Iran Protest: Ihe mere ndị ntorobịa Iran ji sị na ozuola bụ ozuola

Ndị ntorobịa Iran na-eme ngosipụta iwe na Tehran, isi obodo mba ahụ

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto, Ndị ntorobịa Iran na-eme ngosipụta iwe na Tehran, isi obodo mba ahụ

Ngagharịiwe kpụ ọkụ n'ọnụ na-aga n'ihu ugbua na mba Iran dịka ndị ntorobịa mba ahụ na-ekwu na mmekpa ahụ nakwa aka ike ndị ọchịchị ezuola.

Ihe malitere ngagharịiwe a bụ ọnwụ otu nwaanyị aha ya bụ Mahsa Amini n'aka ndị uweojii ndị jichiri ya n'ihi na ọ fụghị ịchafụ 'hijab' n'isi ya.

Mana ya bụ ngosipụta iwe abụghịzị naanị maka ọnwụ Mahsa Amini, ndị ntorobịa Iran na-ekwu na o teela ha ji diwe nrụrụaka ndị ọchịchị, ọnọdụ ụbịam, mgbali elu ọnụego, na enweghị ohere ibi ndụ etu o si masị onye.

Nke a abụghị ngagharịiwe mbụ a na-eme na mba Iran, mana ọtụtụ na-ekwu na nke a pụrụ nnọọ nnukwu iche.

Ngagharịiwe maka ikike dịịrị ụmụnwaanyị

Mahsa Amini

Ebe foto si, Ezinụlọ Mahsa Amini

Nkọwa foto, Mahsa Amini nwụrụ n'aka ndị uweojii dịka ha jichiri ya maka na ọ fụghị ịchafụ 'hijab'

Otu ihe gbara ọkpụrụkpụ maka ngagharịiwe nke a bụ na ụmụnwaanyị ji ohere a ekwusi okwu ike maka ikike dịịrị ha.

Na mba Iran, a na-amanye ụmụnwaanyị ka ha na-afụchi isi ha oge niile, nwaanyị enweghị ikike ime njem naanị ya, nwaanyị enweghị ikike ịrụ ọrụ, nwata gaferela afọ asaa agaghị anọ n'aka nne ya.

N'oge e tinyere iwu ndị a, ndị nwoke Iran agbaghaghị ya ma ncha, mana ugbua, ọtụtụ ụmụnwoke akwụnyerela ụmụnwaanyị n'ịkpọ oku maka ikike dịịrị ụmụnwaanyị.

Onyonyo gosiri ebe ọtụtụ ụmụnwaanyị na-eyipu ịchafụ 'hijab' ha ma mụnye ha ọkụ.

Ihe ruru mmadụ 30 anwụọla na ngagharịiwe a ugbua dịka ndị ọrụ nchekwa ji aka ike achụsasị ndị mmadụ, mana nke a emeghị ka ndị ntorobịa kwụsị.