na atụmatụ ọrụ wepụtara n'ụbọchị Tuzde 2 Disemba, 2025.

Onanuga kọwara na nke a dị n'akwụkwọ leta Onyeisiala Tinubu zigaara Onyeisi Ụlọomeiwu Ukwu Naịjirịa bụ Godswill Akpabio.

Ozi ahụ kwuru na Tinubu chọrọ ka ụlọomeiwu nabata Christopher Musa dịka onye ga-anọchi anya Alhaji Badaru Abubakar, bụ onye gbara arụkwaghịm n'ụbọchị Mọnde 1 Disemba, 2025.

Onye bụ Ọchịagha Christopher Gwabin Musa?

Onye bụ Ọchịagha Christopher Gwabin Musa?

Ebe foto si, Defence Headquaters/X

  • Ọchịagha Musa bụ onye okpuru ọchịchị Zangon Kataf na Kaduna Steeti.
  • Ọ gbara afọ 58 dịka a mụrụ ya na Sokoto Steeti n'ụbọchị 25 Disemba, 1967 bụ ebe ọ gụrụ akwụkwọ Praịmarị na Sekọndịrị.
  • Ọ banyere n'ụlọakwụkwọ ndịagha bụ 'Nigerian Defence Academy' dị na Kaduna n'afọ 1986 bụ ebe ọ natara ọzụzụ ruo afọ ise ma pụta n'afọ 1991.
  • E duru ya n'iyi ọrụ dịka onyeagha Naịjirịa n'ọnwa Septemba, 1991.
  • O nwere nzere agụmaakwụkwọ banyere nchekwa dịka 'Advanced Diploma in Security Management' na Mahadum Lagọs, 'Advance Diploma in Defence and Strategic Course' na mba Chaịna, nakwa ndị ọzọ.
  • O jidela ọtụtụ ọkwa dịka onyeagha nke gụnyere Onyeisi ngalaba ọzụzụ nke 81 Division, Ọchịagha ndị 73 Battalion, Ọchịagha ngalaba Lafiya Dole, nakwa Onyeisi ndịagha na mpaghara Lake Chad.
  • Musa rụkwara ọrụ dịka Onyeisi ngalaba ndịagha a kpọrọ 'Nigerian Army Infantry Corps'.
  • N'afọ 2023 ka a họpụtara Christopher Musa dịka Onyeisi nchekwa Naịjirịa ma mechaa kwụsị ya ọrụ n'ọnwa Ọktoba, 2025.
  • N'ụbọchị 2 Disemba, 2025 gọọmenti Bola Tinubu họpụtara Ọchịagha Christopher Musa dịka Minista nchekwa Naịjirịa dịka onye jibu ọkwa ahụ bụ Alhaji Badaru Abubakar gbara arụkwaghịm.