Onye bụ Kadịnal Peter Ebere Okpaleke nwa Naịjirịa tozuru ịzọ ọkwa Popu?

Oge e ji agụ akụkọ nkeji 3

N'ụka Katọlik, ọkwa Popu bụ ọkwa kachasị elu ma bụrụ ọkwa onye ndu ụka Katọlik n'ụwa niile.

N'abalị ole na ole gara aga Popu Francis bụ onye ji ọkwa ahụ nwụrụ anwụ ka ọ rịachara ọrịa oyi nakwa ọrịa ndị ọzọ na Vatịkan mgbe ọ dị afọ 88.

Mana dịka a na-achọ onye ga-abụ Popu ọhụrụ, ndị mmadụ na-aju ajuju ma o nwere ndị Kadịnal si na Naịjirịa tozuru ịbụ Popu , ọkachasị "onye bụ Kadịnal Ebere Okpaleke".

Cheta na ọkwa kadịnal n'ụka Katọlik bụ ọkwa dị elu. Ọ bụ site na ndị nọ n'ọkwa kadịnal ka a na-ewepụta onye ga-abụ Popu ma bụrụkwa ndị na-eme ntuliaka iji họpụta Popu ọhụrụ.

Onye bụ kadịnal Peter Ebere Okpaleke?

A mụrụ kadịnal Peter Ebere Okpaleke n'ọnwa Maachị 1, 1963 n'Amesi dị n'Anambra steeti, Naịjirịa.

Nne na nna ya bụ Reuben Ezeuko Okpaleke na Bridget Ekejimma Okpaleke bụ ndị nwụrụla anwụ ugbua.

Ha abụọ si n'Umuokpalawuzie dị n'obodo Umuocha dị n'Amesi, n'okpuru ọchịchị Aguata dị n'Anambra Steeti.

Kadịnal Peter Ebere Okpaleke gụrụ akwụkwọ n'ụlọakwụkwọ ndị ụka a na-akpọ Bigard Memorial Major Seminary, dị n'Ikot-Ekpene.

Ọ gụrụ akwụkwọ gbasara 'philosophy' na 'theology' n'afọ 1983.

Mbido kadịnal Okpaleke dịka ụkọchukwu?

E chiri Okpaleke ụkọchukwu n'Ọgọst 22, 1992. Ọ rụkwara ọrụ na ngalaba dị iche iche n'ime Dayọsis Awka.

Ọ rụrụ ọrụ dịka chaplain mahadum, ụkọchukwu parishị, onye na-ahụ maka ego na dayọsis nakwa chanselọ ndị dayọsis.

Sita na 1999 ruo 2002 ka ọ gụchara akwụkwọ banyere iwu Kanon (canon law) na mahadum Pontifical nke Holy Cross dị na Rome.

Etu Okpaleke siri bụrụ kadịnal

N'abalị asaa nke ọnwa Disemba 2012 ka Popu Benedict XVI nyere ya ọkwa Bishọp, ma ziga ya na dayọsis Ahiara dị n'Imo steeti.

Ndị ụkọchukwu na ndị isi ụka n'Ahịara jụrụ ya ma kwuo na ha achọghị ịhụ ya ma na-eme ngagharịiwe banyere ya.

Ha sị na ọ bụghị onye agbụrụ ha, ma kwuo na ọ dịghị asụ asụsụ obodo ha.

N'agbanyeghị na e mere ya Bishọp na Mee 21, 2013 ndị ụka ekweghị ya zọọ ụkwụ n'Ahiara Dayọsis. Ha jiri ngagharịiwe kwụsị ya nke mere na Popu Francis tinyere ọnụ n'ihe na-eme.

Popu Francis gwara ndị ụkọchukwu nọ n'Ahiara ka ha dee akwụkwọ kwupụta na ha na-erube isi n'ọchịchị ụka Katọlik maọbụ e nye ha ọpịpịa. Ndị ụkọchukwu ahụ dere akwụkwọ ahụ mana ọ kwụsịghị ha ijụ Okpaleke dịka Bishọp ha.

Okpaleke dere akwụkwọ arụkwaghịm degara Popu Francis na Febuwarị 19, 2018, sị na ya apụọla n'ọkwa dịka Bishọp Ahiara.

Ka nke ahụ mechere, n'ọnwa Maachi 5, 2020 ka Popu Francis nyere Okpaleke ọkwa Bishọp nke Dayọsis ọhụrụ o kepụtara bụ Ekwulobia n'Anambra steeti.

N'ọnwa Eprel 29, 2020 ka Okpaleke banyere n'ọkwa dịka Bishọp Dayọsis Ekwulobia.

N'ọnwa Ogost 2022 Popu Francis bugoro Bishọp Okpaleke n'ọkwa dị o mere ya Kadịnal.

Okpaleke dịka naanị kadịnal si Naịjirịa tozuru ịzọ ọkwa Popu ugbua

Ugbua, Naịjirịa were ndị kadịnal mmadụ anọ mana ọ bụ naanị Kadịnal Peter Opkaleke tozuru ịzọ ọkwa Popu dịka iwu ụka Katọlik si kwado.

Iwu ahụ machiri ndị kadịnal gafere afọ iri asatọ ịzọ ọkwa Popu bụ ihe mere o jiri bụrụ naanị Kadịnal Peter Okpaleke bụ onye si Naịjirịa nwereike ịzọ ọkwa ahụ.

Okpaleke dị afọ 62, ebe kadịnal ndị ọzọ gụnyere Francis Arinze dị afọ 92, Kadịnal Anthony Okogie dị afọ 88 ebe kadịnal John Onaiyekan dị afọ 81.