Etu ị ga-esi jiri ịzụ nchị bụrụ ọgaranya - Eluwa, Eze nchi na Naịjirịa
Nchi so na otu n'ime nrị na-amasị ndị bi na Naijirịa, ọkachasị ndị bi n'ọwụwa anyanwụ Naijirịa.
Nchi bụ anụ ọhịa kama akụkọ a bụ maka ndị bidoro ịkpa nchi dịka anụ ụlọ na anụ ha ji agba mgbere.
Chinedu Eleuwa bụ onye ọrụ ugbo lekwasịrị anya n'ịzụpụta anụ nchi kọwaara BBC Igbo uru anụ nchi bara na ihe mere o jiri banye n'ọrụ ịzụ nchi.
Nwamadị a a na-akpọ 'eze nchi' ma bụrụkwa onyeisi otu ndị na-azụ nchi a kpọrọ 'Grasscutters Farmers Association' na Naịjirịa sị na o nwere mmasị n'ọrụ ugbo nke ukwuu.

Ọ sị na ọ malitere ịzụ nchi n'afọ 2012 mgbe o fechara ala nna ya bụ 'National Youth Service Corps (NYSC)'.
Na ọ gara n'ụlọorụ ebe a na-azụ ndị ọrụ ugbo 'Forestry Research Institute of Nigeria' dị n'Ibadan, na ọ hụrụ ebe a na-azụ nchi nke mere o jiri nwee mmasị ịzụ nchi.
Eleuwa sị na ọ gara ọzụzụ etu e si azụ nchi n'otu afọ ma malitezie zụwa nchi iji nyere onwe ya aka.
Onye ọzọ tinyere ọnụ n'ọkwu a bụ ọkammụta Cordelia Ebenebe bụ onye ọkaibe na sayensi n'ihe gbasara ụmụ anụmanụ.
Oriakụ Ebenebe bụ kwa onye nyochara ma gụọ maka nchị nke ọma nke bekee na-akpọ 'Doctorate'.
Ọ kọwara na nchị na-edozi ahụ nke ọma ma sịkwa na ebido zụwa nchi ebe ọ dị ukwu na ọ ga-enyere aka kwalite etu ndị Naijirịa , ọkachasị ndị bi n'ọwụwa anyanwụ na-etu ha si azụ nchi.
Ebenebe kọwara etu ịzụ nchị si akwado ọdịmma mbara ezi n'ihi na ọ na-egbochi ndị dịnta isu ọhịa ọkụ mgbe ha na-achụ nta nchị.
N'aka nke ọzọ ka Eluwa gosiri etu onye bị n'ọnụ ụlọ n'obodo mepere emepe ga-esi azụ nchị.
Ọ gwara BBC Igbo na ọ na-akpata ihe karịrị otu nde Naira site n'ire na ịkuziri ndị mmadụ etu esi azụ nchi
Kirie ya n'uju;










