Taoreed Lagbaja bụ Onyeisi ndịagha Naịjirịa anwụọla

Ebe foto si, Nigerian Army
Onyeisiala Naịjirịa bụ Taoreed Abiodun Lagbaja dịka ọ gbachara afọ iri ise na ise (56yrs).
Ọ bụ Onyeisiala Naịjirịa bụ Bola Tinubu kwupụtara ọnwụ ya site n'ozi onye nyemaka ya bụ Bayo Ononuga wepụtara.
N’akwụkwọ ọzị ahụ Onyeisiala Tinubu kwuru na “Taoreed Abiodum Lagbaja nwụrụ ka ọ rịachara obere ọrịa n’ụbọchị tuzde na Legos steeti”.
Mana ozi ahụ ekwughi kpọmkwen n'ụbọchị Tuuzde nke ọ bụ.
Onyeisiala Naịjirịa nyere Lagbaja ọkwa onyeisi ndịagha n’ọnwa n'ụbọchị 19 Juun afọ 2023.
Cheta na kepu kepu pụtara n'izuụka ole ma ole gara aga ma kwuru na Lagbaja anwụọla nke malitere iwu na soshal midia.
Mana ndịagha Naịjirịa wepụtara ozi, kwuo na nke ahụ bụ akụkọ ụgha ma sị na Lagbaja gara ezumike maka nlekọta ahụike ya.
Etu njem ndụ ọchịagha Taoreed Lagbaja siri gaa

Ebe foto si, Nigerian Army/X
- A mụrụ Lagbaja n’obodo Ilobu dị n’okpuruọchịchị Irepodun nke Osun Steeti n’ụbọchị 28 Febụwarị afọ 1968.
- Ọ gụrụ akwụkwọ praịmarị n’ụlọakwụkwọ ‘Local Authority Teachers College’ dị n’Osogbo site n’afọ 1973 ruo 1979
- Gụọ sekọndịrị n’ụlọakwụkwọ St. Charles Grammar dịkwa n’Osogbo site n’afọ 1979 ruo afọ 1984.
- Ọ gụkwara akwụkwọ dị elu na Politeknik dị n’Ibadan site n’afọ 1984 ruo 1986.
- Ọ banyere n’ụlọakwụwkọ ndị nchekwa ‘Nigerian Defence Academy’ n’ụbọchị 12 Sepụtemba 1987 na ndị agba 39th Regular Course.
- E duru ya n’iyi ọrụ dịka onye agha Naịjirịa n’ụbọchị 19 Sepụtemba 1992 na ngalaba ‘Nigerian Army Infantry Corps’.
- Ọchịagha Lagbaja anatala ọzụzụ dị iche iche n’ọrụ ndịagha nke gụnyere; Young Officers’ Course (Infantry), ‘Basic Airbone’, ‘Amphibious Staff Operation’, ‘Company Commander’s Course’ dgz.
- O jiekwala ọtụtụ ọkwa n’ọrụ ya dịka onye agha dịka onyeisi ngalaba Specia Forces Battalion Makurdi, Onyeisi ngalaba ọzụzụ ndịagha, onyeisi ngalaba 9 Brigade Command dị n’Ikeja.
- O ritela ọtụtụ nturuugo n’ọrụ ya ma na Naịjirịa nakwa mba ofesi.
- O nwere nzere ‘Bsc Geography’ na Nigerian Defence Academy nakwa ‘Msc Strategic Studies’ n’ụlọakwụkwọ US Army War College n’afọ 2014.
- Lagbaja nwụrụ dịka ọ nọchara n'ọkwa onyeisi ndịagha Naịjirịa otu afọ na ọnwa ise.





