Iran Protest: Ihe mere ndị ntorobịa Iran ji sị na ozuola bụ ozuola

Ngagharịiwe kpụ ọkụ n'ọnụ na-aga n'ihu ugbua na mba Iran dịka ndị ntorobịa mba ahụ na-ekwu na mmekpa ahụ nakwa aka ike ndị ọchịchị ezuola.

Ihe malitere ngagharịiwe a bụ ọnwụ otu nwaanyị aha ya bụ Mahsa Amini n'aka ndị uweojii ndị jichiri ya n'ihi na ọ fụghị ịchafụ 'hijab' n'isi ya.

Mana ya bụ ngosipụta iwe abụghịzị naanị maka ọnwụ Mahsa Amini, ndị ntorobịa Iran na-ekwu na o teela ha ji diwe nrụrụaka ndị ọchịchị, ọnọdụ ụbịam, mgbali elu ọnụego, na enweghị ohere ibi ndụ etu o si masị onye.

Nke a abụghị ngagharịiwe mbụ a na-eme na mba Iran, mana ọtụtụ na-ekwu na nke a pụrụ nnọọ nnukwu iche.

Ngagharịiwe maka ikike dịịrị ụmụnwaanyị

Otu ihe gbara ọkpụrụkpụ maka ngagharịiwe nke a bụ na ụmụnwaanyị ji ohere a ekwusi okwu ike maka ikike dịịrị ha.

Na mba Iran, a na-amanye ụmụnwaanyị ka ha na-afụchi isi ha oge niile, nwaanyị enweghị ikike ime njem naanị ya, nwaanyị enweghị ikike ịrụ ọrụ, nwata gaferela afọ asaa agaghị anọ n'aka nne ya.

N'oge e tinyere iwu ndị a, ndị nwoke Iran agbaghaghị ya ma ncha, mana ugbua, ọtụtụ ụmụnwoke akwụnyerela ụmụnwaanyị n'ịkpọ oku maka ikike dịịrị ụmụnwaanyị.

Onyonyo gosiri ebe ọtụtụ ụmụnwaanyị na-eyipu ịchafụ 'hijab' ha ma mụnye ha ọkụ.

Ihe ruru mmadụ 30 anwụọla na ngagharịiwe a ugbua dịka ndị ọrụ nchekwa ji aka ike achụsasị ndị mmadụ, mana nke a emeghị ka ndị ntorobịa kwụsị.