Lee ndị ọkamgba na-azọ ịnọchi Ikpeazu n'ocheeze Abia Steeti

Aka elekere na-akụzi kwarapụ kwarapụ maka Gọvanọ Abia Steeti bụ Okezie Ikpeazụ, dịka afọ asatọ ya ka onye nke mbụ na steeti ahụ na-abịa n'isi njedebe.

N'ụbọchị Satọde, bụ ụbochị 18 nke ọnwa Maachị ka a gaeme ntuliaka iji mata onye ga-anọchi Ikpeazụ dịka Gọvanọ malite n'ụbọchị 29 nke ọnwa Mee 2023 ruo 2027.

Ka ọ dị ugbua pati iri na isii na-azọ ọkwa gọvanọ n'Abia Steeti, kama ọtụtụ na-ekwu na ọ bụ anọ maọbụ ise n'ime pati ndị a ka ha na-eche ụkwụ siri ike ịzọta ihe na ndọrọndọrọ ahụ.

Lee ha ebe a?

Okey Ahiwe - PDP

  • Otu 'Peoples Democratic Party' (PDP) họpụtara Ahiwe ka ọ nọchie anya Ọkammụta Uche Ikonne lara mmụọ
  • Ahiwe bụbu onyeisi ndị ọrụ (Chief of Staff) nke gọvanọ Ikpeazu
  • Ọ bụ onye Umuire, Eziama Ntigha, n'okpuru ọchịchị Isiala Ngwa North.

Ikechi Emenike - APC

  • Emenike bụ onye Ohuhu n'Umuahia, Abia Steeti
  • Ọ rụrụ ọrụ dịka onye ntaakụkọ a ma ama tupu ọ banye ndọrọndọrọ ọchịchị
  • Ọ zọọla ọkwa gọvanọ Abia Steeti ugboro ugboro

Alex Otti - LP

  • Ọ bụ onye Isiala Ngwa
  • Ọ bụbu onyeisi otu ụlọakụ a ma ama na Naịjirịa
  • O nwetara nzere 'first class' na ngalaba ọmụmụ 'Economics' na mahadu Pọt Hakọt n'afọ 1988
  • Ọ zọrọ ọkwa gọvanọ Abia Steeti na pati APGA n'afọ 2015

Gregory Ibe - APGA

  • Ọ bụ ya hibere Gregory University dị n'Uturu, Abia Steeti
  • Ọ bụ ọkammụta na ngalaba 'Entrepreneurial science'
  • Ọ nọburu na PDP ma mechaa pụọ banye APGA ebe ọ nọzi ugbua

Enyinnaya Chima Nwafor - YPP

Ọ bụ onye Mbutu, dị n'Osisioma, Abia Steeti

Nna ya bụ Chima nwafor bụbu osote Gọvanọ n'Abia Steeti na 1992 ruo 1993

Ọ gụrụ akwụkwọ na mahadum Tekịnụzụ dị n'Owere (FUTO) ebe o nwetara ọzụzụ na ngalaba 'Electrical Engineering'

Ọ nọbukwara na PDP tupu ọ banye 'Young Progressives Party (YPP)

Mascot Uzor Kalu - APP

  • Nwanne ya bụ Orji Uzor Kalu chịrị Abia Steeti afọ asatọ bido na 1999 ruo 2007
  • Ọ nọburu na PDP nakwa APC tupu ọ pụọ banye APP
  • Ọ gụrụ akwụkwọ Mahadum na 'University of South Carolina na mba Amerịka ma nweta ọzụzụ na ngalaba 'Economics'

Gladys Ikonnaya Ngozika Johnson-Ogbuneke - SDP

  • Ọ bụ onye Ovim di n'Isuikwuato n'Abia Steeti
  • Ọ bụ dọkịta ahụike nakwa onye ọkaiwu na mba UK
  • Ọ gụrụ akwụkwọ na mahadum Naịjirịa dị na Nsukka

Ukpai Iro Ukpai

  • Ọ bụ onye ọkacha mara na ngalaba mmanụ agbịdị na ikuku gaasị na Naịjirịa
  • Ọ nọbu na APC tupu ọ pụọ banye NNPP
  • Ọ bụ onye Ohafia n'Abia Steeti

Nnenna Ngwa'Mma Lancaster-Okoro - PRP

  • Ọ zọbuola ọkwa sineti maka FCT na 2019 na pati YPP,
  • Ọ zọkwaala ọkwa Sineti Abia North na 2015 na APC
  • Ọ bụ ọkaiwu

Anagha Ndukwo Anagha - APM

Ọ bụ 'Architect'

Ọ bụ onye Abiriba nke dị n'okpuru ọchịchị Ohafia.