Ihe mere ndị Ilaje ji atụnye nwa ọhụrụ na mmiri

Na nsonso a, ihe onyonyo gosiri ebe a tụnyere nwa ọhụrụ n'osimmiri dịka a na-eme emume omenala n' Osun Steeti kpọtụrụ na soshal midia nke kpalitere ụka banyere ya bụ ihe.
Nke mere ka BBC mee nnyocha iji zaa ụfọdụ ajụjụ nke ọha ndị mmadụ na-ajụ banyere ya bụ omenala .
Nke a bụ omenala nke ndị Ijọ na ndị Ilaje bi nso n'osmmiri nakwa ndị Yoroba ndị nkwenyere n'arụsị Ọshụn nakwa osimmiri Oya.
Gịnị mere ụfọdụ ji atụnye nwa ọhụrụ n'osimmiri?

Ndị bi n'ikpere mmiri dịka ndị Ilaje, ndị Ijọ na ndị na-efe mmụọ mmiri Ọshụn nwere nkwenye na mmiri bụ ndụ na a gaghị enweli nkewa n'etiti ha na ụmụ ha na osimmiri.
Ndị Ilajes bụ ndị Yoroba nọ n' Ondo steeti bụ ndị ha na ndị Ijebu, Itsekiri, Ikale na Apoi Ijaw gbara agbataobi.
A na-ahụkwa ha n'ebe ndị ọzọ dị iche iche dịka na Douala (Kamerun), Sapele nakwa Warri (Delta), Asejire (Oyo) nakwa ebe ụfọdụ na Legọs bụ ebe ndị ha zọpụrụ m njem ga biri.
N'aka nke ọzọ, ndị Ịjọ so n' agbụrụ kachasị ochie na Naijiria.
A ma dịka “ Izon” maọbụ alaka ndị Naija-Delta ma bụrụ ndị a na-ahụ na mba mmiri nna Bayelsa, Delta, Rivas, Akwa-Ibom, Edo nakwa Ondo steeti, na Naijiria.
Ndị ọkachamara n'akụkọ ihe mere oge ochie na-ekwu na ha bụ ụmụ Oru so mmiri si ndagwurugwu Osimiri Nile nakwa ọgbammiri Chad dị n'Ọwụwị̀a Anywanwu Ugwu Naijiria were bịa ebe ha bi ugbua.
Mmụọ mmiri Ọshụn so n'arụsị ndị Yoruba dị na Ọdịda Anyanwụ Naijiria na-efe maka ọmụmụ nakwa nchekwa nke a ma ama n'Osogbo, dị n' Oshun steeti.
Akụkọ kwuru na mmụọ miri ahụ b.ụ otu n'ime ụmụnwaanyị nke Arụsị a kpọrọ Sango lụrụ.
A na-eme mmemme ya kwa afọ n' okwu ya dị n' Ọshụn Osogbo, Ọshụn steeti.
Ihe mere ndị Ijọ , Ilaje ji atụnye ụnmụaka ọhụrụ na n'osimmiri

Otu onye okenye mabụrụkwa onyenkuzi n'obodo Bolowo dị n' Okpuru Ọchịchị Ilaje Ese Odo dị n' Ondo steeti bụ Lolo Mercy Tansemi kọwara na omenala ahụ abụghị iji megide nwata ọbụla kama iji kuziri nwa ahụ mkpa mmiri dị.
Tansemi sịrị: “ Ịtụnye nwa na mmiri bụ ihe dị ndị be anyị bụ ndị Ijọ ezigbo mkpa.".
O kwuru na ndị Ijọ na ndị Ilaje bu ndị mmiri gbara okirikiri nke mere ka ha chọọ ka ụịmụaka ọhụrụ ha mata mmiri malite n'oge eku ha n'aka.
Tansemi kwuru na ha anaghị etinye nwa ọhụrụ na mmiri ozigbo kama ha na-eche ka o rute ihe dịka ọnwa abụọ tupu a tụnye ya na mmiri.
O kwuru na ọ bụ omenala ndị be ha ime ka ụmụ ha mata mmiri n'oge.
Ihe ndị na-efe Ọshụn ji atụnye nwa na mmiri

Oloye Ifayemi Elebuibon, onye omenala Yoroba doro anya kọwara ezinaụlọ ọbụla n'ala Yoroba nwere omenala na nkwnye ka si n'aka nnanna ha rute ha aka.
Elebuibon kọwara na omenala ịtụnye nwa na mmiri na-adịkarị n'ezinaụlọ ndị na-efe agbara mmiri Ọshụn ma bụrụ ihe ha jị gosi nwa ọhụrụ mmiri bụụ njirimara agbara mmiri Ọshụn.
Ọ sịrị,: “Ịtụnye ụmụaka ọhụụ na mmiri bụ iji mee ka ọ mara mmiri ma mata omenala ndị Ọsụn.”.
O kwuru na ọ bụ ụzọ dị mkpa e ji eme ka nwata mata omenala agbụrụ ya.
O kwuru na ọ bụghị ihe egwu n'ihe na ọ bụ na ikperemmiri ka a na-ene ya , ọ bụghị n'ebe mmiri emi.
Ifayemi Elebuibon gara n'ihu kwuo na uru dị na ya bụ omenala gụnyere ime ka nwata mata omenala nakwa igosi mkpa mmiri dị bụ omenala ha na-eme ma nwa ọhụrụ dị agbata ọnwa abụọ na ọnwa isii.
Nchịkọta
E wezụhga omenala ịgọrọ nwata ahụ mmiri, ịtụnyte nwa ọhụrụ na mmiri bụ ihe ọzọ ha jụ atụle nna mụrụ nwa ahụ n'ezie n'ala Yoroba nakwa ebe ndị ọzọ.
Mana e mebiela omenala a na mpaghara dị iche ice












