Ihe anya mmiri: etu ọnọdụ dị n'Enugwu n'ụlọ ndị ụkọchukwu Capuchin 7 nwụrụ anwụ

Oge e ji agụ akụkọ nkeji 2

Ebe niile deere jụụ dịka BBC Igbo batara na Capuchin Enugwu bụ Ụlọ ndị ụkọchukwu asaa nwụrụ n'ihe mberede nke okproụzọ na krọss Riva Steeti ụbọchị atọ nke ọnwa Mee 2025.

Ndị mmadụ ji nwayọọ nwayọọ na-abata n'obi ndị "monk" maka ihe ọdachi ahụ.

Fada Martins onye Capuchin gwara BBC Igbo na obi agbawaala ha niile n'ihi na ọ bụ ụmụ nne ha na ndị enyi ha nwụrụ anwụ.

"Anyi niile nọ na Obudu ahụ mechaa nzụkọ. A nọ m n'ụgbọala ọzọ tupu m nụ na njinji ejiela."

Ka ọ dị ugbua, e si m na ụlọọgwụ ebe a na-agba ọkpụkpụ bụ Orthopedic Hospital dị n'Enugwu pụta ugbua.

"Ebe ahụ ka ndị meruru ahụ na-anara ọgwụgwọ"

Fada Martins gara n'ihu kwuo sị "anyị nọ n'iru uju maka ndị nwụrụ anwụ, ma nọrọkwa n'ekpere ka ndị nọ n'ụlọ ọgwụ gbakee"

Na mgbede ụnyịahụ bụ Mee 5, 2025, ọtụtụ mmadụ gbakọrọ na ya bụ Capuchin dị na Ridgeway Rd Enugwu ebe a nọ wee kaara ndị niile nwụrụ anwụ ụka ọnwụ.

Ọtụtụ ndị ụkọchukwu, ndị echichi ụmụnwaanyị bụ "Reverend Sisters" na ndị nkiti gbakọrọ ị sonyere ha ruu uju.

Mana ụgbua dịka akụkọ a na-apụta, ozi mgbe a ga-eli mmadụ asaa ndị ahụ nwụrụ anwụ apụtabeghi.

Ụzụ akwa na-ada n'Enugwu maka ọnwụ ndị ụkọchukwu katọliki 7 nwụrụ na kross Riva steeti

Ngalaba ụlọ ụka katọlik a na-akpọ "Order of Frairs Minor Capuchen, St. Francis and St. Clare Custody of Nigeria" bụ otu ndị ụkọchụkwu akwaala arịrị maka ọnwụ ndị otu ha nwụrụ ka ha gachara Obudu dị na Kross Riva steeti.

Ha mere ka a mata nke a n'akwụkwọ ozi ode akwụkwọ ha bụ John-Kenedy Anyanwu binyere aka.

Dịka akwụkwọ ozi ahụ siri kwuo "anyi ji obi nwute na-ekwupụta ọnwụ ụmụ nne anyị na ndị otu anyị nwụrụ n'abalị atọ nke ọnwa Mee, 2025 mgbe ha si Enugwu gaa Obudu dị na Kross Riva steeti".

"Ha dị mmadụ iri na atọ si Enugwu gaa Obodu, Kross Riva steeti, mana mmadụ asaa n'ime ha nwụrụ n'ihe mgberede okporo ụzọ".

"Anyị nwere okwukwe na ha ga-ebilite n'ọnwụ soro Jeso laa n'Igwe".

Aha ndị ahụ nwụrụ anwụ gunyere:

  • Br. Somadina Ibe-Ojuludu
  • Br.Chinedu nwachukwu
  • Br. Marcel Ezenwafor
  • Gerald nwogueze
  • Br. Kingsley Nwosu
  • Br. Wilfred Aleke
  • Br. Chukwudi Obueze.

Anyanwu gara n'ihu kọwaa na ha ga-ama ọkwa usoro olili ozu n'oge na-adịghị anya.